Igbo Mass Readings for August 21 2025, Tọọzde n’ime Izuụka nke Iri Abụọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.

Nke a bụ Igbo Mass Readings for August 21 2025, Tọọzde n’ime Izuụka nke Iri Abụọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 11:29-39

Ihe Ọgụgụ e wetara n’akwụkwọ Ndịikpe

Ya mere mmụọ Chineke dakwasara Jefta. O wee garuo Giled na Manase laghachi na Mizpa n’ime Giled sikwa ya ruo Amọn.

Jefta kwere Yahweh nkwa sị, “Ọ bụrụ na I mee ka m merie ndị Amọn, onye ọbụla buru ụzọ pụta n’ụlọ m izute m mgbe m lọtara na mmeri, aga m achụrụ gị ya dịka aja nsureọkụ.” Jefta wee gafee osimiri buso ndị Amọn agha. Osebụrụwa wee mee ka o merie ha.

O busoro ha agha, site na Aroa ruo n’ala ndị dị nsọ na Minit. Ha dị iri obodo abụọ n’ala ahụ. O wee chụrụkwa ha ruo Abel-Keramin.

N’ebe ahụ ọ sụrụ ha akwụ. Ndị Izrel wee merie ndị Amọn. Mgbe Jefta lọtara n’ụlọ ya na Mizpa, ọ hụrụ ka ada ya ji ite egwu ụbọ akwara na-apụta izute ya.

Naanị ada ya ahụ bụ nwa o nwere. Mgbe Jefta hụrụ ya ọ dọwara uwe ya n’iru ụjụ tie mkpu sị, “Ewo ada m! i meela ka obi m gbawaa! Gịnị mere o jiri bụrụ gị ga-ewetara m ihe mgbu nke a?

N’ihina ejila m ịñụ iyi kwe Osebụrụwa nkwa agaghị m a laghachikwa azụ!” O wee sị ya, “Nna m ọ bụrụ na I kwelarị Osebụrụwa nkwa, mee m otu I kwere ya na nkwa ebe ọ bụ na Yahweh emeela ka I merie ndịiro gị bụ ndị Amọn.

Ma ọ rịọrọ nna ya sị, “meere m otu ihe a; Nye m ọnwa abụọ, ka mụ na ndị enyi m kpagharịa n’ugwu ruo ụjụ, n’ihi ọnwụ a m na-aga ịnwụ n’ọnọdụ nwaagbọghọ na-amaghị nwoke.”

Nna ya wee sị ya, “gaa kpagharịa ọnwa abụọ.” Ya na ndị enyi ya wee gaa kpagharịa n’elu ugwu ruo ụjụ n’ihina ọ ga-anwụ n’alụghị di, n’amụtaghị nwa.

Mgbe ọnwa abụọ ahụ zuru, ọ laghachikwutere nna ya onye mere dịka o kwere Yahweh na nkwa, o wee nwụọ dịka nwaagbọghọ na-amaghị nwoke.

ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 40:5, 7-8, 8-9, 10

Azịza: Anọ m ebe a, ana m abịa ime uche gị

1. Ha nwere isi ọma bụ ndị ahụ tụkwasịrị nchekwube ha n’Onyenweanyị

Ndị na-adịghị akwụnyere ndị na-eweta ọgbaaghara

ndị na-efe Chukwu asị.

Azịza: Anọ m ebe a, ana m abịa ime uche gị

2. Ị naghị achọ ịchụ aja mọbụ ihe nrunye

kama ntị ghe oghe.

Ị naghị achọ aja nsureọkụ ma ọbụ aja maka njọ

Kama ekwuru m sị, Anọ m ebe a, Ana m abịa.

Azịza: Anọ m ebe a, ana m abịa ime uche gị

3. N’ime akwụkwọ iwu e dere

na m tosịrị ime uche gị

Chineke m ahụrụ iwu gị n’anya,

Eji m obi m niile hụ ya n’anya.

Azịza: Anọ m ebe a, ana m abịa ime uche gị

4. Ekwupụtala m eziomume nke Onyenweanyị

na nnukwu ọgbakọ.

Lee, emechighị m ọnụ m        

Ị maara nke a O Onyenweanyị.

Azịza: Anọ m ebe a, ana m abịa ime uche gị

MBEKU – 2 Thes 2:14

Alleluia, Alleluia:

Mụ na ndịeze na ndị ndụmọdụ nke ụwa, ndị na-arụgharịrị onwe ha ihe bibiri ebibi.

Alleluia

OZIỌMA – 22:1-14

Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Matiu dere

Jesu gwara ndị mmadụ okwu n’ụkabụilu ọzọ sị, “A ga-eji alaeze eluigwe tụnyere otu onyeeze nke kpọrọ oriri agbamakwụkwọ maka nwa ya nwoke.

O zipụrụ ụmụodibo ya ka ha gaa kpọọ ndị e ziri maka ya bụ oriri. Ma ha achọghị ịbịa. O zipụkwara ụmụodibo ya ndị ọzọ sị, “Gwanụ ndị niile a kpọrọ oriri, lee akwadochaala m ihe oriri.

E gbuola oke ehi na ụmụ ehi gbara abụba, ihe niile ezuole oke; bịazienụ maka oriri agbamakwụkwọ. Ndị ahụ a kpọrọ oriri gabara mkpa ha n’ihina ha akpọghị ya ihe ọ bụla.

Otu onye gabara n’ubi ya, nke ọzọ gaba ahịa, ebe ndịọzọ jidere ụmụodibo ya mee ha akaja, gbuokwa ha. Onyeeze ahụ were oke iwe, zipụ ndịagha ya.

Ha lara ndị ogbuọchụ ahụ niile n’iyi, gbakwaa obodo ha ọkụ. E mechaa ọ gwa ụmụodibo ya sị, “Akwadochaala m oriri agbamakwụkwọ, ma ndị a kpọrọ maka ya etosịghị etosị.

N’ihi nke a gazienụ n’agbata okporoụzọ niile. Kpọtanụ ndị niile ụnụ nwere ike ịhụ maka oriri agbamakwụkwọ a.”

Ụmụodibo ahụ wee gaa n’okporo ụzọ, kpọkọta ndị niile ha hụrụ ma ndị obi ọjọọ ma ndị ọma nke mere ka ụlọ ebe a na-eri oriri agbamakwụkwọ ahụ jupụta na ndị ọbịa.

Mgbe onyeeze ahụ batara ịhụ ndị ọbịa ahụ, ọ hụrụ otu nwoke nke eyighị uwe agbamakwụkwọ. Ọ jụrụ ya sị, “Enyi m olee otu I siri bata n’ebe a n’eyighị uwe agbamakwụkwọ?”

Okwughị okwu ọbụla. Onyeeze ahụ wee gwa ndị na-ejere ya ozi sị, “Keenụ ya agbụ, ụkwụ na aka, tụpụ ya n’ezi n’ime ọchịchiri, ebe ibe akwa na ịta ikiere eze ga-adị. N’ihina ọtụtụ ka a kpọrọ ma olemaole ka a họọrọ”.

Igbo Mass Readings for August 22 2025, Fraịde n’ime Izuụka nke Iri Abụọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.

Igbo Mass Readings for August 21 2025, Tọọzde n’ime Izuụka nke Iri Abụọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.