Igbo Mass Readings for January 15 2026, Tọọzde n’ime Izuụka nke Mbụ N’Oge Adanyeghị n’Emume.
Nke a bụ Igbo Mass Readings for January 15 2026, Tọọzde n’ime Izuụka nke Mbụ N’Oge Adanyeghị n’Emume.
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 4:1-11
Ihe Ọgụgụ ewetara n’Akwụkwọ mbụ nke Samuel
Okwu Samuel ruru ụmụ Izrel niile ntị. N’oge ahụ, Elaị emeela agadi, ụmụ ya ka nọgidesikwara ike n’omume ọjọọ ha. Mgbe ahụ, ndị Filistia biliri, ibuso ndị Izrel agha.
Ha wuru ogige ha n’Afek, ebe ụmụ Izrel wuru ogige nke ha ebe dị nso n’Ebeneza. Ndị Filistia doziri ndịagha ha n’usoro wee malite agha. Agha ahụ siri ike nke ukwu nke mere na ndị Filistia meriri ụmụ Izrel, gbuo puku anọ nke ndịagha ha n’ọgbọ agha.
Mgbe ndịagha Izrel ndị nwụfọrọ n’agha laghachiri n’ogige ha, ndị okenye Izrel sịrị, “Gịnị mere Yahweh ji kwenye ka ndị Filistia merie anyị taa? Ya mere, ka anyị jeenụ Shịlo bute Igbe ọgbụgbandụ Yahweh, ka ọ bịa n’etiti anyị, zọpụta anyị n’aka ndịịro anyị.”
Ndị Izrel wee ziga ndịozi, ka ha jee Shilo bute Igbe ọgbụgbandụ Chineke nke igwe ndịagha, onye ndị mmụọọma a kpụrụ akpụ bụ ocheeze ya. Ụmụ Elaị abụọ, Hofni na Finehas bu Igbe ọgbụgbandụ ahụ bịa.
Mgbe Igbe ọgbụgbandụ ahụ rutere, ụmụ Izrel niile tiri oke mkpu nke mere na ala mara jijiji. Mgbe ndị Filistia nụrụ ụzụ ha, ha jụrịtara onwe ha sị, “Gịnị mere ndị Hibru ji eme ụzụ n’ogige ha?”
Mgbe ha chọpụtara na ndị Hibru ebutela Igbe ọgbụgbandụ Yahweh n’ogige ha, ha tụrụ egwu, wee sị, “Anyị ahụbeghị ụdị ihe a mbụ! Anyị efuola! N’ihina chi ha abatala n’ogige ha.
Onye ga-anapụta anyị n’aka chi a dị ike nke ukwuu? Ọ bụ ya bụ chi ji ajọ ọrịa dị icheiche gbuchapụ ndị ljipt n’ịkpa! Mana ndị Filistia nweenụ obisiike!
Lụọnụ ọgụ ka nwoke! Ụnụ emeghị otu a, ụnụ ga-abụ ndị ohu ndị Hibru dịka ha onwe ha bụ ndị ohu ụnụ. Ya mere lụọnụ ọgụ ka nwoke!” Ndị Filistia wee lụsie ọgụ ike merie ndị Izrel.
Ndị Izrel gbara ọsọ, laa n’ụlọ ha onye ọbụla n’ime ha. Ndị Izrel e gburu n’agha ahụ dị iri puku atọ, bụ ndị ji ụkwụ alụ ọgụ. Ndị Filistia burukwara Igbe ọgbụgbandụ Chineke, gbukwaa ụmụ Elaị abụọ, Hofni na Finehas.
ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps 44:10-11, 14-15, 25-26
Azịza: Dinwenụ! Zọpụta anyị site n’ebere gị
1. Ma ugbu a, ị hapụla anyị legharakwa anyị anya
ị naghị anọnyekwara anyị n’ọgbọ agha
Ị hapụrụ ndịiro anyị ka ha chụghachị anyị azụ
Ha ji aka ike anara anyị ihe bụ nke anyị n’oge ọ masịrị ha.
Azịza: Dinwenụ! Zọpụta anyị site n’ebere gị
2. I meela ka ndị agbataobi anyị kọchaba anyị
I meela ka anyị bụrụ ihe ọchị na ịkwa emu n’ebe ndị gbara anyị gburugburu nọ
I meela ka anyị bụrụ ihe akaja n’etiti mba niile
ndị mmadụ ndịọzọ na-akparị anyị na-efere anyị n’isi.
Azịza: Dinwenụ! Zọpụta anyị site n’ebere gị
3. Gịnị mere I ji ezo ihu gị
N’echetaghị na anyị bụ ndị ogbenye na ndị a na-emegbu emegbu?
N’ihina isi anyị emetụla na ntụ
ahụ anyị wee tọgbọrọ n’ala.
Azịza: Dinwenụ! Zọpụta anyị site n’ebere gị
MBEKU
Alleluia, Alleluia:
Jesu kwupụtara ozi ọma nke ala eze. Ọ gwọrọ ọrịa dị iche iche na-arịa ndị mmadụ.
Alleluia.
OZIỌMA – 1:40-45
Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Mak dere.
Otu onye ekpenta bịakwutere Jesu, daa n’ụkwụ ya, na-arịọ ya sị, “Ọ bụrụ na ị chọrọ, I nwere ike ime ka m dị ọcha”. N’obi ebere, Jesu setịpụrụ aka ya, metụ ya, sị, “Achọrọ m; dị ọcha”.
Ozigbo ahụ ọrịa ahụ hapụrụ ya, o wee dị ọcha. Ma Jesu dọsiri ya aka na ntị ike; zilaa ya otu ihu ahụ. Ọ gwara ya sị, “Hụkwa na o nweghị onye ọbụla ị kọọrọ nke a, ma gaa gosi onye nchụaja onwe gị, chekwaa n’ihu Chineke ihe onyinye dịka Mosis nyere n’iwu, ka ọ bụụrụ ndị mmadụ ihe ama na e meela ka ị dị ọcha”.
Ma o siri ebe ahụ pụọ, malite kwusaba okwu banyere ọgwụgwọ ya, nke mere na ọ dịghịkwara Jesu mfe ịbanye n’ime obodo, kama ọ gara nọrọ ebe ndị mmadụ na-ebighi, ma ndị mmadụ si akụkụ niile na-abịakwute ya.
Igbo Mass Readings for January 16 2026, Fraịdee n’ime Izuụka nke Mbụ N’Oge Adanyeghị n’Emume.
Igbo Mass Readings for January 15 2026, Tọọzde n’ime Izuụka nke Mbụ N’Oge Adanyeghị n’Emume.