Igbo Mass Readings for April 10 2025, Tọọzde Izuụka nke Ise n’Oge Ncheta Ahụhụ Kristi
Nke a bụ Igbo Mass Readings maka April 10 2025, Tọọzde Izuụka nke Ise n’Oge Ncheta Ahụhụ Kristi.
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 17:3-9
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Mbido (Jenesis)
Mgbe Abram kpọrọ isi ala nye Chineke, Chineke wee gwa ya okwu ndị a sị, “Lee nke a bụ ọgbụgbandụ mụ na gị: ị ga-abụ nna nke ọtụtụ mba. A gaghị akpọkwa gị Abram ọzọ; aha gị ga- abụ Abraham n’ihi na ana m eme gị ka ị bụrụ nna nke ọtụtụ mba.
Aga m eme gị ka ị mụọ ụmụ nke ukwu. Aga m esi na gị nweta mba dị iche-iche, ụmụ gị ga-abụ ndịeze. Aga m eme ka ọgbụgbandụ mụ na gị rute ụmụụmụ gị ndị ga-esochi gị site na ndụdụgandụ ruo na ndụdụgandụ, dịka ọgbụgbandụ dị ebeebe, ịbụ Chineke gị na Chineke nke ụmụụmụ gị ndị ga-esochi.
Aga m enye gị na ụmụụmụ gị ala ebe a I bi ugbu a, ala Kenaan ahụ niile, ka ụnụ ga-enwere ebeebe; aga m abụkwa Chineke ụnụ “Chineke gwakwara Abraham sị, “N’akụkụ nke gị, ị ga-edoberịrị ọgbụgbandụ m, gị na ụmụụmụ gị ndị ga-esochi gị site na ndụdụgandụ ruo na ndụdụgandụ.
ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 105:4-5, 6-7, 8-9.
Azịza: Onyenweanyị na-echeta ọgbụgbandụ ya ebeebe.
1. Chọbanụ Onyenweanyị na ike ya,
chọbanụ ihu nke Onyenweanyị mgbe niile,
Chetanụ ọrụ ebube niile ọ rụrụ,
ọrụ ịtụnanya ya niile, na ike niile si n’ọnụ ya pụta.
Azịza: Onyenweanyị na-echeta ọgbụgbandụ ya ebeebe.
2. Ụnụ ụmụ Abraham bụ nwodibo ya,
ụmụ Jekọb bụ onye nke ọ họọrọ!
Ọ bụ ya bụ Onyenweanyị na Chineke anyị.
Ike ọchịchị ya gazuru ụwa niile.
Azịza: Onyenweanyị na-echeta ọgbụgbandụ ya ebeebe.
3. Ọ na-akpachapụrụ ọgbụgbandụ ya anya ebebe,
Iwu nke o tiri puku agbụrụ gara aga,
Ọgbụgbandụ ya na Abraham gbara,
na iyi nke ọñụụrụ Aịzik.
Azịza: Onyenweanyị na-echeta ọgbụgbandụ ya ebeebe.
MBEKU – Amọs 5:14.
R/ Otito na ebube dịrị Gị, O Dinwenụ, Jesu Kristi.
Chọba ezi ihe kama ajọ ihe, ka ụnụ wee dị ndụ, ka Yahweh nke igwe ndị agha wee nọnyere ụnụ.
R/ Otito na ebube dịrị Gị, O Dinwenụ, Jesu Kristi.
OZIỌMA – 8:51-59.
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Oziọma dị asọ nke Jọn dere.
Jesu gwara ndị Juu sị: N’ịgwa ụnụ eziokwu, onye ọbụla na-edebe okwu m agaghị anwụ ma ọlị.” Ndị Juu gwara ya sị, “Ugbu a, o weela anyị anya na mmụọ ọjọọ bi n’ime gị.
Abraham na ndị amụma mechara nwụọ, ma ugbu a ị na-ekwu sị, ‘Ọ bụrụ na onye ọbụla edebe okwu m, ọ gaghị edetu ọnwụ ire ma ọlị. Ị karịrị nna anyị Abraham, onye nwụrụ anwụ?
Ndị amụma nwụkwara anwụ Onyedị ka ị na-eche na ị bụ?” Jesu agwa ha sị, “Ọ bụrụ na m enye onwe m otito, otito nke m bụ ihe efu, onye na-enye m otito bụ Nna m, onye ụnụ na-asị na ọ bụ Chineke ụnụ.
Ụnụ amatabeghị ya; ama m ya. Ọ bụrụ na m sị na amaghị m ya, aga m abụ onye asị dịka ụnụ, kama, ama m ya, na-edebekwa okwu ya. Abraham nna ụnụ ñụrịrị ịhụ ụbọchị m, Ọ hụrụ ya wee ñụrịa.”
Ndị Juu wee sị ya, “I rubeghị iri afọ ise wee hụla Abraham?” N’ezie, n’ezie, agwa m ụnụ, “Tupu Abraham adị, anọ m.” Ha weere okwute ka ha tụọ ya, ma Jesu zoro onwe ya wee pụọ n’ụlọnsọ.
Igbo Mass Readings for April 11 2025, Fraịde Izuụka nke Ise n’Oge Ncheta Ahụhụ Kristi
Igbo Mass Readings for April 10 2025, Tọọzde Izuụka nke Ise n’Oge Ncheta Ahụhụ Kristi.