Igbo Mass Readings for June 4 2026, Tọọzde Izuụka nke Itoolu N’Oge Adanyeghị n’Emume.

Nke a bụ Igbo Mass Readings for June 4 2026, Tọọzde Izuụka nke Itoolu N’Oge Adanyeghị n’Emume.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 2:8-15

Ihe Ọgụgụ ewetara n’Akwụkwọozi nke Abụọ Pọl degaara Timoti

Cheta Jesu Kristi onye si n’agbụrụ Devid pụta onye sikwa n’ọnwụ bilie dịka oziọma ahụ m na-ekusa si dị. Ọ bụ n’ihi oziọma nke a ka m ji na-ata ahụhụ nọrọkwa n’agbụ dịka onye ohi.

Ma otu ọ dị e keghị okwu Chineke agbụ. Ya mere ana m edi ihe niile n’ihi ndị a họọrọla ka ha wee nwetakwa nzọpụta nke ya na otito ebeebe na-agakọ n’ime Jesu Kristi.

Okwu a kwesịrị ntụkwasịobi: Ọ bụrụ na anyị sooro ya nwụkọọ ọnwụ anyị ga-esokwa ya dịkọọ ndụ. Ọ bụrụ na anyị nwee ntachịobi, anyị ga-esoro ya bụkọọ eze.

Ọ bụrụ na anyị agọnarị ya, ya onwe ya ga agọnarị anyị. Ọ bụrụ na anyị ekwesịghị ntụkwasịobi ya onwe ya kwesịrị ntụkwasịobi; n’ihina ọ pụghị ịgọnarị onwe ya.

Chetara ha nke a ma dọkwaa ha aka na ntị n’ihu nke Dinwenụ ka ha ghara ịrụụka banyere okwu ndị ahụ na-abaghị uru nke na-ewetara ndị nụrụ ya ịla n’iyi.

Gbaa mbọ gosị onwe gị n’ihu Chineke dịka onye ọrụ a họrọla nke na-etosịghị ime ihere ọbụla. Ị ga-abụkwa onye na-akuzi okwu nke eziokwu ahụ nke ọma.

ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 25:4-5, 8-9, 10, 14

Aziza: Onyenweanyị kuziere m ụzọ gị

1. Mee ka m mata ụzọ gị, O Onyenweanyị,

Kuziere m ụzọ gị

Dube m n’ụzọ eziokwu gị, ma kụzibere m

N’ihina ọ bụ gị bụ Chineke onye nzọpụta m,

Aziza: Onyenweanyị kuziere m ụzọ gị

2. Onyenweanyị dị mma bụrụkwa onye eziomume,

Ọ na-akụziri ndị mmehie ụzọ;

Ọ na-eduzi ndị umeala n’ihe niile kwụ ọtọ,

Ọ na-akụziri ndị ogbenye ụzọ ya.

Aziza: Onyenweanyị kuziere m ụzọ gị

3. Ụzọ nke Onyenweanyị bụ ịhụnaanya na eziokwu,

n’ebe ndị na-edebe iwu ya na ọgbụgbandụ ya nọ.

Ndị na-atụ Onyenweanyị egwu maara ihe omimi ya

Ọgbụgbandụ ya na-enye ha nghọta.

Aziza: Onyenweanyị kuziere m ụzọ gị

MBEKU – Ps. 119:34

Alleluia, Alleluia:

Nye m nghọta ka m wee mata iwu gị, wee nwee ike iji obi m niile dobe iwu gị.

Alleluia.

OZIỌMA – 12:28-34

Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Mak dere

Ma otu onye odeakwụkwọ bịarutere nụ ka ha na Jesu na-arụrịta ụka. Mgbe ọ hụrụ na Jesu zara ajụjụ ndị Sadụsii nke ọma, ọ jụrụ ya sị, “Olee iwu kacha n’ime iwu Chineke niile?”

Jesu zara ya sị, “Nke mbụ bụ nke a: ‘Nụrụnụ, ụmụ Izrel, Osebụrụwa Chineke anyị bụ otu. Ị ga-eji obi gị niile, mmụọ gị niile, uche gị niile na ike gị niile hụ Chineke n’anya’.

Nke abụọ bụ: ‘Ị ga-ahụ mmadụ ibe gị n’anya ka i si hụ onwe gị n’anya’ Ọ dịghị iwu ọzọkwa ka ndị a” Onye odeakwụkwọ ahụ zara ya sị, “Onyenkuzi, ị zara nke ọma, i kwuru n’ezie na Onyenweanyị bụ Chineke dị otu, na ọ dịghị Chineke ọzọ dị ma e wepụ ya I ji obi gị niile, nghọta, na ike gị niile, hụ ya n’anya na ịhụkwa mmadụ ibe gị n’anya ka onwe gị ka mkpa karịa aja nsureọkụ na aja ndị ọzọ a na-achụrụ Chineke”.

Mgbe Jesu hụrụ na ọ zara nke ọma, ọ gwara ya sị, “Ị nọteghị aka n’alaeze nke Chineke”. Mgbe nke a mechara, egwu ekwekwaghị onye ọbụla jụọ ya ajụjụ.

Igbo Mass Readings for June 5 2026, Fraịde n’ime Izuụka nke Itoolu N’Oge Adanyeghị n’Emume.

Igbo Mass Readings for June 4 2026, Tọọzde Izuụka nke Itoolu N’Oge Adanyeghị n’Emume.