Igbo Mass Readings for October 8 2026, Tọọzde Izuụka nke Iri Abụọ na Asaa N’Oge Adanyeghị n’Emume.
Nke a bụ Igbo Mass Readings for October 8 2026, Tọọzde Izuụka nke Iri Abụọ na Asaa N’Oge Adanyeghị n’Emume.
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 3:1-5
Ihe ọgụgụ e wetara n’akwụkwọ Pọl dị Asọ degaara Galeshịa
Ewo! ụnụ ndị Galeshịa enweghị uche! Onye megharịrị ụnụ anya, ụnụ bụ ndị e mere ka ọnwụ Jesu Kristi n’elu obe bụrụ ihe were ụnụ anya?
Ka m jụọ ụnụ otu ihe: Ụnụ natara Mmụọ Nsọ site n’ịrụ ọrụ iwu chọọrọ ka ọ bụ site na nkuzi nke okwukwe?
Ụnụ dị oke nzuzu? Ụnụ malitere site n’ike nke Mmụọ Nsọ, ma ugbu a ụnụ na-akwusịzi n’ike nke anụahụ? Ụnụ tara ọtụtụ ahụhụ dị otu a n’efu?
Ọ bụrụ n’ezie na ọ bụ n’efu, ka m jụkwaa ụnụ ajụjụ ọzọ. Mmụọ Nsọ ahụ Chineke nyere ụnụ, na ọrụ ebube ọ rụrụ n’etiti ụnụ, o mere ha n’ihi iwu ụnụ dobere ka ọ bụ n’ihina ụnụ nụrụ ma kwerekwa n’oziọma?
ABỤỌMA NA AZỊZA – Lk 1:69-70, 71-72, 73-75.
Azịza: Ngọzi dịrị Dinwenụ Chineke nke Izrel maka na ọ bịara leta ndị nke ya.
1. O welitere anyị Onyenzọpụta
site n’agbụrụ Devid nwodibo ya;
Otu o siri kwuo n’oge ochie
site n’ọnụ ndị amụma ya.
Azịza: Ngọzi dịrị Dinwenụ Chineke nke Izrel maka na ọ bịara leta ndị nke ya.
2. Na a ga-azọpụta anyị site n’aka ndị iro anyị
na sitekwa n’aka ndị niile kpọrọ anyị asị,
Gosi ebere nke o kwere nnanna anyị ha na nkwa
bịa chetakwa ọgbụgbandụ ya dị nsọ.
Azịza: Ngọzi dịrị Dinwenụ Chineke nke Izrel maka na ọ bịara leta ndị nke ya.
3. Ọ ñụụrụ nnanna anyị bụ Abraham iyi,
Kwekwa nkwa na ya ga-azọpụta anyị n’aka ndị iro anyị
ka anyị nwee ike na-ekpere ya n’atụghị egwu ọbụla
N’ịdị nsọ na eziomume n’ihu ya
ụbọchị niile nke ndụ anyị.
Azịza: Ngọzi dịrị Dinwenụ Chineke nke Izrel maka na ọ bịara leta ndị nke ya.
MBEKU – Ps. 19:9
Alleluịa, Alleluịa:
Okwu gị Onyenweanyị na-enye obi añụrị. Nkụzi gị bụ ihe e ji ahụ ụzọ
Alleluịa.
OZIỌMA – 11:5-13
Ihe ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Luk dere.
Jesu gwara ndị na-eso ụzọ ya sị, “Onye n’ime ụnụ nwere enyi ga-agakwuru ya n’etiti abalị sị ya, ‘Enyi m, binye m ogbe achịcha atọ; n’ihina otu enyi m si n’ije pụta n’ụlọ m.
Enweghịkwa m ihe oriri ọbụla m ga-enye ya.’ Ma ọ ga-esi n’ime ụlọ zaghachi sị, ‘Esogbula m, anyị emechiela ụzọ ugbu a, mụ na ụmụaka m alabaala ụra, agaghị m enwe ike ikuli nye gị ihe ọbụla?’
Agwa m ụnụ, ọ bụ ezie na ọ gaghị ekuli nye ya ihe ọbụla n’ihina ọ bụ enyi ya, ma n’ihi nsogbu ya ọ ga-ekuli nye ya ihe ọbụla dị ya mkpa.
Ya mere agwa m ụnụ, rịọnụ, a ga-enye ụnụ, chọọnụ, ụnụ ga-achọta, kụọnụ aka, a ga-emeghere ụnụ.
N’ihina onye ọbụla na-arịọnụ na-arịọta, onye ọbụla na-achọnụ na-achọta, onye ọbụla na-akụ aka ka a ga-emeghere.
Kedụ nna n’etiti ụnụ nwa ya ga-arịọ azụ, o nye ya agwọ; mọbụ ọ rịọ ya akwa, o nye ya akpị?
Ọ bụrụ na ụnụ bụ ndị ọjọọ maara otu e si enye ụmụ ụnụ onyinye dị mma, nna ụnụ nke bi n’igwe aghaghị inye ha Mmụọ Nsọ bụ ndị niile na-arịọ ya!”
Igbo Mass Readings for October 9 2026, Fraịde Izuụka nke Iri Abụọ na Asaa N’Oge Adanyeghị n’Emume.
Igbo Mass Readings for October 8 2026, Tọọzde Izuụka nke Iri Abụọ na Asaa N’Oge Adanyeghị n’Emume.