Igbo Mass Readings for February 13 2025, Tọọzde n’ime Izuụka nke Ise N’Oge Adanyeghị n’Emume.

Nke a bụ Igbo Mass Readings for February 13 2025, Tọọzde n’ime Izuụka nke Ise N’Oge Adanyeghị n’Emume.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 2:18-25

Ihe Ọgụgụ e wetara n’akwụkwọ Jenesis

Yahweh Chineke sị, “Ọ dịghị mma ka mmadụ ahụ nọrọ naanị ya; aga m enye ya onye enyemaka”. Yahweh Chineke si n’ụrọ ala ahụ kpụpụta anụ niile bi n’ọhịa nakwa ụmụnnụnụ niile na-efe n’elu; ihe ndị a niile ka ọ kpọtaara nwoke ahụ ka ọ mara aha ọ ga-agụ ha; nke ọbụla n’ime ha ga-aza aha nwoke ahụ gụrụ ya.

Nwoke ahụ nyere anụụlọ niile, ụmụnnụnụ igwe niile na anụọhịa niile ndị ahụ aha; ma o nweghị onye enyemaka tosịrị etosị a chọtaara nwoke ahụ. Ya mere, Yahweh Chineke ji mee ka nwoke ahụ rahụ oke ụra.

N’oge ọ nọ n’ụra ahụ, Yahweh amịrị otu mkpịsị akụkụ ya bịa were anụ ahụ kpuchie oghere ebe ahụ o si weta ya. Yahweh Chineke ji mkpịsị akụkụ nwoke ahụ ọ mịpụtara kpụta otu nwaanyị nke ọ kpọtaara nwoke ahu.

Oge ahụ nwoke ahụ ekwuo sị, “N’ikpeazụ, nke a bụ ọkpụkpụ si n’ọkpụkpụ m nakwa ahụ si n’ahụ m; a ga-akpọ ya nwaanyị n’ihina e siri na nwoke mepụta ya”.

Nke a mere nwoke ga-eji hapụ nna ya na nne ya bịa rapara n’ahụ nwunye ya ha abụọ abụrụ otu ahụ. Nwoke ahụ na nwunye ya gba ọtọ, ma ha enweghị ihere ọbụla n’etiti onwe ha.

ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 128:1-2, 3, 4-5.

Azịza: Ngọzi na-adịrị ndị na-atụrụ Chineke egwu.

1. Ngọzi na-adịrị ndị na-atụrụ Chineke egwu,

na-eso ụzọ ya.

Ihe aka gị kụtara ka ị ga-eri,

añụrị na ọganịihu ga-abụ nke gị.

Azịza: Ngọzi na-adịrị ndị na-atụrụ Chineke egwu.

2. Nwunye gị ga-adị ka osisi vaịn,

na-amị mkpụrụ n’ime ụlọ gị,

ụmụ gị ga-adị ka osisi oliv,

gbaa oche nri gị gburugburu.

Azịza: Ngọzi na-adịrị ndị na-atụrụ Chineke egwu.

3. Lee, otu ahụ ka a ga-esi gọzie onye ahụ,

nke na-atụrụ Chineke egwu.

Ka Onyenweanyị si na Zayọn gọzie gị,

ka ị hụkwa ọganiihu nke Jerusalem,

ụbọchị ndụ gị niile.

Azịza: Ngọzi na-adịrị ndị na-atụrụ Chineke egwu.

MBEKU

Alleluia, Alleluia:

Okwu ndị m gwara ụnụ bụ mmụọ bụrụkwa ndụ, Ọ bụ gịnwa ji okwu nke ndụ ebeebe.

Alleluia.

OZIỌMA – 7:24-30

Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Mak dere

Jesu hapụrụ ebe ahụ gaa obodo Taya na Sidọn. Ọ banyere n’ime ụlọ na-achọghị ka onye ọbụla mara. Ma o zotalighị onwe ya.

Ngwangwa otu nwaanyị onye mmụọ ọjọọ ji nwa ya nwaanyị nke nta nụrụ maka ya, wee bịa, daa n’ala n’ụkwụ Jesu. Nwaanyị a bụ onye Grik, ma a mụrụ ya na Sairo-Fonishịa. Ọ rịọrọ Jesu ka ọ chụpụ mmụọ ọjọọ n’ahụ nwa ya nwaanyị.

Jesu gwara ha sị, “Ka e bu ụzọ nyejuo ụmụaka afọ n’ihina o zighị ezi iwere nri ụmụaka tụpụrụ nkịta”. Nwaanyị ahụ zara sị, “Nke a bụ eziokwu Onyenwe m ma ụmụnkịta na-erikwa iberibe nri si n’okpokoro nri ụmụntakịrị dapụ n’ala”.

Jesu zara ya, “N’ihi osisa nke a; laba; mmụọ ọjọọ ahụ ahapụla nwa gị nwaanyị”. O wee laruo ụlọ hụ nwa ya nwaanyị ka o dina n’akwa, mmụọ ọjọọ ahụ ahapụkwala ya.

Igbo Mass Readings for February 14 2025, Fraịde n’ime Izuụka nke Ise N’Oge Adanyeghị n’Emume.

Igbo Mass Readings for February 13 2025, Tọọzde n’ime Izuụka nke Ise N’Oge Adanyeghị n’Emume.