Igbo Mass Readings for November 5 2026, Tọọzde Izuụka nke Iri Atọ na Otu N’Oge Adanyeghị n’Emume.
Nke a bụ Igbo Mass Readings for November 5 2026, Tọọzde Izuụka nke Iri Atọ na Otu N’Oge Adanyeghị n’Emume.
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 3:3-8
Ihe ọgụgụ e wetara n’akwụkwọ Pọl dị Asọ degaara ndi Filipi.
Ọ bụ anyị bụ ndị nwetara ezi obibi ugwu ahụ, ndị na-ekpere Chineke n’ime mmụọ, na-enwe otito na Jesu Kristi. Anyị anaghị atụkwasịobi n’anụahụ.
Ọ bụ ezie na mụ onwe m nwere ihe m ga-eji atụkwasịobi n’anụahụ. Ọ bụrụ na onye ọbụla ọzọ chere na o nwere ihe o ji atụkwasịobi n’anụahụ, mụ onwe m nwere karịa.
Mgbe a mụrụ m, e biri m ugwu n’ụbọchị nke asatọ. Abụ m onye Izrel si n’agbụrụ Benjamin pụta.
Abụ m nwaafọ Hibru, nne na nna m bụkwa ndị Hibru. N’ebe iwu dị, abụ m onye Farisii.
N’ihe gbasara ịnụ ọkụ n’obi, abụ m onye mkpagbu nke nzukọ. A bịa n’ime eziomume site n’idebe iwu, enweghị m ụta ọbụla.
Ana m agụ uru ọbụla m nwere dịka ihe lara n’iyi n’ihi oke uru ọ bara ịmata Jesu Kristi Dinwenụ.
N’ihi ya anarala m ahụhụ nke ịtụfu ihe niile m nwere, were ha dịka ihe abaghị uru, ka m wee rite Kristi n’uru na ka e wee hụ m n’ime ya.
ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 105: 2-3, 4-5, 6-7.
Azịza: Ka obi niile na-achọ Onyenweanyị ñụrịa.
1. Kweerenụ Onyenweanyị ukwe, kụọrọnụ ya egwu,
Kwupụtanụ ọrụ ịtụnaanya ya niile!
Nwebenụ añụrị n’aha nsọ ya
Ka obi niile na-achọ Chineke ñụrịa.
Azịza: Ka obi niile na-achọ Onyenweanyị ñụrịa.
2. Chọbanụ Onyenweanyị na ike ya
chọbanụ ihu nke Onyenweanyị mgbe niile,
Chetanụ ọrụ ebube niile ọ rụrụ,
ọrụ ịtụnaanya ya niile na ikpe niile si n’ọnụ ya pụta.
Azịza: Ka obi niile na-achọ Onyenweanyị ñụrịa.
3. Ụnụ ụmụ Abraham, bụ ụmụodibo ya,
ụmụ Jekọb bụ ndị nke ọ họọrọ!
Ọ bụ ya bụ Onyenweanyị na Chineke anyị,
Ike ọchịchị ya gazuru ụwa niile.
Azịza: Ka obi niile na-achọ Onyenweanyị ñụrịa.
MBEKU – Jọn 10:27
Alleluịa, Alleluịa:
Atụrụ m na-anụ olu m Dinwenụ na-ekwu, amarakwa m ha, ha na-esokwa m.
Alleluịa.
OZIỌMA – 15:1-10.
Ihe ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Luk dere.
Mgbe ahụ, ọtụtụ ndị ọnaụtụ na ndị omenjọ bịakwutere Jesu ịnụrụ okwu ya. Ndị Farisii na ndị odeakwụkwọ tamuru na-asị, “Nwoke a na-anabata ndị omenjọ sorokwa ha na-eri ihe.”
Jesu wee jiri ụkabụilu a gwa ha okwu sị, “Olee onye n’ime ụnụ nwere otu narị atụrụ, otu n’ime ha efuo, ọ ghara ịhụpụ iri itoolu na itoolu ndịọzọ gaa ịchọ otu ahụ furu efu ruo mgbe ọ ga-achọta ya?
Ma mgbe ọ chọtara ya, ọ na-atụkwasa ya n’ubu ya na-añụrị. Mgbe ọ lọtara ụlọ, ọ na-akpọkọ ndị enyi ya na ndị agbataobi ya sị ha, ‘Soronụ m ñụrịa n’ihina achọtala m atụrụ m furu efu.’
N’otu aka ahụ agwa m ụnụ, oke ọñụ ga-adị n’eluigwe n’isi otu onye njọ chegharịrịnụ karịa n’isi mmadụ iri itoolu na itoolu ndị nchegharị na-adịghị mkpa.
Olee otu nwaanyị ga-enwe kọbọ iri, otu efulahụ ya, na-agaghị amụnye ọkụ mpanaka, zachasịa ụlọ ya nke ọma na-achọ ya wee ruo mgbe ọ chọtara ya.
Mgbe ọ chọtara ya, ọ ga-akpọkọta ndị enyi ya na ndị agbataobi ya sị ha, ‘soronụ m ñụrịa ọñụ n’ihina achọtala m otu kọbọ m ahụ furu efu.’
N’otu aka ahụ, ana m agwa ụnụ, ndị Mmụọọma nke Chineke na-añụrị ọñụ n’isi otu onye njọ nke chegharịrịnụ.”
Igbo Mass Readings for November 6 2026, Fraịde Izuụka nke Iri Atọ na Otu N’Oge Adanyeghị n’Emume.
Igbo Mass Readings for November 5 2026, Tọọzde Izuụka nke Iri Atọ na Otu N’Oge Adanyeghị n’Emume.