Igbo Mass Readings for March 27 2025, Tọọzde Izuụka nke Atọ n’Oge Ncheta Ahụhụ Kristi
Nke a bụ Igbo Mass Readings maka March 27 2025, Tọọzde Izuụka nke Atọ n’Oge Ncheta Ahụhụ Kristi.
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 7:23-28
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ onye amụma Jeremaya
Ma iwu Chineke nyere ha bụ nke a: Ruberenụ m isi, ka m wee bụrụ Chineke ụnụ, ụnụ ga-abụkwa ndị nke m, ma dobekwanụ iwu niile m nyere ụnụ ka ihe wee dịrị ụnụ mma.
Ma ha erubeghị isi ma ọ bụ gee m ntị, kama ha sooro izuzu nke ajọ obi ha na-agaghachi azụ karịa ịga n’ihu. Bido n’ụbọchị nna ụnụ si n’ljipt pụta ruo taa, ugboro-ugboro ka m zigaara ha ndị amụma, ma n’agbanyeghị ya ha egeghị m ntị kama ha kpọrọ ekwu nkụ, mee njọ karịa nke nna ha.
“Ị ga-agwa ha okwu ndị a, ma ha agaghị ege gị ntị, ị ga-akpọkwa oku ma ha agaghị aza gị. Ị ga-agwa ha sị ‘Nke a bụ mba ahụ egeghị Yahweh Chineke ha ntị; ndị jụrụ ịnabata ọzụzụ. Eziokwu ha adịghịzikwa. Naanị asị bụ ihe juru ha ọnụ.
ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 95: 1-2, 6-7, 8-9.
Azịza: Taa, ọ bụrụ na ụnụ anụ olu ya, ụnụ akpọchila obi ụnụ.
1. Bịanụ ka anyị kweere Onyenweanyị ukwe ọñụ,
ka anyị tisie mkpu ike tijere nkume nke nzọpụta anyị,
ka anyị bịa n’ihu ya nye ya ekele,
were egwu na ukwe tobe ya.
Azịza: Taa, ọ bụrụ na ụnụ anụ olu ya, ụnụ akpọchila obi ụnụ.
2. Bịanụ, ka anyị fee Onyenweanyị kpọọrọ ya isiala,
ka anyị sekpuo n’ihu Onyenweanyị onye kere anyị.
N’ihi na ọ bụ Chineke anyị,
anyịnwa bụkwa ndị nke ya, igwe atụrụ ọ na-azụ.
Azịza: Taa, ọ bụrụ na ụnụ anụ olu ya, ụnụ akpọchila obi ụnụ.
3. Taa, ọ bụrụ na ụnụ anụ olu ya,
ụnụ akpọchila obi ụnụ dịka ụnụ mere na Merịba
na n’ụbọchị ahụ na Masa n’ime ọzara.
Mgbe nnanna ụnụ ha nwalere m,
mgbe ha nwalere m, na-agbanyeghị na ha hụrụ ihe m merela ha.
Azịza: Taa, ọ bụrụ na ụnụ anụ olu ya, ụnụ akpọchila obi ụnụ.
MBEKU – Ezikel 33:11.
R/ Otito na ebube dịrị Gị, O Dinwenụ, Jesu Kristi.
Anaghị m enwe añụrị n’ọnwụ onye ajọ omume, kama ka o si na njọ ya pụta ma dị ndụ.
R/ Otito na ebube dịrị Gị, O Dinwenụ, Jesu Kristi.
OZIỌMA – 11:14-23
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Oziọma dị asọ nke Luk dere.
Ugbu a Jesu na-achụpụ otu ajọ mmụọ nke dara ogbi; mgbe mmụọ ọjọọ ahụ hapụrụ, nwoke ogbi ahụ kwuru okwu, nke a tụrụ ndị mmadụ n’anya. Ma ụfọdụ n’ime ha kwuru sị, “Ọ na-achụpụ ndị mmụọ ọjọọ site n’ike Belzebul, onyeisi ndị mmụọ ọjọọ,” ma ndị ọzọ, iji nwalee ya, chọrọ n’aka ya ihe ama nke si n’igwe.
Ebe ọ bụ na Ọ ma ihe ha na-eche, Ọ sịrị ha, “Alaeze ọbụla nke kewaranụ megide onwe ya ga-adakpọ, ụlọ ọbụla nke dagidere ibe ya na-adakpọ. Ọ bụrụ na Ekwensu ekewakwaa megide onwe ya, kedụ ka alaeze ya ga-esi kwudo?
Ụnụ na-asị na-ana m achụpụ ndị mmụọ ọjọọ site n’ike Belzebul. Ọ bụrụ na m na-achụpụ ndị mmụọ ọjọọ site n’ike Belzebul, site n’ike onye ka ụmụ ụnụ na-achụpụ ha?
Ya mere, ha ga-abụ ndịikpe ụnụ. Ma, ọ bụrụ na ọ bụ site na mkpịsị aka nke Chineke ka m na-achụpụ ndị mmụọ ọjọọ, matanụ na alaeze Chineke abịakwasịla ụnụ.
Mgbe dike ji ngwaagha na-eche óbi ya, ọ dịghị mfe izute ihe o ji biri. Ma mgbe onye ka ya ike bịara megide ya, wee merie ya, ọ na-anara ya ihe agha ya niile, bụ ihe ntụkwasịobi ya, kesaara ndị otu ya ihe ọ kwatara n’ụlọ dike ahụ.
Onye na-anọnyereghị m, na-emegide m; onye ọbụla na-adịghị eso m ekpokọta ekpokọta, na-ekposa ekposa.”
Igbo Mass readings for March 28 2025, Fraịde Izuụka nke Atọ n’Oge Ncheta Ahụhụ Kristi
Igbo Mass Readings for March 27 2025, Tọọzde Izuụka nke Atọ n’Oge Ncheta Ahụhụ Kristi.