Igbo Mass Readings for September 3 2026, Tọọzde Izuụka nke Iri Abụọ na Abụọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.

Nke a bụ Igbo Mass Readings for September 3 2026, Tọọzde Izuụka nke Iri Abụọ na Abụọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 3:18-23

Ihe Ọgụgụ e wetara n’akwụkwọozi nke Mbụ Pọl degaara ndị Kọrịnt

Onye ọbụla n’ime ụnụ arafula onwe ya! Ọ bụrụ na onye ọbụla n’etiti ụnụ na-eche na ya maara ihe dịka nghọta nke oge a si dị, ya mee onwe ya onye nzuzu ka o wee bụrụ onye maara ihe.

N’ihina amamihe nke ụwa nke a bụ ihe nzuzu n’ebe Chineke nọ. N’ihina e dere ya n’akwụkwọ nsọ sị: “Ọ na-enwude ndị oke amamihe n’ime aghụghọ ha niile.”

Ọzọkwa: “Onyenweanyị amarala na ihe ndị oke amamihe na atụle n’obi ha bụ ihe efu.” Ya mere onye ọbụla anyala isi n’ihe mmadụ pụrụ ime.

N’ihina n’eziokwu ihe niile bụ nke ụnụ: Mọbụ Pọl, mọbụ, Apọlọs, mọbụ Pita; mọbụ ụwa, mọbụ ndụ, mọbụ ọnwụ, mọbụ ihe dị ugbu a, mọbụ nke gaje ịdị, ihe ndị a niile bụ nke ụnụ. Ụnụ onwe ụnụ bụ nke Kristi ma Kristi bụ nke Chukwu.

ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 24:1-2, 3-4, 5-6

Azịza: Dinwenụ nwe ụwa na ihe niile dị na ya.

1. Chineke nwe ụwa na ihe niile dị na ya,

Ụwa na ndị niile bi n’ime ya;

Ọ bụ ya wukwasara ya n’elu mmiri

Ọ bụ ya wuru ya n’elu osimiri.

Azịza: Dinwenụ nwe ụwa na ihe niile dị na ya.

2. Onye nwere ike irigoro n’ugwu nke Onyenweanyị?

Onye nwere ike ịnọ n’ebe ya dị nsọ?

Onye aka ya na obi ya dị ọcha.

Onye anaghị etinye obi ya n’ihe efu.

Azịza: Dinwenụ nwe ụwa na ihe niile dị na ya.

3. Onye dị otu a ga-anata ngọzi n’aka Onyenweanyị,

Ọ ga-anatakwa eziomume n’aka Chineke onye nzọpụta ya.

Ọ bụ ndị dị otu a na-achọ Onyenweanyị

Ndị na-achọ ihu Chineke nke Jekọb!

Azịza: Dinwenụ nwe ụwa na ihe niile dị na ya.

MBEKU – Jọn 8:12

Alleluia, Alleluia:        

Abụ m ihe nke ụwa, onye ọbụla na-eso m ga-enwe ihe nke ndụ.

Alleluia

OZIỌMA – 5:1-11

Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Luk dere

Ka Jesu guzo n’ọdọmmiri Genesaret, oke igwe mmadụ zukọrọ na-adagide ya ka ha nụrụ okwu Chineke. Ọ hụrụ ụgbọmmiri abụọ n’ụsọ ọdọmmiri ahụ; ma ndị ọkụazụ esila n’ụgbọ ahụ pụọ na-asa ụgbụ ha.

Ka Jesu banyere n’ime otu ụgbọ ahụ nke bụ nke Saịmọn, Ọ gwara ya ka o si n’ala kwọpụ ụgbọmmiri ya ntakịrị. O wee nọdụ ala si n’ụgbọmmiri ahụ na-akụziri ndị mmadụ ihe.

Mgbe Jesu kwubiri okwu, Ọ gwara Saịmọn sị, “Nupu ụgbọ gị n’ogbummiri, wunye ụgbụ gị maka igbu azụ.”

Ma Saịmọn zara sị, “Nna anyị ukwu, anyị dọlịrị abalị niile n’enwetaghị ihe ọbụla, mana otu I siri kwu, aga m awụnye ụgbụ m niile.”

Mgbe ha mere nke a ha kụtara oke igwe azụ nke mere na ọ fọdụrụ ntakịrị ka ụgbụ ha dọkaa. Nke a mere ha ji kpọọ ndị ọkụazụ ibe ha nọ n’ụgbọmmiri nke ọzọ ka ha bịa nyere ha aka.

Ha bịara gbujuo ụgbọ abụọ ahụ azụ nke mere na ụgbọ ha malitere imikpu. Ma mgbe Saịmọn Pita hụrụ nke a, ọ dara n’ụkwụ Jesu na-ekwu sị, “Si n’ebe m nọ pụọ n’ihina abụ m onye njọ, O Dinwenụ m.”

N’ihina o juru Pita na ndị ya na ha so anya ịhụ ọtụtụ azụ ndị a ha gbutere. Otu a ka o mekwara Jemis na Jọn ụmụ Zebedi ndị ha na Saịmọn bụ ndị nnwekọ.

Jesu zara Saịmọn sị, “Ụjọ atụla gị, site ugbu a gaba, ị ga na-akụta mmadụ. Mgbe ha kwọpụtara ụgbọ ha n’elu ala, ha hapụrụ ihe niile sobe ya.

Igbo Mass Readings for September 4 2026, Fraịde Izuụka nke Iri Abụọ na Abụọ N’Oge Adanyeghị n’Emume

Igbo Mass Readings for September 3 2026, Tọọzde Izuụka nke Iri Abụọ na Abụọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.