Igbo Mass Readings for August 27 2026, Tọọzde Izuụka nke Iri Abụọ na Otu N’Oge Adanyeghị n’Emume.

Nke a bụ Igbo Mass Readings for August 27 2026, Tọọzde Izuụka nke Iri Abụọ na Otu N’Oge Adanyeghị n’Emume.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 1:1-9

Ihe Ọgụgụ e wetara n’akwụkwọozi nke Mbụ Pọl degaara ndị Kọrịnt

Pọl, onye a kpọrọ ịbụ nwaazụ nke Jesu Kristi, site na nzube nke Chineke, na Sostenis bụ nwanna anyị; na-edegara nzukọ Chineke nke dị na Kọrịnt akwụkwọozi, bụ ndị e doro nsọ n’ime Jesu Kristi, ndị a kpọrọ ịbụ ndị nsọ nke Chineke, ha na ndị niile, n’ebe niile na-akpọku aha Onyenweanyị Jesu Kristi, bụ Dinwenu anyị na ha.

Ka amara na udo si n’aka Chukwu nna na Onyenweanyị Jesu Kristi dịịrị ụnụ. Ana m ekele Chineke mgbe niile n’ihi ụnụ, n’ihi amara nke o nyere ụnụ n’ime Jesu Kristi.

Ana m ekelekwa ya, n’ụzọ ọbụla ụnụ jupụtara n’amara ya, ma n’okwu ụnụ ma na nghọta ụnụ. N’ihina ịgba akaebe banyere Kristi pụtara ihe, kwụdosikwa ike na ndụ ụnụ.

Otu ihe si dị, ọ dịghị onyinye mmụọ fọdụrụnụ nke ụnụ enweghị; ka ụnụ nọ na-eche mgbe Chineke ga-egosipụta Onyenweanyị Jesu Kristi, Onye ga-eme ka ụnụ kwụdosie ike ghara inwe ntụpọ ọbụla ruo n’ụbọchị nke Dinwenụ anyị Jesu Kristi.

Chineke kwesịrị ntụkwasịobi, onye e si n’aka ya kpọbata ụnụ na mmekọ nke nwa ya Jesu Kristi Dinwenụ anyị.

ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 145:2-3, 4-5, 6-7

Azịza: Onyenweanyị aga m eto aha gị ruo mgbe ebighịebi.

1. Ụbọchị niile, aga m eto gị

aga m eto aha gị ruo mgbe ebighịebi.

Onyenweanyị dị ukwuu kwesịkwa inye otito niile,

ebube ya dị omimi karịkwara nghọta.

Azịza: Onyenweanyị aga m eto aha gị ruo mgbe ebighịebi.

2. Aga m na-eto akaọrụ gị site na ndụdụgandụ ruo na ndụdụgandụ,

na-ekwupụtakwa ọrụ ebube gị

Aga m ekwupụta otito na ebube gị,

aga m atụgharị uche m n’ọrụ ebube gị niile.

Azịza: Onyenweanyị aga m eto aha gị ruo mgbe ebighịebi.

3. Ndị mmadụ ga-ekwupụta maka ike gị dị egwu,

mụ onwe m ga-ekwusiike banyere ịdị ukwuu nke gị

Ha niile ga-añụrị maka obiọma gị

werekwa ọñụ na-ekwupụta eziomume gị.

Azịza: Onyenweanyị aga m eto aha gị ruo mgbe ebighịebi.

MBEKU – Luk 8:15

Alleluia, Alleluia:

Ha nwere isi ọma bụ ndị nụrụ okwu Chineke, were ikwesị ntụkwasịobi na obi dị mma jidesie ya ike, werekwa ndidi mịpụta mkpụrụ.

Alleluia

OZIỌMA – 24:42-51

Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Matiu dere

Jesu gwara ndị na-eso ụzọ ya sị, “Na-echenụ nche n’ihina ụnụ amaghị n’ụbọchị Onyenwe ụnụ ga-abịa. Matanụ nke a, ọ bụrụ na nna nwe ụlọ matara oge abalị onye ohi ga-eji bịa n’ụlọ ya, ọ garala amụ anya na eche nche.

Ọ gaghị ahapụ ụlọ ya ka a kụwaa ya. N’otu aka ahụ ụnụ onwe ụnụ ga-adị njikere n’ihina nwa nke mmadụ ga-abịa n’oge ụnụ atụghị anya ya.

Onye bụ odibo ahụ nke maara ihe kwesịkwara ntụkwasịobi; onye nna ya ukwu mere onye isi ezinụụlọ ya ka ọ na-enye ha nri n’oge kwesịrịnụ?

Ngọzi ga-adịrị nwodibo ahụ, onye nke nna ya ukwu ga-ahụ, ka ọ na-eme otu a mgbe ọ ga-abịa. N’ezie agwa m ụnuụ: Nnaukwu odibo ahụ ga-eme ya onyeisi nke ihe niile o nwere.

Ma ọ bụrụ na nwodibo ọjọọ ahụ agwa onwe ya sị; Nna m ukwu agaghị alọta n’oge, wee bido iti ụmụodibo ibe ya ihe, sorokwa ndị añụrụma na-eri ma na-añụ.

Nnaukwu odibo ahụ ga-abịa n’ụbọchị ọ na-atụghị anya na elekere ọ na-amaghị. Ọ ga-ata ya ahụhụ, dokọta ya na ndị ihuabụọ n’ebe ahụ ndị mmadụ ga-anọ na-ebe akwa ma taakwa ikikere eze.

Igbo Mass Readings for August 28 2026, Fraịde n’ime Izuụka nke Iri Abụọ na Otu N’Oge Adanyeghị n’Emume

Igbo Mass Readings for August 27 2026, Tọọzde Izuụka nke Iri Abụọ na Otu N’Oge Adanyeghị n’Emume.