Igbo Mass Readings for July 31 2025, Tọọzde n’ime Izuụka nke Iri na Asaa N’Oge Adanyeghị n’Emume.
Nke a bụ Igbo Mass Readings for July 31 2025, Tọọzde n’ime Izuụka nke Iri na Asaa N’Oge Adanyeghị n’Emume.
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 40:16-21, 34-38
Ihe Ọgụgụ e wetara n’akwụkwọ Ọpụpụ
Mosis wee mee otu a, dịka Yahweh maara ya n’iwu. Mosis kwụwara ụlọikwu nsọ ahụ n’ụbọchị mbụ nke ọnwa mbụ nke afọ nke abụọ.
Ọ dọwachara ukwu ya, tinye osisi ọnụụzọ ya, wụnyechaa mkpara ya, kwụwachakwaa osisi nguzo ya. Ọ gbasara akwa mkpuchi nke ụlọnzukọ ahụ n’elu ụlọikwu nsọ dịka Yahweh nyere ya n’iwu.
O tinyere okwute ọgbụgbandụ ahụ n’ime igbe ya, wụnye mkpara ya bịa dọnyekwa oche ebere n’elu ya. O bubatara igbe ahụ n’ime ụlọikwu nsọ, were akwa ngechi kobe ya okirikiri dịka Yahweh si nye ya n’iwu.
Urukpuigwe bịara kpuchie ụlọnzukọ ahụ, ebube nke Yahweh ewee jupụta n’ụlọikwu nsọ ahụ. Nke a mere na Mosis enweghịkwa ike ịba n’ụlọnzukọ ahụ.
Na njem ha niile, mgbe ọbụla urukpu ahụ si n’ụlọikwu nsọ gbagoo elu, ụmụ Izrel na-amalitekwa njem, ma ọ bụrụ na urukpu ahụ agbagoghị elu, ha na-anọrọ ebe ha nọ ruo mgbe ọ gbagoro.
N’ogologo njem ha niile urukpu nke Yahweh ahụ na-anọgide n’elu ụlọikwu nsọ ahụ n’oge ehihie ma ọkụ na-anọ na ya n’abalị. Ụmụ Izrel niile na-ahụ ya.
ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 84:2, 3, 5, 7, 10
Azịza: Lee ka ụlọ obibi gị siri makarịchaa mma, Gị Osebụrụwa pụrụ ime ihe niile.
1. Ọ na-agụ m nnukwu agụụ, ka m bata n’ogige Osebụrụwa,
ka mkpụrụobi m na anụahụ m
na-ekwere Chineke dị ndụ ukwe ọñụ.
Azịza: Lee ka ụlọ obibi gị siri makarịchaa mma, Gị Osebụrụwa pụrụ ime ihe niile.
2. Ka o si dị, nnụnụ ebelebe na-achọtara onwe ya ụlọ obibi,
nnụnụ eleke na-achọtara onwe ya akwụ,
ebe ọ ga-edote ụmụ ya n’akụkụ ebe ịchụaja gị,
Onyenweanyị onye pụrụ ime ihe niile.
Azịza: Lee ka ụlọ obibi gị siri makarịchaa mma, Gị Osebụrụwa pụrụ ime ihe niile.
3. Ha bụ ndị a gọziri agọzi, ndị bi n’ụlọ gị
Na-ekwere gị ukwe otito oge niile.
Ndị ike ha si na gị bụ ndị agọziri agọzị,
Ka ha na-aga, ike ha na-abawanye.
Azịza: Lee ka ụlọ obibi gị siri makarịchaa mma, Gị Osebụrụwa pụrụ ime ihe niile.
4. N’ihina otu ụbọchị n’ebe gị ka mma
karịa nnụkwụrụ nnụ n’ebe ọzọ,
Ọ kaara m mma ịbụ onye nche ụzọ n’ụlọ nke Onyenweanyị,
karịa ibi n’ebe obibi ndị ajọ mmadụ.
Azịza: Lee ka ụlọ obibi gị siri makarịchaa mma, Gị Osebụrụwa pụrụ ime ihe niile.
MBEKU – Col 3:16,17
Alleluia, Alleluia:
Na-enyekwanụ Chukwu Nna ekele site na Dinwenụ anyị Jesu Kristi. Kweenụ ka udo nke Kristi na-enye na-achị n’obi ụnụ.
Alleluia.
OZIỌMA – 13:47-53
Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Matiu dere
Jesu gwara oke igwe mmadụ ahụ sị, Ọzọkwa, alaeze eluigwe dịka ụgbụ, a wụnyere n’osimiri nke dọkọtara ụdị azụ dị icheiche.
Mgbe ụgbụ ahụ jupụtara n’azụ, ndị ọkụ azụ dọpụtara ya, nọdụ ala wee họpụta ndị dị mma, tinye ha n’ihe ma wụfuo ndi jọrọ njọ. Otu a ka ọ ga-adị n’oge ngwụcha nke ụwa.
Ndị mmụọọma ga-apụta kewapụta ndị bụ ajọ mmadụ n’etiti ndị eziomume. Ha ga-enubakwa ndị ajọ mmadụ n’ọkụ ahụ, ebe ibe akwa na ịta ikikere eze ga-adị.
Jesu jụrụ ha sị, “Ụnụ ghọtakwara okwu ndị a niile?” Ha zara ya sị, “Ee” O wee sị ha, “Onye odeakwụkwọ ọbụla nke e nyere ọzụzụ maka alaeze eluigwe, dịka onye nwe ụlọ, nke na-esi n’ụlọakụ ya ewepụta ihe ochie na ihe ọhụrụ”. Mgbe Jesu gwachara ha ụkabụilu ndị a, o siri ebe ahụ pụọ.
Igbo Mass Readings for August 1 2025, Fraịde n’ime Izuụka nke Iri na Asaa N’Oge Adanyeghị n’Emume.
Igbo Mass Readings for July 31 2025, Tọọzde n’ime Izuụka nke Iri na Asaa N’Oge Adanyeghị n’Emume.