Igbo Mass Readings for May 8 2025, Tọọzde Izuụka nke Atọ n’oge Mbilite n’Ọnwụ Kristi

Nke a bụ Igbo Mass Readings for May 8 2025, Tọọzde Izuụka nke Atọ n’oge Mbilite n’Ọnwụ Kristi.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 8:26-40

Ihe Ọgụgụ ewetara n’Ọrụ Ndịozi

Mmụọọma nke Onyenweanyị gwara Filip okwu, sị, “Bilie, gaa ụzọ ndịda ruo ụzọ nke si na Jerusalem gbadaa ruo na Gaza” Filip biliri gaba. Mana mgbe ahụ, otu nwoke, onye Etiopia, bụ ọnọzi, onye na-agbara Kandeki Ezenwaanyị Etiopia odibo, na-echekwara ya akụ na ụba ya niile bịara Jerusalem ikpere Chineke.

Ọ nọ n’ụgbọ ịnyịnya ya na-alaghachi Etiopia. Ka ọ na-aga, ọ na-agụ akwụkwọ Aịzaya onye amụma. Mmụọ Nsọ gwara Filip, sị, “Garuo ụgbọ ịnyịnya ahụ nso, ma sonyere ya.”

Filip garuru ya nso, nụ ka ọnọzi ahụ na-agụ Akwụkwọ Aịzaya onye amụma. Ọ jụrụ ya, sị, “Ị na-aghọta ihe Ị na-agụ?” Ya azaa ya sị, “kedụ ka m ga-esi ghọta, ma ọ bụrụ na onweghị onye na-akọwara m?”

Ọnọzi ahụ rịọrọ Filip ka ọ rịgota n’ụgbọ ịnyịnya ya, ka ya na ya nọrọ. Ebe ọ na-agụ n’ime Akwụkwọ Nsọ bụ ebe e kwuru, sị,

“Dịka atụrụ a na-aga igbu egbu

Ma ọ bụ ka nwaatụrụ si ada ogbi

n’ihu ndị na-akpụchasị ya ajị,

o megheghị ọnụ ya. Ha budara ya ala,

jụ inye ya ikpe nkwụmọtọ.

Onye ga-akọwalị maka agbụrụ ya?

N’ihina a napụla ya ndụ ya.”

Ọnọzi ahụ jụrụ Filip sị “Biko, gwa m, onye amụma a, ọ na-ekwu maka onye? Ọ na-ekwu maka onwe ya ka ọ bụ maka onye ọzọ?” Filip meghere ọnụ ya malite n’ebe ahụ ọ na-agụ n’Akwụkwọ Nsọ, gwa ya okwuchukwu maka Jesu.

Mgbe ha na-aga n’ụzọ, ha bịarutere na mmiri, ọnọzi ahụ asị Filip, “Lee, ihe a bụ mmiri, gịnị ga-egbochi ime m mmirichukwu?” Filip asị ya, “Ọ bụrụ na i ji obi gị niile kwere na Kristi, e nwere ike ime gị mmirichukwu,”

Ọnọzi ahụ zaghachiri ya, sị, “Ekwere m na Jesu Kristi bụ nwa nke Chineke” O nyere iwu ka ụgbọ ịnyịnya ahụ kwụsị, ya na Filip rịda, banye n’ime mmiri, Filip emee ya mmirichukwu.

Mgbe ha siri na mmiri pụta, Mmụọ nke Onyenweanyị, wepụrụ Filip, Ọnọzi ahụ ahụghịkwa ya ọzọ, ma o weere ọñụ laba. Ebe a hụziri Filip bụ n’Azọtus. O jegharịkwara n’obodo niile dị n’ala ahụ, na-ekwusa oziọma ruo mgbe ọ bịaruru Sizeria.

ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 66:8-9,16-17, 20

Azịza: Ụwa niile tikuenụ Chineke mkpu ọñụ.

1. Ụnụ mba niile gọzienụ Chineke anyị,

meenụ ka otito ya gbasaa n’ụwa niile,

onye na-enye mkpụrụobi anyị ndụ,

na-emekwa ka anyị ghara ijehie ụzọ.

Azịza: Ụwa niile tikuenụ Chineke mkpu ọñụ.

2. Bịanụ gee ntị ụnụ niile na-atụrụ Chineke egwu,

ka m na-akọrọ ụnụ ihe o meere m;

Oge m bekuru ya,

ukwe otito dịkwa m n’ire.

Azịza: Ụwa niile tikuenụ Chineke mkpu ọñụ.

3. Ngọzi dịrị Chineke,

onye na-eledaghị ekpere m,

ma ọ bụ jụ igosi m ịhụnaanya ya.

Azịza: Ụwa niile tikuenụ Chineke mkpu ọñụ.

MBEKU

ALLELUIA ALLELUIA:

Jesu Kristi, ịbu onye akaebe dị ntụkwasịobi, onye mbụ si na ndị nwụrụ anwụ pụta, ị hụrụ anyị n’anya, were ọbara gị sachapụ njọ anyị.

ALLELUIA.

OZIỌMA – 6:44-51.

Ihe Ọgụgụ ewetara n’Oziọma dị asọ nke Jọn dere.

Jesu gwara igwe mmadụ ahụ sị: “Ọ dịghị onye ọbụla nwere ike ịbịakwute m, ma ọ bụrụ na Nna zitere m akpọtaghịrị m ya. Aga m akpọlite ya n’ọnwụ n’ụbọchị ikpeazụ.

E dere ya n’akwụkwọ ndị Amụma sị, Chineke ga-akụziri ha niile ihe. Onye ọbụla nke gere ntị ma mụtakwa ihe n’aka Nna m na-abịakwute m. Ọ bụghị na onye ọbụla ahụla Nna ahụ anya, ma ọ bụghị onye ahụ nke si n’ebe Chineke nọ bịa.

N’ịgwa ụnụ eziokwu, onye ọbụla nke na-ekwere na-enwe ndụ ebeebe. Abụ m nri nke ndụ; Nna ụnụ ha riri Mana ahụ n’ime ọzara ma mechaa nwụọ. Nke a bụ nri nke si n’eluigwe bịa, nke na onye riri ya agaghị anwụ anwụ.

Abụ m nri ahụ dị ndụ nke si n’eluigwe bịa. Onye ọbụla riri nri a ga-adị ndụ ruo mgbe ebighịebi. Nri ahụ nke m ga-enye maka ndụ nke ụwa bụ ahụ m.”

Igbo Mass Readings for May 9 2025, Fraịde Izuụka nke Atọ n’oge Mbilite n’Ọnwụ Kristi.

Igbo Mass Readings for May 8 2025, Tọọzde Izuụka nke Atọ n’oge Mbilite n’Ọnwụ Kristi.