Igbo Mass Readings for February 24 2028, Tọọzde Izuụka nke Asaa N’Oge Adanyeghị n’Emume.

Nke a bụ Igbo Mass Readings for February 24 2028, Tọọzde Izuụka nke Asaa N’Oge Adanyeghị n’Emume.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 5:1-6

Ihe Ọgụgụ ewetara n’Akwụkwọozi Jemis

Ugbu a geenụ ntị, ụnụ ndị ọgaranya! Kwaanụ akwa, tikwaanụ mkpu n’ihi ihe nhuju anya dị icheiche nke ga-abịakwasa ụnụ! Akụ ụnụ alaala n’iyi uwe niile ụnụ nwere aghọọkwala ihe akịka ripịarala.

Ọlaọcha na ọlaedo ụnụ agbaala nchara. Nchara ha gbara ga-abụ ihe akaebe megide ụnụ. Ọ ga-eripịakwa ahụ ụnụ dịka ọkụ. Ụnụ kpadoro akụ ụwa nke a maka ụbọchị ikpe azụ.

Lee, ụnụ akwụbeghị ndị ọrụ bịara ọrụ n’ubi ụnụ ụgwọ ọrụ ha. Ụnụ jidere ego ha na mmegbu. Mmegbu ụnụ na-emegbu ha na-eti mkpu. Iti mkpu akwa nke ndị na-ewetara ụnụ ihe n’ubi eruola Chineke nke igwe ndịagha ntị.

Ụnụ na-ebi ndụ mmefu, nke oke oriri na oke ọñụñụ na ihe ụtọ nke anụ ahụ n’elu ụwa. Ụnụ emeela ka obi na ahụ ụnụ maa abụba maka ụbọchị mgburi. Ụnụ mara ndị mmadụ ikpe ụgha, gbuo onye na-enweghị ihe o mere ọ bụ ezie na o gbochighị ụnụ.

ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 49: 13-14,14-15,16-17,18-19

Azịza: Ngọzi na-adịrị ndị dara ogbenye n’ime mmụọ n’ihina alaeze eluigwe bụ nke ha

1. Nke a bụ ụgwọ ndị tụkwasaraobi n’ihe ha bụ,

ndị na-enwe afọ ojuju n’akụnụụba ha.

Dika atụrụ e libere n’ala mmụọ

ọnwụ ga-abụkwa onyendụ ha,

mgbe ahụ ndị eziomume ga na-achị ha ọchịchị.

Azịza: Ngọzi na-adịrị ndị dara ogbenye n’ime mmụọ n’ihina alaeze eluigwe bụ nke ha

2. N’ụtụtụ a gaghị ahụkwa ha anya ọzọ,

mgbe ahụ ala mmụọ ga-abụ ebe obibi ha.

Chineke ga-esi n’ala mmụọ zọpụta ndụ m n’ọnụ ọnwụ,

ọ ga-anabata m.

Azịza: Ngọzi na-adịrị ndị dara ogbenye n’ime mmụọ n’ihina alaeze eluigwe bụ nke ha

3. Ya bụ egwu atụla gị mgbe akụnụụba mmadụ na-abawanye,

mgbe otito nke ụlọ ya na-abawanye.

N’ihina oge ọ nwụrụ ọ gaghị eji ihe ọbụla laa n’ala mmụọ,

akụnụụba ya agaghị esokwa ya wee laa.

Azịza: Ngọzi na-adịrị ndị dara ogbenye n’ime mmụọ n’ihina alaeze eluigwe bụ nke ha

4. mere ka mkpụrụobi ya nwee nnukwu añụrị oge ọ dị ndụ

o wee kwuo sị, Leta onwe gị anya ka ndị mmadụ wee too gị.

N’ikpeazụ ọ ga-anwụ soro ndị nnanna ya,

ha bụ ndị na-agaghị ahụkwa ihe ọzọ.

Azịza: Ngọzi na-adịrị ndị dara ogbenye n’ime mmụọ n’ihina alaeze eluigwe bụ nke ha

MBEKU – Ps. 27:11

Alleluia, Alleluia:                                    

Kuziere m ụzọ gị, O Dinwenụ, Dube m n’ụzọ kwụ ọtọ.

Alleluia.

OZIỌMA – 9:41-50

Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Mak dere

Jesu gwara ndị na-eso ụzọ ya sị, n’ezie agwa m ụnụ onye ọbụla nke ga ekunye ụnụ otu iko mmiri ka ụnụ ñụọ n’ihina ụnụ bụ ndị nke Kristi, aghaghị ịnata ụgwọ ọrụ ya.

“Onye ọbụla ga-eme ka otu n’ime ụmụntakịrị ndị a kwere na m daba na njọ, ọ ga-akara onye ahụ mma ma a sị na a nyabara ya nnukwu nkume e ji egwe ọka n’olu, tụba ya n’ime osimiri.

Ọ bụrụ na aka gị abụọ ga-eme ka ị dahie ụzọ bepụ ya; ọ ga akara gị mma ịbụrụ ọrụsị banye na ndụ, karịa inwe aka gị abụọ wee baa n’ọkụmmụọ, n’ọkụ na-adịghị anyụanyụ.

Ọzọ, ọ bụrụ na ụkwụ gị ga eme ka ị dahie, gbupụ ya; ọ ga-akara gị mma ịba na ndụ na ngwọrọ, karịa inwe ụkwụ abụọ a tụba gị n’ọkụmmụọ.

Ọ bụrụkwa na anya gị ga-eme ka ị dahie, ghụpụ ya; ọ ga-akara gị mma inwe otu anya ma banye n’Alaeze Chineke, karịa inwe anya abụọ a tụba gị n’ọkụmmụọ, ebe ikpuru na-ata ha na-adịghị anwụ anwụ.

A dịghị emenyụkwa ọkụ ya emenyụ. N’ihina a ga-eji ọkụ ñụchaa onye ọbụla. Nnu bụ ihe dị mma, ma ọ bụrụ na nnu atụfuo ụtọ ya, kedụ ka a ga-esi mee ka ọ dị ụtọ ọzọ? Nweenụ nnu n’ime onwe ụnụ, ụnụ na ibe ụnụ dịkwa n’udo.”

Igbo Mass Readings for February 25 2028, Fraịde Izuụka nke Asaa N’Oge Adanyeghị n’Emume.

Igbo Mass Readings for February 24 2028, Tọọzde Izuụka nke Asaa N’Oge Adanyeghị n’Emume.