Igbo Mass Readings for May 1 2025, Tọọzde Izuụka nke Abụọ n’oge Mbilite n’Ọnwụ Kristi
Nke a bụ Igbo Mass Readings for May 1 2025, Tọọzde Izuụka nke Abụọ n’oge Mbilite n’Ọnwụ Kristi.
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 5:27-33
Ihe Ọgụgụ ewetara n’Ọrụ Ndịozi
Ọchịagha nke ụlọnsọ Chineke na ndịagha ya kpọtara ndịozi ahụ kwụba ha n’etiti ọgbakọ ikpe nke Sanhedrịn. Onyeisi nchụaja jụrụ ha ajụjụ sị, “Ọ kwa anyị dọsiri ụnụ aka na ntị ike ka ụnụ ghara ikuziri ndị mmadụ ihe n’aha a, mana ụnụ agbasaala ozi ụnụ n’obodo Jerusalem niile na- achọ ibogide anyị ọnwụ nwoke a.
Pita na ndịozi ndị ọzọ zaghachiri sị, “Anyị ga-egerịrị Chineke ntị karịa mmadụ. Chineke nke nnanna anyị ha mere ka Jesu si n’ọnwụ bilie, bụ onye ụnụ kpọgburu n’elu osisi.
Chineke buliri ya elu nye ya ọnọdụ n’aka nri ya dịka onye ndu na onye nzọpụta, iji wetara ụmụ Izrel nchegharị na mgbaghara nke njọ. Anyị onwe anyị bụkwa ndị akaebe ihe ndị a, anyị na Mmụọ Nsọ nke Chukwu nyere ndị niile na-erubere ya isi. Mgbe ha nụrụ nke a, Ọ gbawara ha obi ha wee chọọ igbu ndịozi ahụ.
ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 34: 2, 9, 17- 18.19-20.
Azịza: Onyenweanyị na-anụ mkpu akwa nwogbenye.
1. Aga m eto Onyenweanyị oge niile,
Otito ya ga-adị n’egbugbere ọnụ m mgbe ọbụla.
Detụ ire ka ị hụ ka Onyenweanyị si dị mma!
Añụrị na-adịrị onye gbabara n’Onyenweanyị.
Azịza: Onyenweanyị na-anụ mkpu akwa nwogbenye.
2. Mana Onyenweanyị na-agbarụ ihu n’ebe ndị ajọ omume nọ,
Ọ na-eme ka a ghara ichetakwa ha n’ụwa.
Ndị eziomume kpọkuru Onyenweanyị, O za ha,
wee zọpụta ha na nsogbu ha niile.
Azịza: Onyenweanyị na-anụ mkpu akwa nwogbenye.
3. Onyenweanyị na-anọ ndị obi loghara elogha nso,
na-enyere ndị dara mba na mmụọ aka.
Ọ bụ eziokwu na nsogbu onye eziomume karịrị akarị,
mana Onyenweanyị na-esi na ha niile zọpụta ya.
Azịza: Onyenweanyị na-anụ mkpu akwa nwogbenye.
MBEKU
ALLELUIA ALLELUIA:
Anyị maara na Kristi ebilitela n’ọnwụ, eze nke mmeri bịa nọnyere anyị.
ALLELUIA.
OZIỌMA – 3:31-36.
Ihe Ọgụgụ ewetara n’Oziọma dị asọ nke Jọn dere.
Jesu gwara Nịkọdemus sị: Onye si n’elu bịa kacha ihe niile elu, ma onye si n’ụwa pụta bụ mmadụ nke ụwa, okwu ya bụ naanị maka ihe nke ụwa. Onye si n’eluigwe bịa kacha ihe niile elu.
Ọ na-agba akaebe banyere ihe ọ hụrụ na ihe ọ nụrụ ma ọ dịghị onye na-anara ya. Onye nabatara akaebe ya ji nke a mere akara na Chineke bụ eziokwu. Onye ahụ Chineke zitere na-ekwu okwu nke Chineke n’ihi na Chineke na-enyezu Mmụọ enyezu.
Chineke hụrụ nwa ya n’anya, o ji were ihe niile nye ya n’aka. Onye kwere na nwa ahụ nwere ndụ ebeebe, ma onye na-ekweghị na ya agaghị ahụ ndụ anya, kama ikpe ọmụma nke Chineke ga-adịrị ya.
Igbo Mass Readings for May 2 2025, Fraịde Izuụka nke Abụọ n’oge Mbilite n’Ọnwụ Kristi.
Igbo Mass Readings for May 1 2025, Tọọzde Izuụka nke Abụọ n’oge Mbilite n’Ọnwụ Kristi