Igbo Mass Readings for July 2 2026, Tọọzde Izuụka nke Iri na Atọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.

Nke a bụ Igbo Mass Readings for July 2 2026, Tọọzde Izuụka nke Iri na Atọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 7:10-17

Ihe Ọgụgụ ewetara n’Akwụkwọ Onye Amụma Amọs

Mgbe ahụ Amazaya onye ụkọchukwu nke Betel wee zigara Jeroboam eze ndị Izrel ozi sị, “Amọs agbaala gị mgba okpuru ka o megide gị n’etiti ụlọ Izrel, nke na ala apụghị ibu okwu ya niile.

Nke a bụ ihe Amọs kwuru, ‘Jeroboam ga-anwụ ọnwụ site na mmaagha, ebe Izrel ga-agbapụ ọsọ ndụ ma biri na mba ọzọ dịka ohu.” Ma Amazaya zara Amọs sị, “Biko gị onye na-ahụ ọhụ, gaba, gbaa ọsọ gbagaa n’ala Juda, rie achịcha ma bukwaa amụma gị ebe ahụ.

Abịakwala ebu amụma gị ọzọ n’ala Betel n’ihina ọ bụ ebe nsọ nke eze, nakwa ụlọnsọ ala eze ahụ.” Ma Amọs zaghachiri Amazaya sị ya, “Abụghị m onye amụma, nke m na-abụ nwa onye amụma, kama, abụ m onye ọchịatụrụ nakwa onye na-ebechasị osisi sikamọ.

Ma Yahweh kpọpụtara m n’ebe m na achị atụrụ, gwa m sị, ‘Gaa buoro ndị nke m Izrel amụma.’ Ya bụ gee ntị ugbu a ka ị nụrụ okwu nke Yahweh! Ị sị m, ebula amụma megide ụlọ Izrel nke ị na-ekwu megide ụlọ Aịzik!

Ya bụ, nke a ka Yahweh na ekwu: Nwunye gị ga-abụ akwụna n’obodo a, ebe ụmụ gị ndị nwoke na ndị nwaanyị ga-anwụ site na mmaagha a ga-esinyekwa ndịọzọ n’ala gị, gị onwe gị ga-anwụ n’ala rụrụ arụ, ma a ga-adọkpụrịrị Izrel dịka ohu gaa n’ala mba ọzọ.”

ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 19:8, 9, 10, 11

Azịza: Ikpe nke Onyenweanyị bụ eziokwu; ha niile kwụkwa ọtọ

1. Iwu nke Onyenweanyị zuru oke,

Ọ na-enye mkpụrụobi ndụ ọhụrụ;

Atụmaatụ Onyenweanyị kwesịrị ntụkwasịobi,

Ọ na-enye ndị dị umeala amamihe.

Azịza: Ikpe nke Onyenweanyị bụ eziokwu; ha niile kwụkwa ọtọ

2. Iwu nke Onyenweanyị kwụ ọtọ

Ọ na-enye obi añụrị;

Iwu nke Onyenweanyị pụtara ihe

ọ bụ ihe e ji ahụ ụzọ.

Azịza: Ikpe nke Onyenweanyị bụ eziokwu; ha niile kwụkwa ọtọ

3. Ịtụ egwu Onyenweanyị bụ ihe dị mma:

ọ na-adị ebeebe;

Ikpe nke Onyenweanyị bụ eziokwu;

Ha niile kwụkwa ọtọ.

Azịza: Ikpe nke Onyenweanyị bụ eziokwu; ha niile kwụkwa ọtọ

4. Ọ dị mkpa karịa ọlaedo:

ọ bụladị ọlaedo kacha mma;

Okwu ya dị ụtọ karịa mmanụ añụ,

Ọ bụladị mmanụ añụ a zara aza.

Azịza: Ikpe nke Onyenweanyị bụ eziokwu; ha niile kwụkwa ọtọ

MBEKU – Col 3:16, 17

Alleluia, Alleluịa:

Na-enyenụ Chukwu Nna ekele site na Dinwenụ anyị Jesu Kristi. Ka okwu nke Kristi biri n’ime ụnụ n’uju ya.

Alleluia.

OZIỌMA – 9:1-8

Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Matiu dere.

Jesu banyere n’ụgbọ, gafee n’ofe osimiri, bịaruo n’obodo ya. Mgbe ahụ, ha butere ya otu nwoke akụkụ ahụ ya nwụrụ anwụ nke dina n’elu akwa, mgbe Jesu hụrụ okwukwe ha, ọ gwara onye ọrịa ahụ sị: “Nwa m, obi sie gị ike, a gbagharala gị njọ gị niile!”

Ụfọdụ ndị odeakwụkwọ na-ekwukọrịta n’etiti onwe ha sị, “Nwoke a ekwuola arụ”. Ma Jesu maara ihe ha na-eche n’obi ha wee sị ha, “Gịnị mere ụnụ ji eche ihe ọjọọ n’obi ụnụ?

Olee nke ka mfe, ikwu, ‘a gbagharala gị njọ gị niile’ ka ọ bụ ị sị: ‘bilie ma gabakwa ije? lji mee ka ụnụ mara na Nwa nke mmadụ nwere ike ịgbaghara njọ n’elu ụwa, ọ gwara nwoke ahụ akụkụ ahọ ya nwụrụ anwụ sị, ‘Bilie, buru akwa gị laba.

O biliri laba n’ụlọ ya. Mgbe igwe mmadụ niile nọ ebe ahụ hụrụ nke a, egwu tụrụ ha. Ha nyere Chineke otito, onye nyere mmadụ ike dị otu a.

Igbo Mass Readings for July 3 2026, Emume Ncheta Tọmọs dị Asọ

Igbo Mass Readings for July 2 2026, Tọọzde Izuụka nke Iri na Atọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.