Igbo Mass Readings for February 5 2026, Tọọzde n’ime Izuụka nke Anọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.

Nke a bụ Igbo Mass Readings for February 5 2026, Tọọzde n’ime Izuụka nke Anọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 2:1-4, 10-12

Ihe Ọgụgụ ewetara n’Akwụkwọ Ndịeze nke mbụ

Mgbe oge ọnwụ Devid rubere, ọ kpọrọ nwa ya bụ Solomọn nye ya ndụmọdụ ikpeazụ sị, “Oge ọnwụ m erubela.

Ya bụ kwụsie ike ma gosikwa na ị bụ nwoke, na-eme ihe Yahweh Chineke gị chọrọ ka i mee, na-aga n’ụzọ ya, na-edobekwa iwu ya niile, na ntọnala ya, na ntụziaka ya dịka e dere ya n’iwu Mosis, ka ihe na-agara gị n’ihu n’ihe ọbụla I na-eme.

Chineke ga-emejupụtakwa nkwa ahụ o kwere m sị, Ọ bụrụ na ụmụ gị ga-akpachapụ anya, were obi na mmụọ ha niile na-aga n’ụzọ m, a gaghị achọ ụmụ gị achọ n’oche eze nke Izrel.

E mechaa Devid anwụọ, e lie ya n’obodo Devid. Devid chịrị ụmụ Izrel iri afọ anọ; afọ asaa na Hebrọn, afọ iri atọ na atọ na Jerusalem. Solomọn nọchiri nna ya dịka eze. Alaeze ya kwụdosiri ike nke ukwuu.

ABỤỌMA NA AZỊZA – 1 Chr 29:10, 11, 11-12, 12

Azịza: Onyenweanyị, a na-ebuli gị elu karịchaa ihe niile.

1. Ngọzi dịrị gị. Yahweh

Chineke nke Izrel, Nna anyị

ebeebe ebeebe.

Azịza: Onyenweanyị, a na-ebuli gị elu karịchaa ihe niile.

2. Ịdị ukwu niile na ike

na otito na mmeri na ebube

bụ nke Gị, O Yahweh.

Azịza: Onyenweanyị, a na-ebuli gị elu karịchaa ihe niile.

3. Alaeze bụkwa nke gị. O Yahweh,

ana-ebulikwa gị elu karịchaa ihe niile dịka onyeisi.

Ụba niile na ugwu niile si n’aka gị bịa.

Azịza: Onyenweanyị, a na-ebuli gị elu karịchaa ihe niile.

4. Ọ bụkwa gị na-achị ihe niile,

ike na ebube dị gị n’aka,

ibuli mmadụ elu nakwa inye onye ọbụla ike

dịkwa gị n’aka.

Azịza: Onyenweanyị, a na-ebuli gị elu karịchaa ihe niile.

MBEKU

Alleluia, Alleluia:

Atụrụ m na-anụ olu m, amakwaara m ha, ha na-esokwa m.

Alleluịa.

OZIỌMA – 6:7-13

Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Mak dere.

Jesu kpọrọ ndị ụmụazụ iri na abụọ ahụ ka ha bịakwute ya. Ọ malitekwara izipụ ha abụọ abụọ nyekwa ha ike ịchụpụ ajọ mmụọ.

O nyere ha iwu ka ha ghara iji ihe ọbụla maka njem ha belụsọ mkpọ. Ha agaghị ejikwa achịcha mọbụ akpa, mọbụ ego n’ihe okike ha. Ha ga-eyi akpụkpụụkwụ, kama ha eyikwala uwe abụọ.

Ọ gwakwara ha, sị, “Ụlọ ọbụla ụnụ banyere n’ime ya nọdụnụ ebe ahụ ruo mgbe ụnụ ga-ahapụ obodo ahụ.

Ọ bụrụ na ndị bi n’obodo ọbụla anabataghị ụnụ, ọ bụrụkwa na ha ajụ ịña ntị n’okwu ụnụ, mgbe ụnụ na-apụ n’ebe ahụ, tichapụnụ aja dị n’ọbụụkwụ ụnụ, ka ọ bụrụ ihe ama megide ha”.

Ha wee pụọ na ekwusa ka mmadụ niile chegharịa. Ha chụpụrụ ọtụtụ ajọ mmụọ ma tee ọtụtụ ndị ọrịa mmanụ Oliv, ahụ wee dị ha mma.

Igbo Mass Readings for February 6 2026, Fraịde n’ime Izuụka nke Anọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.

Igbo Mass Readings for February 5 2026, Tọọzde n’ime Izuụka nke Anọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.