Igbo Mass Readings for October 29 2026, Tọọzde Izuụka nke Iri Atọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.
Nke a bụ Igbo Mass Readings for October 29 2026, Tọọzde Izuụka nke Iri Atọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 6:10-20
Ihe ọgụgụ e wetara n’akwụkwọ Pọl dị Asọ degaara Efesọs.
N’ịkpeazụ, kwụsienụ ike n’ime Onyenweanyị nakwa n’ike nke ịdị ukwu ya. Yikwasịnụ ngwaagha nke Chineke niile ka ụnụ wee nwee ike imegide aghụghọ niile nke ekwensu.
N’ihina ọ bụghị mmadụ nkịtị ka anyị na ya na-agba mgba, kama anyị na-alụ ọgụ megide ọchịchịrị a, megidekwa ajọ mmụọ dị icheiche ndị na-achị ihu eluigwe.
Werenụ ihe ize ndụ niile nke Chineke, ka ụnụ wee nwee ike ịkwụdosiike mgbe ụbọchị ọjọọ bịara; ka ụnụ wee kwụrụ mgbe ụnụ mezuru ihe niile.
Ya bụ, kwụrụnụ chịm, jirinụ eziokwu kee n’ukwu ụnụ, yikwanụ eziokwu dịka uwe agha mgbochi obi.
Yirinụ ngwa nke oziọma nke udo dịka akpụkpọ ụkwụ. Ma nke kachanụ, jidenụ ọta nke okwukwe nke ụnụ ga-eji emenya akụ (ụta) niile, bụ ọkụ nke onyeiro ga-agba.
Werekwanụ okpu agha nke nzọpụta, ya na mma agha nke mmụọ, nke bụ okwu nke Chineke. Na-ekpenụ ekpere n’ime mmụọ, nọrọnụ n’ekpere na arịrịọ mgbe niile.
Iji mezuo nke a, mụrụnụ anya, kwụdosikwanụ ike na-arịọrọnụ ndị nsọ niile arịrịọ. Na-echetakwanụ m n’ekpere ka e nye m ike nke okwu, m ga-eji na-ekwupụta ihe omimi nke oziọma n’atụghị egwu ọbụla;
nke m ji maka ya bụrụ onye nnọchite anya nọ na mkpọrọ. Ka m kwupụta ya n’atụghị egwu ọbụla dịka m kwesịrị ikwu.
ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 144:1, 2, 9-10.
Azịza: Ngọzi dịrị Osebụrụwa nkume m.
1. Ngọzi dịrị Osebụrụwa nkume m
onye na-azụ aka m maka ịlụ ọgụ
mkpịsị aka m maka ibu agha.
Azịza: Ngọzi dịrị Osebụrụwa nkume m.
2. Ọ bụ ya bụ ịhụnaanya m na onye nkwado m
ụlọ mgbaba m na onye nzọpụta m
ọ bụ na ya ka m na-ezo onwe m
ekpeke m, ọ na-eme ka mba niile rubere m isi.
Azịza: Ngọzi dịrị Osebụrụwa nkume m.
3. Onyenweanyị aga m ekwere gị ukwe ọhụrụ
aga m eji ụbọ akwara kweere gị ukwe
Ọ bụ gị na-enye ndịeze mmeri,
nakwa azọpụta Devid nwodibo gị.
Azịza: Ngọzi dịrị Osebụrụwa nkume m.
MBEKU – 2 Tim 1:10
Alleluịa, Alleluịa
Onye nzọpụta anyị Jesu Kristi emebiela ọnwụ, wetara anyị ndụ site n’oziọma ya.
Alleluịa.
OZIỌMA – 13:31-35
Ihe ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Luk dere.
N’otu oge ahụ ụfọdụ ndị Farisii bịakwutere Jesu sị ya, “Si n’ebe a pụọ n’ihina Herod na-achọ igbu gị.”
Ọ gwara ha, “Gaanụ gwa nkịta ọhịa ahụ, lee ana m achụpụ ndị mmụọ ọjọọ, na-agwọkwa nrịanrịa dị icheiche taa na echi, ma ụbọchị nke atọ aga m arụzu ọrụ m.
Otu o si na-adi, aghaghị m ịga ebe m na-aga taa na echi na ụbọchị na-esota ya, n’ihina o kwesịghị ka e gbuo onye amụma ebe ọzọ na-abụghị na Jerusalem.”
O Jerusalem, Jerusalem ndị na-egbu ndị amụma, na-ejikwa okwute atụgbusi ndị Chineke ziteere ya! Ugboro ole ka m chọrọ ịchịkọta ụmụ gị dịka nnekwu ọkụkọ si achịkọta ụmụ ya n’okpuru nku ya abụọ ma ụnụ ekwegị!
Lee a na-ahapụ ụlọ ụnụ! ma agwa m ụnụ, ụnụ agaghị ahụ m anya ọzọ ruo mgbe ụnụ ga-asị, “Ngọzi na-adịrị onye bịara n’aha Dinwenụ.”
Igbo Mass Readings for October 30 2026, Fraịde Izuụka nke Iri Atọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.
Igbo Mass Readings for October 29 2026, Tọọzde Izuụka nke Iri Atọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.