Igbo Mass Readings for January 17 2026, Satọde n’ime Izuụka nke Mbụ N’Oge Adanyeghị n’Emume.

Nke a bụ Igbo Mass Readings for January 17 2026, Satọde n’ime Izuụka nke Mbụ N’Oge Adanyeghị n’Emume.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 9:1-4, 17-19; 10:1

Ihe Ọgụgụ ewetara n’Akwụkwụ mbụ nke Samuel

E nwere otu nwoke onye Benjamin, aha ya bụ Kish, nwa Abiel, nwa Zero, nwa Bekorat, nwa Afịa, onye agbụrụ Benjamin. Nwoke ahụ bụkwa ọgaranya a maara aha ya. Nwoke ahụ nwekwara nwa nwoke, aha ya bụ Sọl. Ma Sọl bụ nwaokorobịa mara mma.

Ọ dịghị nwoke ọbụla n’Izrel mara mma ka ya. Ihe o jiri kara ndi Izrel niile ogologo bụ site n’ubu ya ruo n’isi. Otu mgbe, ụfọdụ n’ime ịnyịnyaibu Kish, bụ nna Sọl, kpafuru. Ya mere, ọ sịrị Sọl, “Kpọrọ otu n’ime ndị odibo m ka gị na ya jee chọọ ịnyịnyaibu m furu efu.” Ha gafere ugwu ala Ifrem, si ya garuo n’ala Shalisha, ma ha achọtaghị ha.

Ha chọọrọ ha ruo ala Shaalim; ma ha anọghị ebe ahụ. Ha garuru oke ala Benjamin, ma ha achọtaghị ha. Ozigbo Samuel hụrụ Sọl, Yahweh sịrị ya, “Lee nwoke ahụ m gwara gị maka ya!

Ọ bụ ya ga-achị ndị nke m. Sọl bịaruru Samuel nso n’etiti ọnụụzọ ama, jụọ ya sị, “Biko, olee ebe onye Ọhụụzọ bi?” Samuel zara Sọl sị, “Mụ onwe m bụ onye Ọhụụzọ ahụ.

Burunụ m ụzọ gaba ebe ofufe ndụ ahụ n’elu ugwu. Mụ na ụnụ ga-erikọ ihe taa. N’ụtụtụ echi, aga m agwa ụnụ ihe niile dị ụnụ n’uche, zilakwa ụnụ, Samuel wee were karama mmanụ oliv, wụkwasị ya n’isi Sọl, susuo ya ọnụ sị, “Yahweh eteela gị mmanụ ịbụ eze ndị nke ya, bụ Izrel.

Ị ga achị ndị nke ya, napụtakwa ha n’aka ndịiro ha niile, Nke a ga-abụrị ihe ama na Yahweh ahọpụtala gị ịbụ onye ndu ndị nke ya.

ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 21:2-3, 4-5, 6-7

Azịza: Osebụrụwa! Ike gị na-enye eze añụrị.

1. Osebụrụwa! Ike gị na-enye eze añurị.

Ọ na-enwe añụrị n’ihina I nyela ya mmeri

I nyela ya ihe obi ya na-achọ

Ị naghị ajụ ihe ọbụla ọ rịọrọ gị.

Azịza: Osebụrụwa! Ike gị na-enye eze añụrị.

2. N’ihina I jirila ngọzi pụrụ iche zute ya

Kpube ya okpueze e jiri ọlaedo na-enweghị ntụpọ mee;

I nyere ya ndụ mgbe ọ rịọrọ gị.

Nyekwa ya ogologo ndụ ebeebe ebeebe.

Azịza: Osebụrụwa! Ike gị na-enye eze añụrị.

3. Otito ya abawanyela site n’enyemaka nke nzọpụta gị

I jirila otito na ebube chọọ ya mma

N’ezie, Ị meela ka ọbụụrụ ya ngọzi dị ebighịebi,

Nyekwa ya ọñụ site n’ịnọ ya nso mgbe niile.

Azịza: Osebụrụwa! Ike gị na-enye eze añụrị.

MBEKU

Alleluia, Alleluia:

Kuziere m ụzọ gị O Dinwenụ, Dube m n’ụzọ kwụ ọtọ, n’ihi ndịiro gbara m gburugburu.

Alleluia.                    

OZIỌMA – 2:13-17

Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Mak dere.

Jesu laghachiri ọzọ n’akụkụ osimiri, igwe mmadụ ahụ niile wee gbaa ya okirirkiri, ọ malitere ịkụziri ha ihe. Ma ka ọ na-agafe, ọ hụrụ Levaị nwa Alfeus ka ọ nọ n’ụlọụtụ na-anakọ ego, ma ọ sịrị ya, “Sobe m”.

O bilie sobe ya. Ma ka Jesu nọ n’oche nri n’ụlọ Levaị, ọtụtụ ndị ọnaụtụ na ndị omenjọ soro Jesu na ndị na-eso ụzọ ya nọrọ ebe ahụ.

Mgbe ndị odeakwụkwọ nke ndị Farisii hụrụ na Jesu, ndị ọnaụtụ na ndị njọ na erikọ nri, ha jụrụ ndị na-eso ụzọ ya sị, “Gịnị mere ya na ndị ọnaụtụ na ndị omenjọ ji erikọ nri?”

Mgbe Jesu nụrụ ya ọ sịrị ha, “Mkpa dibịa adịghị akpa ndị ahụ dị, kama ndị ahụ na-adịghị. Abịaghị m ịkpọ ndị eziomume kama ndị omenjọ”.

Igbo Mass Readings for January 18 2026, Ụka nke Abụọ n’Oge Na-Adanyeghị N’Emume – Afọ nke Mbụ.

Igbo Mass Readings for January 17 2026, Satọde n’ime Izuụka nke Mbụ N’Oge Adanyeghị n’Emume.