Igbo Mass Readings for January 18 2025, Satọde n’ime Izuụka nke Mbụ N’Oge Adanyeghị n’Emume.

Nke a bụ Igbo Mass Readings for January 18 2025, Satọde n’ime Izuụka nke Mbụ N’Oge Adanyeghị n’Emume.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 4:12-16

Ihe Ọgụgụ Ewetara N’akwụkwọozi E Degaara Ndị Hibru

Okwu Chineke dị ndụ, dị ike, ọ dị nkọ karịa mmagha ihu abụọ. Ọ na amịba ruo na njikọ mkpụrụobi na mmụọ, nkwonkwo na umịọkpụkpụ. Ọ bụkwa ihe nwere ike inyocha echiche na izu niile nke obi.

Ọ dịghị ihe e kere eke zoro ezo n’ihu Chukwu, kama ihe niile gba ọtọ, gherekwa oghe n’anya ya. Ọ bụkwa ya ka anyị ga-aza ajụjụ banyere onwe anyị.

Ebe ọ bụ na anyị nwere nnukwu onyeisi nchụaja, onye nke gaferela n’eluigwe, Jesu Nwa nke Chukwu, ka anyị jidesienụ okwukwe anyị ike.

Onyeisi nchụaja anyị nwere abụghị nke na-enweghị obi ebere n’adịghị ike anyị, kama anyị nwere onyeisi nchụaja nke a nwarala n’ụzọ ọbụla otu e si anwa anyị ma o meghị njọ.

Ka anyị were ntụkwasịobi bịa nso n’ocheeze nke amara, iji nata ebere na iji chọta amara mgbe ọbụla anyị nọ na mkpa.

ABỤỌMA NA AZỊZA – Psalm. 19:8, 9, 10, 15

Azịza: Okwu ndị m gwara ụnụ bụ mmụọ bụrụkwa ndụ.

1. Iwu nke Onyenweanyị zuru oke,

Ọ na-enye mkpụrụobi ndụ ọhụrụ;

Atụmatụ Onyenweanyị kwesịrị ntụkwasịobi

Ọ na-enye ndị dị umeala amamihe.

Azịza: Okwu ndị m gwara ụnụ bụ mmụọ bụrụkwa ndụ.

2. Iwu nke Onyenweanyị kwụ ọtọ;

ọ na-enye obi añụrị;

Iwu nke Onyenweanyị pụtara ihe;

ọ bụ ihe e ji ahụ ụzọ.

Azịza: Okwu ndị m gwara ụnụ bụ mmụọ bụrụkwa ndụ.

3. Ịtụ egwu Onyenweanyị bụ ihe dị mma:

ọ na-adị ebeebe;

Ikpe nke Onyenweanyị bụ eziokwu;

Ha niile kwụkwa ọtọ.

Azịza: Okwu ndị m gwara ụnụ bụ mmụọ bụrụkwa ndụ.

4. Mee ka okwu niile si m n’ọnụ apụta oge niile,

na echiche obi m niile,

dị mma n’ihu gị, Onyenweanyị,

nkume m, na onye nzọpụta m.

Azịza: Okwu ndị m gwara ụnụ bụ mmụọ bụrụkwa ndụ.

MBEKU

Alleluia, Alleluia:

Kuziere m ụzọ gị O Dinwenụ, Dube m n’ụzọ kwụ ọtọ, n’ihi ndịiro gbara m gburugburu.

Alleluia.                    

OZIỌMA – 2:13-17

Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Mak dere.

Jesu laghachiri ọzọ n’akụkụ osimiri, igwe mmadụ ahụ niile wee gbaa ya okirirkiri, ọ malitere ịkụziri ha ihe. Ma ka ọ na-agafe, ọ hụrụ Levaị nwa Alfeus ka ọ nọ n’ụlọụtụ na-anakọ ego, ma ọ sịrị ya, “Sobe m”.

O bilie sobe ya. Ma ka Jesu nọ n’oche nri n’ụlọ Levaị, ọtụtụ ndị ọnaụtụ na ndị omenjọ soro Jesu na ndị na-eso ụzọ ya nọrọ ebe ahụ.

Mgbe ndị odeakwụkwọ nke ndị Farisii hụrụ na Jesu, ndị ọnaụtụ na ndị njọ na erikọ nri, ha jụrụ ndị na-eso ụzọ ya sị, “Gịnị mere ya na ndị ọnaụtụ na ndị omenjọ ji erikọ nri?”

Mgbe Jesu nụrụ ya ọ sịrị ha, “Mkpa dibịa adịghị akpa ndị ahụ dị, kama ndị ahụ na-adịghị. Abịaghị m ịkpọ ndị eziomume kama ndị omenjọ”.

Igbo Mass Readings for January 19 2025, Ụka nke Abụọ n’Oge Na-Adanyeghị N’Emume – Afọ nke Atọ.

Igbo Mass Readings for January 18 2025, Satọde n’ime Izuụka nke Mbụ N’Oge Adanyeghị n’Emume.