Igbo Mass Readings for August 28 2025, Tọọzde n’ime Izuụka nke Iri Abụọ na Otu N’Oge Adanyeghị n’Emume.
Nke a bụ Igbo Mass Readings for August 28 2025, Tọọzde n’ime Izuụka nke Iri Abụọ na Otu N’Oge Adanyeghị n’Emume.
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 3:7-13
Ihe Ọgụgụ e wetara n’akwụkwọozi mbụ Pọl Degaara Ndị Tesalonịka
Ụmụnna m, n’ime ahụhụ na mkpagbu anyị niile anyị enweela nkasiobi n’ebe ụnụ nọ maka okwukwe ụnụ. Ugbu a, anyị ga-adị ndụ ma ọ bụrụ na ụnụ akwụdosie ike n’ime Dinwenụ.
Olee ụdị ekele anyị ga-enye Chineke maka ụnụ na ụdị ọñụ niile anyị na-enwe n’ihu Chineke anyị n’ihi ụnụ?
Anyị na-arịọsi ya ike ehihie na abalị ka anyị hụ ụnụ ihu na ihu, wee tinyezuo ihe fọdụrụ n’okwukwe ụnụ. Ugbu a ka Chineke bụ Nna anyị n’onwe ya na Dinwenụ anyị Jesu Kristi duru anyị bịakwute ụnụ.
Ka Dinwenụ mee ka ịhụnaanya ụnụ nwere n’ebe ibe ụnụ nọ na n’ebe mmadụ niile nọ bawanye, otu ịhụnaanya anyị nwere n’ebe ụnụ nọ siri baa ụba.
Ka o wee wusie obi ụnụ ike meekwa ka ụnụ zuo oke n’ịdị nsọ n’ihu Chineke Nna anyị, mgbe Dinwenụ anyị Jesu na ndị nsọ ya niile ga-abịa.
ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 90:3-4, 12-13, 14, 17
Azịza: Dinwenụ mee ka ịhụnaanya gị jupụta n’ime anyị, ka anyị nweekwa ike ikwe ukwe añụrị.
1. Ị na-akpọghachi mmadụ na ntụ site n’igwa ya sị,
Laghachinụ ebe ụnụ si, ụmụ mmadụ
N’anya gị puku afọ dịka otu ụbọchị
Dịka ụnyahụ nke gaferelanụ
Mọbụ otu nche abalị.
Azịza: Dinwenụ mee ka ịhụnaanya gị jupụta n’ime anyị, ka anyị nweekwa ike ikwe ukwe añụrị.
2. Kuziere anyị ịmata ka ndụ anyị siri dị nke nke,
Ka anyị were si otu a bụrụ ndị maara ihe.
Onyenweanyị medoo obi iwe gị ọ ga-adị ọkpụ?
Meere ụmụodibo gị ebere.
Azịza: Dinwenụ mee ka ịhụnaanya gị jupụta n’ime anyị, ka anyị nweekwa ike ikwe ukwe añụrị.
3. Ka ịhụnaanya gị jupụta n’ime anyị ụtụtụ ọbụla,
Ka anyị were nwee ike ikwe ukwe
ma nweekwa añụrị ụbọchị niile nke ndụ anyị.
Mee ka ịdịụtọ gị nọnyere anyị O Onyenweanyị
Iji were kwado ọrụ nke anyị rụrụ
Ma meekwa ka anyị nwee ọganịihu n’ihe niile anyị na-eme.
Azịza: Dinwenụ mee ka ịhụnaanya gị jupụta n’ime anyị, ka anyị nweekwa ike ikwe ukwe añụrị.
MBEKU – Luk 8:15
Alleluia, Alleluia:
Ha nwere isi ọma bụ ndị nụrụ okwu Chineke, were ikwesị ntụkwasịobi na obi dị mma jidesie ya ike, werekwa ndidi mịpụta mkpụrụ.
Alleluia
OZIỌMA – 24:42-51
Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Matiu dere
Jesu gwara ndị na-eso ụzọ ya sị, “Na-echenụ nche n’ihina ụnụ amaghị n’ụbọchị Onyenwe ụnụ ga-abịa. Matanụ nke a, ọ bụrụ na nna nwe ụlọ matara oge abalị onye ohi ga-eji bịa n’ụlọ ya, ọ garala amụ anya na eche nche.
Ọ gaghị ahapụ ụlọ ya ka a kụwaa ya. N’otu aka ahụ ụnụ onwe ụnụ ga-adị njikere n’ihina nwa nke mmadụ ga-abịa n’oge ụnụ atụghị anya ya.
Onye bụ odibo ahụ nke maara ihe kwesịkwara ntụkwasịobi; onye nna ya ukwu mere onye isi ezinụụlọ ya ka ọ na-enye ha nri n’oge kwesịrịnụ?
Ngọzi ga-adịrị nwodibo ahụ, onye nke nna ya ukwu ga-ahụ, ka ọ na-eme otu a mgbe ọ ga-abịa. N’ezie agwa m ụnuụ: Nnaukwu odibo ahụ ga-eme ya onyeisi nke ihe niile o nwere.
Ma ọ bụrụ na nwodibo ọjọọ ahụ agwa onwe ya sị; Nna m ukwu agaghị alọta n’oge, wee bido iti ụmụodibo ibe ya ihe, sorokwa ndị añụrụma na-eri ma na-añụ.
Nnaukwu odibo ahụ ga-abịa n’ụbọchị ọ na-atụghị anya na elekere ọ na-amaghị. Ọ ga-ata ya ahụhụ, dokọta ya na ndị ihuabụọ n’ebe ahụ ndị mmadụ ga-anọ na-ebe akwa ma taakwa ikikere eze.
Igbo Mass Readings for August 28 2025, Tọọzde n’ime Izuụka nke Iri Abụọ na Otu N’Oge Adanyeghị n’Emume.