Igbo Mass Readings for February 6 2025, Tọọzde n’ime Izuụka nke Anọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.

Nke a bụ Igbo Mass Readings for February 6 2025, Tọọzde n’ime Izuụka nke Anọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 12:18-19, 21-24

Ihe Ọgụgụ Ewetara N’akwụkwọozi E Degaara Ndị Hibru

Ụnụ abịabeghị n’ihe nke a nwere ike imetụ aka dịka ọkụ na-enwu enwu, ọchịchịrị, itiri na oke ifufe; ụda opiike na olu nke mere ka ndị nụrụ olu ya rịọ ka a hapụ ịgwa ha okwu ọzọ. N’ezie ihe ha hụrụ dị oke egwu, nke mere Mosis ji tie sị, “Egwu na-atụ m, ahụ na-ama m jijiji.

Ụnụ abịaruola n’ugwu Zayọn obodo nke Chineke dị ndụ, Jerusalem nke eluigwe, ebe ndị mmụọọma e nweghị ike ịgụta ọnụ gbakọrọ n’oriri.

Ụnụ bịara n’ọgbakọ nke ndị mbụ, ndị e derela aha ha n’eluigwe na n’ebe onyeikpe nke bụ Chineke nke ihe niile. Ụnụ bịakwutere mmụọ nke ndị eziomume nke Chineke mere ka ha zuo oke.

Ụnụ bịakwutere Jesu onye bụ onye ogbugbo nke ọgbụgbandụ ọhụrụ ahụ, ya na ọbara nke e fesara ụnụ nke na-ewetara mmadụ iheọma dị icheiche karịa ọbara Ebel.

ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps: 48:2-3, 3-4, 9, 10-11

Azịza: Anyị na-echeta ịhụnanya Chineke n’ụlọ nsọ ya.

1. Onyenweanyị dị ukwuu bịa kwesịkwa inye otito

n’obodo Chineke anyị.

n’ugwu ya dị nsọ, Zayọn, ugwu nke Chineke dị elu, maa mma,

obodo nke nnukwu eze, bụ añụrị nke ụwa niile.

Azịza: Anyị na-echeta ịhụnanya Chineke n’ụlọ nsọ ya.

2. Ugwu Zayọn isi añụrị nke ụwa niile

ebe obibi nke nnukwu eze ahụ,

Chineke n’onwe ya egosila

na ya bụ ebe mgbaba n’etiti obodo ahụ.

Azịza: Anyị na-echeta ịhụnanya Chineke n’ụlọ nsọ ya.

3. Anyị ejirirla anya anyị hụ ihe anyị nụrụ

n’ime obodo nke Chineke anyị

na obodo nke Osebụrụwa nke igwe ndịagha,

bụ nke Chineke mere ka ọ dị ebeebe.

Azịza: Anyị na-echeta ịhụnanya Chineke n’ụlọ nsọ ya.

4. Chineke, anyị nọ n’ime ụlọnsọ gị

na-achịgharị ịhụnaanya gị n’obi anyị

Ụwa niile na-ekwupụta aha gị na otito gị, O Chineke,

aka nri gị jupụtara n’ikpe nkwụmọtọ.

Azịza: Anyị na-echeta ịhụnanya Chineke n’ụlọ nsọ ya.

MBEKU

Alleluia, Alleluia:

Atụrụ m na-anụ olu m, amakwaara m ha, ha na-esokwa m.

Alleluịa.

OZIỌMA – 6:7-13

Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Mak dere.

Jesu kpọrọ ndị ụmụazụ iri na abụọ ahụ ka ha bịakwute ya. Ọ malitekwara izipụ ha abụọ abụọ nyekwa ha ike ịchụpụ ajọ mmụọ. O nyere ha iwu ka ha ghara iji ihe ọbụla maka njem ha belụsọ mkpọ. Ha agaghị ejikwa achịcha mọbụ akpa, mọbụ ego n’ihe okike ha.

Ha ga-eyi akpụkpụụkwụ, kama ha eyikwala uwe abụọ. Ọ gwakwara ha, sị, “Ụlọ ọbụla ụnụ banyere n’ime ya nọdụnụ ebe ahụ ruo mgbe ụnụ ga-ahapụ obodo ahụ.

Ọ bụrụ na ndị bi n’obodo ọbụla anabataghị ụnụ, ọ bụrụkwa na ha ajụ ịña ntị n’okwu ụnụ, mgbe ụnụ na-apụ n’ebe ahụ, tichapụnụ aja dị n’ọbụụkwụ ụnụ, ka ọ bụrụ ihe ama megide ha”.

Ha wee pụọ na ekwusa ka mmadụ niile chegharịa. Ha chụpụrụ ọtụtụ ajọ mmụọ ma tee ọtụtụ ndị ọrịa mmanụ Oliv, ahụ wee dị ha mma.

Igbo Mass Readings for February 7 2025, Fraịde n’ime Izuụka nke Anọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.

Igbo Mass Readings for February 6 2025, Tọọzde n’ime Izuụka nke Anọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.