Igbo Mass Readings for November 26 2026, Tọọzde Izuụka nke Iri Atọ na Atọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.

Nke a bụ Igbo Mass Readings for November 26 2026, Tọọzde Izuụka nke Iri Atọ na Anọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 18: 1-2, 21-23:19:1-3, 9.

Ihe ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Mkpughe.

Mgbe nke a gachara, ahụrụ m, Mmụọọma ọzọ ka o si n’eluigwe na-agbadata. O nwere ike ọchịchị buru ibu, ebube ya na-enye ụwa ihe.

O ji oke olu tie mkpu sị, “Babịlọn adaala, Babịlọn obodo ukwu ahụ adaala, ọ ghọọla ebe obibi nke ndị mmụọ ọjọọ, bụrụkwa  ebe ịkpa nri nke ndị mmụọ na-adịghị ọcha, ebe ịkpa nri nke nnụnụ ọjọọ niile a na-asọ asọ.”

Otu mmụọọma siri ike buuru okwute buru ibu ka nkume ukwu e ji akwọ ọka tụba ya n’ime oke osimiri, kwuo sị, “Otu a ka a ga-esi atụba nnukwu obodo ahụ bụ Babịlọn n’ike, a gaghị ahụkwa ya ọzọ. 

A gaghị anụkwa n’ime gị ọzọ olu ndị ọkpọ ụbọakwara na ndị na-agụ egwu.  A gaghị anụ olu ndị na-egbu ọja na opiike n’ime gị ọzọ; a gaghị ahụkwa ndị ọrụ nka ọbụla n’ime gị ọzọ mọbụ nụkwa ụda nkume e ji akwọ ọka n’ime gị ọzọ.

Ihe nke mpanaka agaghịkwa acha n’ime gị ọzọ. A gaghị anụkwa olu di na nwunye gbara akwụkwọ n’ime gị ọzọ, ndị mgbereahịa gị bụ ndị a ma ama n’elu ụwa.

I ji anwansị gị duhie mba niile. Ka nke a gachara, anụrụ m ihe dịka oke olu nke igwe mmadụ nọ n’eluigwe na-eti mkpu sị, “Alleluya! nzọpụta, otito na ike bụ nke Chineke anyị!

N’ihina ikpe ya niile ziri ezi bụrụkwa eziokwu. O kpechaala nwaanyị akwụna ahụ nke jị akwamiko ya mebie ụwa niile.

Ọ bọọla ọbọ ọbara ụmụodibo ya n’isi nwaanyị ahụ.” Ọzọkwa, ha tiri mkpu sị, Alleluya! anwụrụ ọkụ si n’ime ya na-agbago eluigwe ebeebe ebeebe.”

Mmụọọma ahụ wee gwa m sị, “Detuo nke a: ha nwere isiọma bụ ndị a kpọrọ n’oriri agabmakwụkwọ nke nwaatụrụ ahụ.” Ọ gwakwara m ọzọ sị, “N’eziokwu ndị a bụ okwu nke Chineke.”

ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 100:2, 3, 4, 5.

Azịza: Ha nwere isiọma bụ ndị a kpọrọ n’oriri agbamakwụkwọ nke nwaatụrụ ahụ.

1.Ụwa niile tijerenụ Onyenweanyị mkpu ọñụ,

Werenụ ọñụ fee Onyenweanyị ofufe

Werenụ iti mkpu ọñụ bịa n’ihu ya.

Azịza: Ha nwere isiọma bụ ndị a kpọrọ n’oriri agbamakwụkwọ nke nwaatụrụ ahụ.

2. Maranụ na Onyenweanyị bụ Chineke,

ya kere anyị, Ọ bụkwa ya new anyị,

anyị bụ ndị nke ya, anyị bụkwa igwe atụrụ ya.

Azịza: Ha nwere isiọma bụ ndị a kpọrọ n’oriri agbamakwụkwọ nke nwaatụrụ ahụ.

3. Werenụ ekele baa n’ọnụụzọ ama ya niile,

werenụ otito baa n’ogige ya niile,

kelenụ ya, gọziekwanụ aha ya.

Azịza: Ha nwere isiọma bụ ndị a kpọrọ n’oriri agbamakwụkwọ nke nwaatụrụ ahụ.

4. N’ihina Onyenweanyị dị mma,

ịhụnaanya ya na-adị ebeebe,

ntụkwasịobi ya na-adịgide bido na ndụdụgandụ ruo na ndụdụgandụ.

Azịza: Ha nwere isiọma bụ ndị a kpọrọ n’oriri agbamakwụkwọ nke nwaatụrụ ahụ.

MBEKU – Luk 21:28

Alleluịa, Alleluịa:

Welitenụ isi ụnụ, lelie anya elu, n’ihina oge mgbapụta ụnụ abịala nso.

Alleluịa.

OZIỌMA – 21:20-28

Ihe ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Luk dere.

Jesu gwara ndị na-eso ụzọ ya sị, “Ma mgbe ọbụla ụnụ ga-ahụ Jerusalem ka usuu ndịagha gbara ya gburugburu, maranụ na oge ntikpọ na ịtọgbọrọ n’efu ya dị nso.

Mgbe ahụ, ka ndị nọ n’ala Judia gbaa ọsọ ndụ gaa n’ugwu. Ka ndị nọ n’ime obodo gbalaga. Ka ndị pụrụla n’ime obodo hapụkwa ịbata n’ime ya.

N’ihina ndị a ga-abụ ụbọchị ọbọ, ka ihe e dere n’Akwụkwọ Nsọ mezuo. Ahụhụ ga-adịrị ndị dị ime na ndị na-enye nwa ara n’oge ahụ!

N’ihina oke mkpagbu ga-adịkwa n’ala nke a. Iwe nke Chineke ga-adị n’ahụ ụmụ mmadụ. Ha ga-anwụ site na mma agha; a kpụrụkwa ha ka ohu nye mba niile.

Ndị mba ọzọ ga-etikpọ Jerusalem ruo mgbe ọchịchị ndị mba ahụ ga-ezu. Ihe nrịbaama dị iche iche ga-adị n’anyanwụ na ọnwa na kpakpando.

N’elu ụwa, mba dị iche iche ga-anọ na mkpagbu na mgbagwoju anya, n’ihi mbigbọ nke oke osimiri na nnugharị nke ebili mmiri.

Ọtụtụ mmadụ ga-enwe ume nkoropu n’ihi oke egwu na ile anya maka ihe ga-adakwasa ụwa, n’ihina a ga-enugharị ike niile nke eluigwe.

Mgbe ahụ ka a ga-ahụ Nwa nke Mmadụ ka O si n’urukpu na-abịa n’ike na oke ebube. Ma mgbe ihe ndị a malitere ime, welitenụ isi ụnụ lelie anya elu, n’ihina oge mgbapụta ụnụ abịala nso.

Igbo Mass Readings for November 27 2026, Fraịde Izuụka nke Iri Atọ na Atọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.

Igbo Mass Readings for November 26 2026, Tọọzde Izuụka nke Iri Atọ na Atọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.