Igbo Mass Readings for October 22 2026, Tọọzde Izuụka nke Iri Abụọ na Itoolu N’Oge Adanyeghị n’Emume.

Nke a bụ Igbo Mass Readings for October 22 2026, Tọọzde Izuụka nke Iri Abụọ na Itoolu N’Oge Adanyeghị n’Emume.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 3:14-21

Ihe ọgụgụ e wetara n’akwụkwọ Pọl dị Asọ degaara Efesọs.

N’ihi nke a ka m ji gbuoro nna ikpere m abụọ n’ala, onye ezinụụlọ niile dị n’eluigwe na nke dị n’ụwa si nweta aha.

Ka o wee bụrụ na site n’ụba nke otito ya, ọ ga-eme ka ụnụ sie ike na Mmụọ ya nke dị ụnụ n’ime;

ka Kristi nwee ike biri n’obi ụnụ site n’okwukwe, ka ụnụ ndị gbanyere mgbọrọgwụ kwụdosikwa ike n’ịhụnaanya, nwee ike isoro ndị nsọ niile ghọta ihe bụ obosara, ogologo, ịdị elu na ịdị omimi, na ịmatakwa ịhụnaanya nke Chineke nke kariri amamiihe, ka ụnụ jupụtakwa n’izu oke niile nke Chineke.

Ugbu a, onye nke zitere ike ahụ dị ire n’ime anyị, nwere ike ime n’uju karịa ihe niile anyị rịọrọ mọbụ chee n’uche. Ka otito dịrị ya n’ime nzukọ na n’ime Kristi, ruo ọgbọ niile ebighịebi ebighịebi. Amen.

ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 33:1-2, 4-5, 11-12, 18-19.

Azịza: Ịhụnaanya nke onyenweanyị jupụtara n’ụwa.

1. Tierenụ Chineke mkpu ọñụ ndị eziomume,

n’ihina otito kwesịrị ndị obi ha kwụ ọtọ,

Werenụ ụbọ akwara too Chineke;

Werenụ une kụọrọ ya egwu.

Azịza: Ịhụnaanya nke onyenweanyị jupụtara n’ụwa.

2. N’ihina okwu nke Onyenweanyị bụ eziokwu

Ọ na-akwụdosiike n’ọrụ ya niile,

Ọ hụrụ eziomume na ikpe nkwụmọtọ n’anya,

ịhụnaanya ya jupụtara n’ụwa.

Azịza: Ịhụnaanya nke onyenweanyị jupụtara n’ụwa.

3. Mana atụmaatụ Chineke ga-adị ọkpụ,

Echiche obi ya niile ga-adị ebeebe

Añụrị na Ngọzi na-adịrị mba Chineke bụ Chukwu ha

ndị nke ọ họọrọ dịka ndị nke ya.

Azịza: Ịhụnaanya nke onyenweanyị jupụtara n’ụwa.

4. Ma lee ka Onyenweanyị si eleta ndị niile na-atụrụ ya egwu anya

ndị niile tụkwasịrịobi ha n’ịhụnaanya ya,

Ka O wee zọpụta mkpụrụobi ha n’ọnwụ,

ma chekwaba ha oge ụnwụ.

Azịza: Ịhụnaanya nke onyenweanyị jupụtara n’ụwa.

MBEKU – Jọn 8:12

Alleluịa, Alleluịa

Abụ m ihe nke ụwa, Onyenweanyị na-ekwu, onye ọbụla na-eso m ga-enwe ihe nke ndụ.

Alleluịa.

OZIỌMA – 12:49-53

Ihe ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Luk dere.

Jesu gwara ndị na-eso ụzọ ya sị, “Abịara m ịmụnye ọkụ n’elu ụwa, olee otu obi ga-adị m ma a sị na ọkụ ahụ enwurula ugbu a!

Enwere m mmirichukwu nke a ga-eme m: Ọ ga na-egbukwa m mgbu n’obi nke ukwuu ruo mgbe m mezuru ya.

Ụnụ chere na m bịara ịweta udo n’ụwa? Mba, agwa m ụnụ! kama abịara m iweta nkewa; n’ihina site ugbu a gaba, mmadụ ise bi n’otu ụlọ ga-ekewa, atọ, ga-emegide abụọ, abụọ ga-emegide atọ;

ha ga-ekewa, nna emegide nwa ya nwoke, nwa emegide nna ya, nne ga-emegide nwa ya nwaanyị, nwa ya nwaanyị emegide nne ya, nne dị emegide nwunye nwa ya, nwunye nwa ya emegide nne dị ya.

Igbo Mass Readings for October 23 2026, Fraịde Izuụka nke Iri Abụọ na Itoolu N’Oge Adanyeghị n’Emume.

Igbo Mass Readings for October 22 2026, Tọọzde Izuụka nke Iri Abụọ na Itoolu N’Oge Adanyeghị n’Emume.