Igbo Mass Readings for June 5 2025, Tọọzde Izuụka nke Asaa n’oge Mbilite n’Ọnwụ Kristi
Nke a bụ Igbo Mass Readings for June 5 2025, Tọọzde Izuụka nke Asaa n’oge Mbilite n’Ọnwụ Kristi.
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 22:30-23:6-11
Ihe Ọgụgụ ewetara n’Ọrụ Ndịozi
Mgbe chi bọrọ, onyeisi ọchịagha chọsiri ike ka ọ mata isi okwu, na ihe mere ndị Juu ji bo Pọl ebubo. Ọ gwara ndịisi nchụaja na ndị nzukọ Sanhedrịn niile ka ha zukọọ.
Ọ bịa tọpụ Pọl agbụ, kpọta ya kwụba ya n’ihu ha. Mgbe Pọl chọpụtara na otu ụzọ n’ime nzukọ ahụ bụ ndị otu Sadusii, ndị ọzọ abụrụkwa ndị otu Farisii, o tiri mkpu n’ime ụlọ nzukọ ahụ, sị: “Ụmụnne m! Abụ m onye Farisii, na nwa ndị Farisii.
A na-ekpe m ikpe n’ebe a banyere olile anya anyị nwere n’ebe mbilite n’ọnwụ dị.” Mgbe o kwuchara okwu a, esemokwu dapụtara n’etiti ndị Farisii na ndị Sadusii. Ọgbakọ ahụ wee kewaa.
N’ihi na ndị Sadusii na-akuzi na mbilite n’ọnwụ, ma ọ bụ mmụọọma, ma ọ bụ mmụọ adịghị. Ma ndị Farisii kwekwara, na-akuzi na ihe ndị a dị. Oke mkpọtụ bịara dapụta, ụfọdụ ndị nkuzi iwu, ndị nọ n’otu ndị Farisii, guzooro ọtọ, kwado Pọl sị: “O nweghị ihe ọjọọ anyị hụrụ nwoke a mere!
Kedụkwanụ ma ọ bụrụ na ọ bụ mmụọ, ma ọ bụ mmụọọma gwara ya okwu?” Esemokwu a bịara karịa, nke mere onyeisi ọchịagha bịara tụọ egwu na ha ga-adọkasị Pọl.
Ọ gwara ndị agha ya, ka ha banye n’igwe mmadụ ahụ, were ike napụta Pọl n’aka ha ziga ya n’ụlọ ndị agha. N’abalị sonụ, Dinwenụ kwụụrụ n’akụkụ Pọl, sị ya: “Obi sie gị ike! N’ihi na otu a i si kwupụta m na Jerusalem, ka ị ga-esi agbara m ama na Rom.
ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 16: 1-2, 5, 7-8, 10, 11.
Azịza: Chekwaba m, Chineke, n’ihi na Ị bụ ebe mgbaba m.
1. Chekwaba m, Chineke, n’ihi na Ị bụ ebe mgbaba m.
Agwara m Onyenweanyị sị,” Gịnwa bụ Chineke m,
Ihe ọma niile m nwere si n’aka gị bịa.”
Azịza: Chekwaba m, Chineke, n’ihi na Ị bụ ebe mgbaba m.
2. Ana m eto Onyenweanyị bụ onye na-agbaziri m,
n’ime abalị, mmụọ m na-enye m ndụmọdụ;
Ana m eche echiche banyere Onyenweanyị mgbe niile,
n’ebe Ọ nọ n’aka nri m, egwu agaghị atụ m.
Azịza: Chekwaba m, Chineke, n’ihi na Ị bụ ebe mgbaba m.
3. N’ihi nke a mkpụrụobi m nọ n’ọñụ,
mmụọ m na-enwe añụrị ahụ m na-ezukwa ike
n’enweghị nsogbu ọbụla.
N’ihina Ị gaghị agbahapụ mkpụrụobi m n’ala mmụọ,
ma ọ bụ kwe ka onye ị hụrụ n’anya ree ure.
Azịza: Chekwaba m, Chineke, n’ihi na Ị bụ ebe mgbaba m.
4. Ị ga-akuziri m ụzọ nke ndụ,
ị ga-enye m añụrị na-enweghị ube n’ihu gị,
n’aka nri gị, aga m enwe añụrị dị ebeebe.
Azịza: Chekwaba m, Chineke, n’ihi na Ị bụ ebe mgbaba m.
MBEKU
ALLELUIA ALLELUIA:
Jesu kwuru sị: “Nna m ga-ezitere ụnụ mmụọ Nsọ nke ga-anọnyere ụnụ ebeebe ebeebe.
ALLELUIA.
OZIỌMA – 17: 20-26
Ihe Ọgụgụ ewetara n’Oziọma dị asọ nke Jọn dere.
Jesu leliri anya n’eluigwe were kpee ekpere sị: “Ọ bụghị naanị ha ka m na-ekpere ekpere. Kama ana m ekpekwa ekpere banyere ndị sitere n’okwu ha wee kwere na m.
Ana m ekpekwa ekpere ka ha bụrụ otu. Nna, mee ka ha dịrị n’ime anyị, dịka gị onwe gị si dị n’ime m, mụ onwe m adị n’ime gị. Mee ka ha bụrụ otu, ka ụwa niile wee kwere na gị zitere m.
Otito nke i nyere m ka m nyere ha, ka ha wee bụrụ otu dịka anyị onwe anyị si bụrụ otu. Ka m biri n’ime ha, gị onwe gị ebiri n’ime m; ka ha bụrụ otu n’ụzọ zuru oke, ka ụwa wee kwere na ọ bụ gị zitere m, hụkwa ha n’anya dịka i si hụ m n’anya.
Nna achọrọ m ka ndị niile i nyere m soro m nọrọ n’ebe m nọ, ka ha nwee ike ịhụ otito nke i nyere m n’ịhụnaanya gị tupu ekee ụwa. Nna nke eziomume, Ụwa amatabeghị gị, ma ama m gị.
Ndị a makwa na ọ bụ gị zitere m. E mere m ka ha mata aha gị, aga m na-emekwa ya, ka ịhụnaanya nke i nwere n’ebe m nọ dịrị n’ime ha, mụ onwe m ebirikwa n’ime ha.
Igbo Mass Readings for June 6 2025, Fraịde Izuụka nke Asaa n’oge Mbilite n’Ọnwụ Kristi.
Igbo Mass Readings for June 5 2025, Tọọzde Izuụka nke Asaa n’oge Mbilite n’Ọnwụ Kristi.