Igbo Mass Readings for November 20 2025, Tọọzde Izuụka nke Iri Atọ na Atọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.

Nke a bụ Igbo Mass Readings for November 20 2025, Tọọzde Izuụka nke Iri Atọ na Atọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 2:15-29

Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Makabii nke Mbụ

E mechaa, ndị nnọchite anya eze, ndị na-amanye ndị mmadụ ka ha hapụ ife Chineke n’ụzọ nke ha, wee bata n’obodo Modein iji mee ka ha chụọrọ arụsị aja. Ọtụtụ ndị Izrel bịakwutere ha.

Matatiyas na ụmụ ya ndị nwoke sokwa n’otu ọgbakọ ahụ. Ndị nnọchite anya eze ahụ gwara Matatiyas sị: “Ị bụ onye ndu nwere ugwu, bụkwara onye a maara amara n’obodo a, nakwa onye ụmụ ya ndị nwoke na ụmụnne ya ndị nwoke kwụ n’azụ.

Ugbu a kwupụta ka ị bụrụ onye mbụ ga-eme ihe eze tiri n’iwu, dịka ndị mba ọzọ niile na ndị Juda, nakwa ndị fọrọ afọ na Jerusalem si mee. I mee otu a, gị na ụmụ gị ndị nwoke ga-esonye na ndị enyi eze, a bịa jikwara ọlaọcha na ọlaedo na onyinye dị icheiche bulite gị na ụmụ gị ndị nwoke elu.

Mana Matatiyas weliri olu elu zaa ya sị: “Ọ bụladị na mba niile nọ n’okpuru ọchịchị onyeeze egee ya ntị, bịa kweta idobe iwu ya, onye ọbụla n’ime ha ewee hapụ ụzọ ofufe ndị nna ya ochie; mụ onwe m na ụmụ m ndị nwoke nakwa ụmụnne m nwoke ga na-aga n’ihu idobe ọgbụgbandụ nke nna anyị ochie ha.

Chineke ekwekwala ka anyị hapụ iwu dị nsọ na omume ziri ezi. A bịa n’ihe gbasara iwu nke onyeeze, anyị agaghị edobe ha. Anyị agaghị atụgharị n’akanri mọbụ n’aka ekpe, hapụ usoro ofufe Chineke anyị.”

Ka ọ na-ekwucha okwu ndị a, otu onye Juu pụtara n’ihu mmadụ niile ka ọ chụọ aja n’elu ekwuaja dị na Modein dịka iwu eze siri kwuo. Mgbe Matatiyas hụrụ nke a, obi nụrụ ya ọkụ.

O metụ ya na mmụọ. N’iwe ya ziri ezi, o jiri ọsọ gbakwuru nwoke a, gbuo ya n’elu ebe ekwuaja ahụ. N’otu oge ahụ, o gbukwara onyennọchite anya eze bụ onye na-amanye ha ka ha chụọ aja, ma kụtuo ebe ịchụ aja ahụ.

N’ụzọ dị otu a ka Matatiyas si gosi otu idebe iwu ha dị nsọ si anụ ya ọkụ n’obi dịka Finehas si mee, megide Zimri nwa Salu. Mgbe ahụ ka Matatiyas nọọrọ n’ime obodo ahụ welite olu elu tie mkpu sị: “Ngwanụ onye ọbụla obi na-anụ ọkụ maka idebe iwu nwekwara nkwado n’ọgbụgbandụ Chineke, ya pụta sobe m!”

Ya na ụmụ ya ndị nwoke wee gbapụ gbalaga n’elu ugwu, hapụchaa ihe niile ha nwere n’ime obodo. Mgbe ahụ, ọtụtụ mmadụ ndị nwere mmasị n’eziomume na ikpe ziri ezi pụrụ, gaba n’ọzara biri ebe ahụ.

ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 50:1-2, 5-6, 14-15

Azịza: Aga m egosị ndị eziomume ike nzọpụta nke Chineke

1. Onyenweanyị, Chineke nke chi niile na-ekwu

Ọ na-akpọ ụwa niile bido n’ọwụwa anyanwụ ruo n’ọdịda ya

Bido na Zayọn bụ ebe kachasị mma

ka o si na-achawapụta.

Azịza: Aga m egosị ndị eziomume ike nzọpụta nke Chineke

2. Kpọkọtaranụ m ndị nke m kwere ekwe

Ndị mụ na ha gbara ndụ site n’aja ha chụrụ

Ka eluigwe niile kwupụta eziomume ya;

Mgbe Chineke n’onwe ya bụ onye ọkaikpe.

Azịza: Aga m egosị ndị eziomume ike nzọpụta nke Chineke

3. Ka inye ekele gị bụrụ aja nke ị na-achụnyere Chineke

Mejupụta iyi ị ñụụrụ onye kacha elu

Mgbe ahụ ọ bụrụ na ị kpọọ m n’oge nsogbu

Aga m azọpụta gị, ma, ị ga-asọpụrụ m.

Azịza: Aga m egosị ndị eziomume ike nzọpụta nke Chineke

MBEKU – Cor. 5:19

Alleluịa, Alleluịa:

Chineke sitere na Kristi na-eme ka ya na ụwa dị na mma. O tinyela n’aka anyị ozi banyere ụzọ o si eme ka ya na ụwa dị na mma.

Alleluịa.

OZIỌMA – 19:41-44.

Ihe ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Luk dere.

Mgbe Jesu bịaruru nso hụ nnukwu obodo ahụ bụ Jerusalem, o bere akwa maka ya sị, “A sị nnọọ na ị ma taa ihe ndị na-eweta udo! Ma ugbu a ezonahụla ya n’anya gị.

N’ihina ụbọchị ndị ahụ ga-adakwasa gị, mgbe ndịiro gị ga-akpagide gị, gbakwaa gị gburugburu n’akụkụ niile na-emegide gị.

Ha ga-akụtukwa gị na ụmụ gị n’ala, ha agaghị ahapụ otu mkpụrụ okwute n’elu ibe ya n’ime gị, n’ihina ị mataghị oge a bịakwutere gị.’

Igbo Mass Readings for November 21 2025, Fraịde Izuụka nke Iri Atọ na Atọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.

Igbo Mass Readings for November 20 2025, Tọọzde Izuụka nke Iri Atọ na Atọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.