Igbo Mass Readings for June 12 2025, Tọọzde n’ime Izuụka nke Iri N’Oge Adanyeghị n’Emume.

Nke a bụ Igbo Mass Readings for June 12 2025, Tọọzde n’ime Izuụka nke Iri N’Oge Adanyeghị n’Emume.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 3:15-4:1, 3-6

Ihe Ọgụgụ e wetara n’akwụkwọozi nke abụọ Pọl Degaara ndị Kọrịnt

Nke a mere, ruo n’ụbọchị taa, mgbe ọbụla ụmụ Izrel na-agụ iwu Mosis, akwa mkpuchi ahụ na-ekpuchi uche ha, ma mgbe ọbụla mmadụ tụgharịrị n’ebe Dinwenụ nọ a na-ewepụ akwa mkpuchi ahụ.

Ugbu a Dinwenụ bụ Mmụọ Nsọ. Ebe Mmụọ nke Dinwenụ ahụ nọ, ebe ahụ ka inwere onwe onye dị. Anyị niile bụ ndị e wepụrụla akwa mkpuchi n’ihu, na-egosi ebube nke Dinwenụ, a na-agbanwe anyị ịbanye n’oyiyi ya site n’ebube ruo n’ebube; nke si n’aka Dinwenụ onye bụ Mmụọ ahụ.

Ya bụ ebe anyị natara ịgba odibo nke a n’aka Chineke, ike adịghị agwụ anyị. Ma a sị na e kpudoro oziọma ahụ anyị na-ekwusa ihe, ọ bụ naanị n’ebe ndị na-ala n’iyi nọ.

N’ebe ha nọ arụsị nke ụwa a ekpuchiela uche ndị ekweghịnụ, iji gbochie ha ịhụ ihe nke oziọma nke Chineke. Ihe anyị na-ekwusa abụghị onwe anyị, kama anyị na-ekwusa na Jesu Kristi bụ Dinwenụ anyị, na anyị onwe anyị bụ ụmụodibo ụnụ n’ihi Jesu.

N’ihina ọ bụ Chincke ahụ onye kwuru sị, “Ka ihe si n’ọchịchịrị chawapụta, bụkwa onye mere ka ihe ya nwuwe n’ime obi anyị. Nke o mere iji wetara anyị ihe amamihe nke ebube Chineke n’ihu Kristi.

ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 85: 8-9, 10-11, 12-13

Azịza: Ebube nke Onyenweanyị ga-anọgide n’ala anyị.

1. Ana m ege ntị n’ihe Chineke, Onyenweanyị na-ekwu,

ihe ọ na-ekwu bụ udo maka ndị nke ya.

N’ezie, nzọpụta ya dị nsọ maka ndị na-atụrụ ya egwu,

ka ebube ya wee nọgide n’ala anyị.

Azịza: Ebube nke Onyenweanyị ga-anọgide n’ala anyị.

2. Ịhụnaanya na okwukwe amakụọla,

eziomume na udo ebiela ọma.

Irubeisi ga-esi n’ala pulite,

eziomume ga-esi n’elu ledata anya.

Azịza: Ebube nke Onyenweanyị ga-anọgide n’ala anyị.

3. Ee, Onyenweanyị ga-enye anyị ọganiihu,

ala anyị ga-amịta mkpụrụ bawanye.

Eziomume ga-aga n’ihu ya,

udo ga na-eso nzọ ụkwụ ya.

Azịza: Ebube nke Onyenweanyị ga-anọgide n’ala anyị.

MBEKU – Jọn 14:23

Alleluia, Alleluia:

Ọ bụrụ na mmadụ ahụ m n’anya, ọ ga-edobe okwu m. Nna ga-ahụkwa ya n’anya. Anyị ga-abịakwute ya, biri n’ime ya.

Alleluia.

OZIỌMA – 5:20-26

Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Matiu dere

Jesu gwara ndị na-eso ụzọ ya sị, “N’ihi nke a, agwa m ụnụ, belụsọ ma eziomume ụnụ ọ kariri nke ndị odeakwụkwọ na nke ndị Farisii, ụnụ agaghị abata n’alaeze eluigwe.

Ụnụ anụla na a gwara ndị mgbe ochie sị, ụnụ egbula ọchụ. Onye ọbụla gburu ọchụ a ga-ekpe ya ikpe. Ma mụ onwe m na-agwa ụnụ sị, Onye ọbụla nke na-eburu nwanne ya iwe n’obi, a ga-ama ya ikpe.

Onye ọbụla kparịrị nwanne ya ga-aza azịza n’ụlọ ikpe. Onye ọbụla kpọrọ nwanne ya ‘Onye nzuzu’ ga-aba n’ọkụmmụọ. Ya bụ ọbụrụ na ị na-eweta onyinye gị n’ekwu nchụaja, ma cheta n’ebe ahụ na gị na nwanne gị adịghị na mma, hapụ onyinye gị n’ihu ekwuaja.

Buru ụzọ gaa ka gị na nwanne gị mezie. Mgbe ụnụ mezichara, bịa, ka i nye onyinye gị. Mee ka gị na onye gbaara gị akwụkwọ kpezie ọsịsọ tupu ụnụ agaruo n’ụlọ ikpe, ka ọ ghara inyefe gị n’aka onye ọkaikpe, onye ọkaikpe e duru gị nye n’aka ndị nche, ndị nche ewee tinye gị n’ụlọ mkpọrọ.

N’eziokwu agwa m gị, ị gaghị esi ebe ahụ pụta ruo mgbe ị kwụchara ụgwọ gị niile.

Igbo Mass Readings for June 13 2025, Fraịde n’ime Izuụka nke Iri N’Oge Adanyeghị n’Emume.

Igbo Mass Readings for June 12 2025, Tọọzde n’ime Izuụka nke Iri N’Oge Adanyeghị n’Emume.