Igbo Mass Readings for April 3 2025, Tọọzde Izuụka nke Anọ n’Oge Ncheta Ahụhụ Kristi
Nke a bụ Igbo Mass Readings maka April 3 2025, Tọọzde Izuụka nke Anọ n’Oge Ncheta Ahụhụ Kristi.
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 32:7-14
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Ọpụpụ
Yahweh wee sị Mosis, “Gbadaba n’ihi na ndị ahụ I si n’ala ljipt dupụta emerụọla onwe ha. Ha ejehiela ụzọ na-egbughị oge ọbụla wee hapụ ụzọ ahụ mụ tụziiri ha aka, ha akpụọlara onwe ha nwa ehi, na-akpọrọ ya isiala ma na-achụkwara ya aja na-asị, “Izrel leenụ chi ụnụ bụ nke siri n’ala ljipt kpọpụta ụnụ.”
Yahweh sịkwara Mosis, “Ahụla m ụmụ Izrel, marakwanụ na ha bụ ndị isiike. Ugbu a, hapụzie m ka iwe m dị ọkụ rechapụ ha; ma aga m eme ka gị onwe gị bụrụ nnukwu mba.”
Ma Mosis rịọrọ Yahweh Chineke sị, O Yahweh, gịnị mere iwe gị na-eji adị ọkụ n’ebe ndị nke gị I jiri ike nke aka gị dị egwu kpọpụta n’ala ljipt nọ? Maka gịnị ka ndị Ijipt ga-eji kwuo sị, ‘Ahaa, ọ bụ maka ihe ọjọọ o buuru ha n’obi ka o ji rapụta ha n’elu ugwu iji gbuo ha werekwa ọkụ rechapụ ha n’elu ụwa?
Biko ka iwe gị dị ọkụ dajụọ, ka Ị ghara ime ndị nke gị ihe ọjọọ nke a. Chetakwa ụmụodibo gị Abraham, Aịzik na Izrel bụ ndị I jiri onwe gị nụọrọ iyi sị, ‘Aga m amụba ụmụ-ụmụ ụnụ ka ha dịka kpakpando nke igwe ma nyekwa ha ala niile a m kwere na nkwa ka ọ bụrụ nke ha ebeebe.
Nke a mere ka Yahweh tụgharịa uche ya, chefuo ihe nke a ọ chọrọ ime ndị nke ya.
ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 106:19-20, 21-22, 23.
Azịza: Cheta m O Osebụrụwa! N’ihi ịhụnaanya i nwere n’ebe ndị nke gị nọ.
1. Ha kpụrụ nwa ehi na Horeb.
Ha kpọrọ isiala nye arụsị a pịrị apị,
si otu a were ebube na otito dịịrị Chineke,
nye onyinyo ehi na-ata ahịhịa.
Azịza: Cheta m O Osebụrụwa! N’ihi ịhụnaanya i nwere n’ebe ndị nke gị nọ.
2. Ha chefuru Chineke nke zọpụtara ha,
onye nke rụrụ ọrụ dị egwu n’ala ljipt.
Onye nke rụrụ ọrụ ịtụnaanya n’ala Ijipt,
na ihe na-atụga egwu n’osimiri uhie.
Azịza: Cheta m O Osebụrụwa! N’ihi ịhụnaanya i nwere n’ebe ndị nke gị nọ.
3. Ya mere o jiri chee echiche ikpochapụ ha,
Ọ gaara eme nke a, ma a sị na Mosis,
onye nke ọ họtara anọchighị n’etiti ha,
wee medaa iwe ya dị ọkụ.
Azịza: Cheta m O Osebụrụwa! N’ihi ịhụnaanya i nwere n’ebe ndị nke gị nọ.
MBEKU
R/ Otito na ebube dịrị Gị, O Dinwenụ, Jesu Kristi.
Mkpụrụ ahụ bụ okwu Chineke, Jesu bụ ọgha mkpụrụ, onye ọbụla bịakwutere m ga-adị ndụ ebighịebi.
R/ Otito na ebube dịrị Gị, O Dinwenụ, Jesu Kristi.
OZIỌMA – 5:31-47
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Oziọma dị asọ nke Jọn dere.
Jesu gwara ndị Juu sị: Ọ bụrụ na m na-agbara onwe m akaebe, ihe m na-ekwu abụghị eziokwu. Ọ dị onye ọzọ nke na-agbara m akaebe, amakwa m na akaebe ọ na-agba banyere m bụ eziokwu.
Ụnụ zigaara Jọn ndị ozi, o wee gbaara eziokwu ahụ akaebe. Ọ bụghị na akaebe ahụ, a na-agbara m sitere n’aka mmadụ, kama ana m agwa ụnụ ihe ndị a, ka e wee gbapụta ụnụ.
Jọn dịka mpanaka nke a mụnyere na-enwu, na-amụkekwa. Ụnụ chọkwara ịñụrị ọñụ n’ihè ya nwantakịrị oge. Ma akaebe nke m nwere karịrị nke Jọn gbaara m, n’ihina ọrụ niile m na-arụ bụ ọrụ Nna m nyere m ka m rụọ, bụ ihe na-agbara m akaebe, na-egosikwa na Nna m zitere m.
Nna n’onwe ya, onye nke zitere m na-agbakwara m akaebe. Ụnụ anụbeghị olu ya, nke ụnụ na-ahụ oyiyi ya. Ụnụ anaghịkwa edobe okwu ya n’ime ụnụ, n’ihi na ụnụ ekwenyeghị n’onye ahụ nke o zitere.
Ụnụ na-enyocha ihe e dere n’Akwụkwọ Nsọ n’ihina ụnụ na-eche na ụnụ ga-esite na ha nweta ndụ ebeebe, ma ọ bụ ha na-agbara m akaebe. N’agbanyeghị nke a, ụnụ achọghị ịbịakwute m ka ụnụ wee nwee ndụ.
Anaghị m anata otito nke mmadụ. A maara m na ụnụ enweghị ịhụnaanya nke Chineke n’ime ụnụ. A bịara m n’aha nke Nna m, ụnụ anabataghị m, ma ọ bụrụ na onye ọzọ a bịa n’aha nke aka ya, ụnụ ga-anabata ya.
Olee otu ụnụ ga-esi kwere, ụnụ ndị ọ na-atọ ụtọ ịnara otito nke mmadụ ibe ụnụ, ma ụnụ anaghị agba mbọ ịnata otito nke si sọọsọ n’aka Chineke a bịa? Ụnụ echela na m ga-ebo ụnụ ebubo n’ihu Nna m.
Ọ bụ Mosis, onye ụnụ tụkwasara obi, ga-ebo ụnụ ebubo. Ọ bụrụ na ụnụ kwenyere na Mosis, ụnụ gara ekwenye na m, n’ihina Mosis dere banyere m n’Akwụkwọ Nsọ. Ọ bụrụ na ụnụ ekwenyeghị n’ihe ndị o dere, olee otu ụnụ ga-esi kwenye n’okwu m?”
Igbo Mass Readings for April 4 2025, Fraịde Izuụka nke Anọ n’Oge Ncheta Ahụhụ Kristi.
Igbo Mass Readings for April 3 2025, Tọọzde Izuụka nke Anọ n’Oge Ncheta Ahụhụ Kristi.