Igbo Mass Readings for January 16 2025, Tọọzde n’ime Izuụka nke Mbụ N’Oge Adanyeghị n’Emume.

Nke a bụ Igbo Mass Readings for January 16 2025, Tọọzde n’ime Izuụka nke Mbụ N’Oge Adanyeghị n’Emume.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 3:7-14

Ihe Ọgụgụ Ewetara N’akwụkwọozi E Degaara Ndị Hibru

Ya bụ, dịka Mmụọ Nsọ si kwuo, “Taa mgbe ụnụ nụrụ olu ya ụnụ akpọchila obi ụnụ dịka ụnụ mere na nnupụisi, dịka ụnụ mere n’ụbọchị ahụ ụnụ nwara m n’ọzara, ebe nna ụnụ nwalere m, ma hụ akaọrụ m afọ iri anọ”.

N’ihi nke a ewesara m ọgbọ ahụ iwe ma sị, “Ha na-ejehie ụzọ mgbe niile n’obi ha, ha amatabeghị ụzọ m”. N’ihi nke a, añụrụ m iyi n’iwe m sị, “Ha agaghị abata n’ezumike m”.

Kpacharanụ anya ụmụnna m, ka a ghara inwe mmụọ ọjọọ n’ime onye ọbụla n’ime ụnụ, obi ekwe ekwe nke ga-eduba ụnụ n’ịdachapụ n’aka Chukwu dị ndụ.

Na-adụrịtanụ onwe ụnụ ọdụ ụbọchị ọbụla ka a ghara inwe onye ọbụla n’ime ụnụ ga-enwe obi mkpọchi n’ihi aghụghọ nke njọ. Anyị na-eketa oke na Kristi ma Ọ bụrụ naanị na anyị ejidesie ntụkwasịobi anyị mbụ ike ruo n’isi njedebe.

ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 95:6-7, 8-9,10-11

Azịza: Taa, ọ bụrụ na ụnụ anụ olu ya, ụnụ akpọchila obi ụnụ.

1. Bịanụ, ka anyị fee Onyenweanyị, kpọọrọ ya isi ala

Ka anyị sekpue n’ihu Onyenweanyị onye kere anyị

N’ihina ọ bụ Chineke anyị

Anyịnwa bụkwa ndị nke ya, igwe atụrụ ọ na-azụ.

Azịza: Taa, ọ bụrụ na ụnụ anụ olu ya, ụnụ akpọchila obi ụnụ.

2. Taa, ọ bụrụ na ụnụ anụ olu ya

Ụnụ akpọchila obi ụnụ dịka ụnụ mere na Meriba

Na n’ụbọchị ahụ na Masa n’ime ọzara

Mgbe nnanna ụnụ ha nwalere m, mgbe ha nwalere m,

Na-agbanyeghị na ha hụrụ ihe m mereela ha.

Azịza: Taa, ọ bụrụ na ụnụ anụ olu ya, ụnụ akpọchila obi ụnụ.

3. Afọ iri anọ zuru ezu ka iwe were m n’ebe agbụrụ ahụ nọ

Nke mere m jiri sị “Ndịa bụ ndị na ekwesịghị ntụkwasịobi

Ndị jụrụ iso ụzọ m.”

N’ihi ya añụrụ m iyi n’iwe sị,

Ha agaghị abata n’ala ezumike ahụ m kwere ha na nkwa.

Azịza: Taa, ọ bụrụ na ụnụ anụ olu ya, ụnụ akpọchila obi ụnụ.

MBEKU

Alleluia, Alleluia:

Jesu kwupụtara ozi ọma nke ala eze. Ọ gwọrọ ọrịa dị iche iche na-arịa ndị mmadụ.

Alleluia.                

OZIỌMA – 1:40-45

Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Mak dere.

Otu onye ekpenta bịakwutere Jesu, daa n’ụkwụ ya, na-arịọ ya sị, “Ọ bụrụ na ị chọrọ, I nwere ike ime ka m dị ọcha”. N’obi ebere, Jesu setịpụrụ aka ya, metụ ya, sị, “Achọrọ m; dị ọcha”.

Ozigbo ahụ ọrịa ahụ hapụrụ ya, o wee dị ọcha. Ma Jesu dọsiri ya aka na ntị ike; zilaa ya otu ihu ahụ. Ọ gwara ya sị, “

Hụkwa na o nweghị onye ọbụla ị kọọrọ nke a, ma gaa gosi onye nchụaja onwe gị, chekwaa n’ihu Chineke ihe onyinye dịka Mosis nyere n’iwu, ka ọ bụụrụ ndị mmadụ ihe ama na e meela ka ị dị ọcha”.

Ma o siri ebe ahụ pụọ, malite kwusaba okwu banyere ọgwụgwọ ya, nke mere na ọ dịghịkwara Jesu mfe ịbanye n’ime obodo, kama ọ gara nọrọ ebe ndị mmadụ na-ebighi, ma ndị mmadụ si akụkụ niile na-abịakwute ya.

Igbo Mass Readings for January 17 2025, Fraịde n’ime Izuụka nke Mbụ N’Oge Adanyeghị n’Emume.

Igbo Mass Readings for January 16 2025, Tọọzde n’ime Izuụka nke Mbụ N’Oge Adanyeghị n’Emume.