Igbo Mass Readings for October 9 2025, Tọọzde Izuụka nke Iri Abụọ na Asaa N’Oge Adanyeghị n’Emume.

Nke a bụ Igbo Mass Readings for October 9 2025, Tọọzde Izuụka nke Iri Abụọ na Asaa N’Oge Adanyeghị n’Emume.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 3:13-20

Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Onye Amụma Malachi

Ụnụ ekwuola ọtụtụ okwu dị ike megide m, ọ bụ Yahweh na-ekwu. Ma ụnụ na-asị, “Kedụ ka anyị si kwuo okwu megide gị?” Ụnụ ekwuola sị, ọ bụ iheefu ife Chineke.

Kedụ uru ọ baara anyị idebe iwu ya, mọbụ na-aga ka ndị na-eru ụjụ n’ihu Yahweh nke igwe ndịagha? Bidozie ugbu a, anyị na-ahụ ndị ngala dịka ndị a gọziri agọzi; anyị na-echekwa na ndị arụrụala na-aga n’ihu, ma mgbe ha nwalere Chineke ha na-alafere.

Mgbe ahụ ndị na-atụ Yahweh egwu gwarịtara onwe ha okwu. Yahweh nụrụ, ma gee ha ntị; e dekwara akwụkwọ ncheta n’ihu ya maka ndị niile na-atụ Yahweh egwu, ma na-eche echiche banyere aha ya.

Ha ga-abụ ndị nke m, Ọ bụ Yahweh nke igwe ndịagha na-ekwu, ndị m ga enwe n’ụzọ pụrụ iche n’ụbọchị m ga-akpa ike. Ọzọkwa, aga m agbaghara ha dịka nna si agbaghara nwa na-asọpụrụ ya.

Mgbe ahụ ị ga-ama ihe dị iche n’etiti onye eziomume na onye ajọomume, n’etiti onye na-efe Chukwu na onye anaghị efe ya.

ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps 1: 1-2, 3, 4, 6

Azịza: Añụrị na-adịrị ndị chekwubere na Dinwenụ

1. Añụrị ga-adịrị nwoke ahụ

nke anaghị eso ndụmọdụ onye ajọomume,

mọbụ na-akwụgharị n’ụzọ ndị ome njọ,

mọbụ nọdụ n’otu ndị na-ekwutọ Chineke;

kama ọ na-enwe añụrị n’ebe iwu Onyenweanyị dị;

ma na-echegharị iwu ya n’obi ya ehihie na abalị.

Azịza: Añụrị na-adịrị ndị chekwubere na Dinwenụ

2. Ọ dị ka osisi a kụrụ n’akụkụ iyi,

nke na-amịpụta mkpụrụ ya n’oge ya

nke akwụkwọ ya anaghị akpọnwụ akpọnwụ,

ihe niile ọ na-eme na-agara ya nke ọma.

Azịza: Añụrị na-adịrị ndị chekwubere na Dinwenụ

3. Ọ dịghị otu a n’ebe ndị ajọ mmadụ nọ

Mba! n’ihina ha dịka afụrụ ọka

nke ikuku na-ebugharị

N’ihina Onyenweanyị na-echekwaba ụzọ ndị eziomume,

mana ụzọ ndị ajọ mmadụ ugwu nke m dị nsọ.

Azịza: Añụrị na-adịrị ndị chekwubere na Dinwenụ

MBEKU – Ps. 19:9

Alleluịa, Alleluịa:

Okwu gị Onyenweanyị na-enye obi añụrị. Nkụzi gị bụ ihe e ji ahụ ụzọ

Alleluịa.

OZIỌMA – 11:5-13

Ihe ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Luk dere.

Jesu gwara ndị na-eso ụzọ ya sị, “Onye n’ime ụnụ nwere enyi ga-agakwuru ya n’etiti abalị sị ya, ‘Enyi m, binye m ogbe achịcha atọ; n’ihina otu enyi m si n’ije pụta n’ụlọ m.

Enweghịkwa m ihe oriri ọbụla m ga-enye ya.’ Ma ọ ga-esi n’ime ụlọ zaghachi sị, ‘Esogbula m, anyị emechiela ụzọ ugbu a, mụ na ụmụaka m alabaala ụra, agaghị m enwe ike ikuli nye gị ihe ọbụla?’

Agwa m ụnụ, ọ bụ ezie na ọ gaghị ekuli nye ya ihe ọbụla n’ihina ọ bụ enyi ya, ma n’ihi nsogbu ya ọ ga-ekuli nye ya ihe ọbụla dị ya mkpa.

Ya mere agwa m ụnụ, rịọnụ, a ga-enye ụnụ, chọọnụ, ụnụ ga-achọta, kụọnụ aka, a ga-emeghere ụnụ.

N’ihina onye ọbụla na-arịọnụ na-arịọta, onye ọbụla na-achọnụ na-achọta, onye ọbụla na-akụ aka ka a ga-emeghere.

Kedụ nna n’etiti ụnụ nwa ya ga-arịọ azụ, o nye ya agwọ; mọbụ ọ rịọ ya akwa, o nye ya akpị?

Ọ bụrụ na ụnụ bụ ndị ọjọọ maara otu e si enye ụmụ ụnụ onyinye dị mma, nna ụnụ nke bi n’igwe aghaghị inye ha Mmụọ Nsọ bụ ndị niile na-arịọ ya!”

Igbo Mass Readings for October 10 2025, Fraịde Izuụka nke Iri Abụọ na Asaa N’Oge Adanyeghị n’Emume.

Igbo Mass Readings for October 9 2025, Tọọzde Izuụka nke Iri Abụọ na Asaa N’Oge Adanyeghị n’Emume.