Igbo Mass Readings for July 30 2026, Tọọzde Izuụka nke Iri na Asaa N’Oge Adanyeghị n’Emume.
Nke a bụ Igbo Mass Readings for July 30 2026, Tọọzde Izuụka nke Iri na Asaa N’Oge Adanyeghị n’Emume.
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 18:1-6
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Onye Amụma Jeremaya
Nke a bụ okwu siri n’aka Yahweh bịakwute Jeremaya, “Bilie ka ị gakwuru onye nke ahụ na-akpụ ite, n’ebe ahụ aga m eme ka ị nụrụ okwu m.”
M wee gaa n’ụlọ onye ahụ na-akpụ ite, ebe ọ nọ arụ ọrụ ya. Ma ihe nke ọ na-akpụ mebiri n’aka ya, ma ọ kpụgharịrị ya n’ụdị ihe ọzọ dịka o si masị ya.
Okwu nke Yahweh bịakwutere m: “Ụlọ nke Izrel, ọ bụ na e nweghị m ike ime gị dịka onye a na-akpụ ite siri mee?” Yahweh na-ekwu. N’ezie dịka ụrọ dị n’aka onye na-akpụ ite, otu ahụ ka ị dị n’aka m O ụlọ Izrel.
ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 146: 1-2, 2-4, 5-6.
Azịza: Añụrị bụ nke onye nwere Chineke nke Jekọb dịka onye enyemaka ya.
1. Mkpụrụ obi m too Chineke;
Aga m eto Osebụrụwa n’ụbọchị ndụ m niile,
aga m ekwegara Chineke m ukwe oge niile m dị ndụ.
Azịza: Añụrị bụ nke onye nwere Chineke nke Jekọb dịka onye enyemaka ya.
2. Atụkwasala obi gị na ndị ọchịchị,
ma ọ bụkwa na mmadụ nkịtị, onye na-enweghị ike ịzọpụta gị
Mgbe o kubiri ume ka ọ na-alaghachi n’aja,
atụmaatụ ya niile ga-ala n’iyi n’ụbọchị ahụ.
Azịza: Añụrị bụ nke onye nwere Chineke nke Jekọb dịka onye enyemaka ya.
3. Añụrị bụ nke onye nwere Chineke nke Jekọb
dịka onye enyemaka ya;
onye tụkwasịrịobi ya n’Onyenweanyị bụ Chineke ya.
Onye kere eluigwe na ala,
nakwa oke osimiri na ihe niile bi n’ime ya.
Azịza: Añụrị bụ nke onye nwere Chineke nke Jekọb dịka onye enyemaka ya.
MBEKU – Col 3:16,17
Alleluia, Alleluia:
Na-enyekwanụ Chukwu Nna ekele site na Dinwenụ anyị Jesu Kristi. Kweenụ ka udo nke Kristi na-enye na-achị n’obi ụnụ.
Alleluia.
OZIỌMA – 13:47-53
Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Matiu dere
Jesu gwara oke igwe mmadụ ahụ sị, Ọzọkwa, alaeze eluigwe dịka ụgbụ, a wụnyere n’osimiri nke dọkọtara ụdị azụ dị icheiche.
Mgbe ụgbụ ahụ jupụtara n’azụ, ndị ọkụ azụ dọpụtara ya, nọdụ ala wee họpụta ndị dị mma, tinye ha n’ihe ma wụfuo ndi jọrọ njọ. Otu a ka ọ ga-adị n’oge ngwụcha nke ụwa.
Ndị mmụọọma ga-apụta kewapụta ndị bụ ajọ mmadụ n’etiti ndị eziomume. Ha ga-enubakwa ndị ajọ mmadụ n’ọkụ ahụ, ebe ibe akwa na ịta ikikere eze ga-adị.
Jesu jụrụ ha sị, “Ụnụ ghọtakwara okwu ndị a niile?” Ha zara ya sị, “Ee” O wee sị ha, “Onye odeakwụkwọ ọbụla nke e nyere ọzụzụ maka alaeze eluigwe, dịka onye nwe ụlọ, nke na-esi n’ụlọakụ ya ewepụta ihe ochie na ihe ọhụrụ”. Mgbe Jesu gwachara ha ụkabụilu ndị a, o siri ebe ahụ pụọ.
Igbo Mass Readings for July 31 2026, Fraịde n’ime Izuụka nke Iri na Asaa N’Oge Adanyeghị n’Emume
Igbo Mass Readings for July 30 2026, Tọọzde Izuụka nke Iri na Asaa N’Oge Adanyeghị n’Emume.