Igbo Mass Readings for April 24 2025, Tọọzde Izuukwu nke Mbilite n’Ọnwụ Kristi
Nke a bụ Igbo Mass Readings for April 24 2025, Tọọzde Izuukwu nke Mbilite n’Ọnwụ Kristi .
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 3:11-26
Ihe Ọgụgụ ewetara n’Ọrụ Ndịozi
Ebe nwoke a nọ jidesie Pita na Jọn aka ike, igwe mmadụ ahụ niile jiri ọsọ gbakọọ n’ebe ha nọ n’otu ụlọ dị na mpụta nke ụlọnsọ Chineke, nke a na-akpọ Ịba Solomon.
Ihe merenụ gbagwojukwara ha anya nke ukwu. Mgbe Pita hụrụ ha, ọ gwara ọgbakọ ahụ sị, “Ndị Izrel ibe m! Gịnị mere ihe a ji ju ụnụ anya otu a? Ọ bụ gịnị mere ụnụ ji ele anyị anya otu a, dịka aga-asị na anyị mere ka o jee ije site n’ike aka anyị ma ọ bụ site n’ezi okpukpe anyị na-enye Chukwu?
Chukwu nke Abraham, na nke Aịzik, na nke Jekọb, Chukwu nke nnanna anyị ha, enyela nwodibo ya bụ Jesu otito na ebube kacha elu. Onye nke ụnụ nyefere n’aka ndịisi, gọnahụkwa ya n’ihu Paịlet, Ọ bụladị mgbe Paịlet kpebiri ịhapụ ya.
Ụnụ gọnahụrụ onye nsọ na onye eziomume ahụ ma rịọ ka a hapụrụ ụnụ onye ogbu mmadụ. N’ime nke a, ụnụ egbuo onye na-enye ndụ, onye Chukwu mere ka o si n’ọnwụ bilie.
Anyị onwe anyị bụkwa ndị akaebe nke mbilite n’ọnwụ ya. Ọ bụ site n’ike nke aha ya ka nwoke a ụnụ hụrụ, matakwa, si nweta ike ịga ije. Ma ọ bụkwa site n’okwukwe e kwere n’aha ya ka e si nwee ike imezu nke a.
Okwukwe ahụ nke sitere n’aka Jesu mere ka ahụ nwoke a zuo oke n’ihu ụnụ niile. Ma ugbu a, ụmụnna m, amatala m na ihe ụnụ na ndị isi ụnụ mere Jesu, ụnụ mere ya n’amaghị ama.
Maka na Chineke mere ka ihe niile o buru ụzọ kwusaa site n’ọnụ ndị amụma ya niile, na Kristi ga-ata ahụhụ mezuo. Ya bụ, chegharịanụ laghachikwutekwanụ Chineke ka ọ sachapụ mmehie ụnụ niile, ka oge inweta ume ndụ si n’ebe Onyenweanyị nọ bịa, ka Chineke wee zitekwa Jesu onye o si na mbụ họpụta ka ọ bụrụ Kristi ụnụ.
Ọ ghaghị ịnọdụ n’eluigwe ruo mgbe Chineke mezuru ihe niile ka ọ dị ọhụrụ dịka o siri kwuo site n’olu ndị amụma ya mgbe ochie. Mosis kwuru sị, “Onyenweanyị Chineke ga-esi n’etiti ụnụ kpọlitere ụnụ onye amụma dịka o siri kpọlite m.
Ụnụ ga-ege ya ntị n’ihe niile ọ na-agwa ụnụ. N’oge ahụ, a ga-esi n’etiti ụnụ mapụ onye ọbụla egeghị onye amụma ahụ ntị.” Ee ndị amụma niile site na Samuel na ndị niile so ya n’azụ sooro kwusaa okwu maka ụbọchị ndị a.
Ụnụ onwe ụnụ bụ ụmụ ndị amụma bụrụkwa ndị nketa nke ọgbụgbandụ ahụ, nke Chineke na nnanna ụnụ ha gbara mgbe o kwere Abraham nkwa sị, “site n’agbụrụ gị ka m ga-agọzi mba niile nke ụwa.
Mgbe Chineke kpọlitere nwodibo ya, o buuru ụzọ zitere ụnụ ya ka ọ gọzie ụnụ site n’ịkpọghachi ụnụ azụ site na mmehie ụnụ.”
ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 8:2,5,6-7,8-9,
Azịza: Onyenweanyị Chineke anyị, lee ka aha gị siri dị elu n’ụwa niile.
1. Onyenweanyị Chineke anyị,
lee ka aha gị siri dị elu n’ụwa niile,
gịnị ka mmadụ bụ I ji eche echiche banyere ya,
nwa nke mmadụ na ị na-eleta ya anya?.
Azịza: Onyenweanyị Chineke anyị, lee ka aha gị siri dị elu n’ụwa niile.
2. N’agbanyeghị, i mere ka o jiri obere ihe karịa ndị mmụọọma nta,
I jikwa ùgwù na nsọpụrụ chọọ ya mma dị ka okpueze.
I mere ya nna ukwu ihe niile e kere eke,
were ihe niile dobe n’okpuru ya.
Azịza: Onyenweanyị Chineke anyị, lee ka aha gị siri dị elu n’ụwa niile.
3. Ọ na-achị ụmụatụrụ na ehi,
ya na ụmụ anụọhịa ndị ọzọ dị n’osimiri.
Ọ na-achị ụmụ nnụnụ nke igwe, azụ dị na mmiri,
na-anụ ndị ọzọ dị na osimiri.
Azịza: Onyenweanyị Chineke anyị, lee ka aha gị siri dị elu n’ụwa niile.
MBEKU
ALLELUIA ALLELUIA:
Taa bụ ụbọchị ahụ Onyenweanyị mere, ka anyị nwee añụrị ka obi dị anyị ụtọ na ya.
ALLELUIA.
OZIỌMA – 24:35-48.
Ihe Ọgụgụ ewetara n’Oziọma dị asọ nke Luk dere
Ha mmadụ abụọ kọọrọ ndị ọzọ ihe mere n’ụzọ mgbe ha gaje Emaus, na ka ha si mata onye ọ bụ site na-ịnyawa achịcha. Mgbe mmadụ abụọ ahụ na-akọ ihe ndị a, Jesu eguzoro n’etiti ha sị ha: “Udo dịrị ụnụ!”
Mana ha kụjara, tụkwaa egwu, chee na ha hụrụ ndị mmụọ. Ọ jụrụ ha sị: “Gịnị mere egwu ji na-atụ ụnụ, gịnịkwa mere ụnụ ji enwe obi abụọ? Leenụ aka m na ụkwụ m, ka ụnụ mara na ọ bụ mụ onwe m.
Metụnụ m aka ka ụnụ marakwa na ọ bụ m, n’ihina mmụọ enweghị anụahụ na ọkpụkpụ dịka ụnụ hụrụ na m nwere. Mgbe o kwuchara nke a o gosi ha aka ya na ụkwụ ya.
Añụrị ha ka dị ukwuu nke na ha ekwetabeghị n’ihe ha hụrụ, n’ihi na ọ tụrụ ha n’anya. Jesu jụrụ ha sị, “Ụnụ nwere ihe oriri ọbụla n’ebe a?” Ha nyetụrụ ya azụ a ñara n’ọkụ.
Ọ nara ha azụ ahụ, rie ya n’ihu ha. Jesu gwara ha sị: “Ihe ndị a bụ ihe ndị m gwara ụnụ mgbe mụ na ụnụ nọ, na ihe niile e dere n’Akwụkwọ iwu Mosis, n’Akwụkwọ ndị amụma na Abụọma banyere m aghaghị imezu.”
Mgbe ahụ O meghee uche ha, ka ha ghọta ihe e dere n’Akwụkwọ Nsọ. Ọ gwakwara ha sị: “Otu a, ka e si dee ya, na Kristi ahụ ga-ata ahụhụ sikwa n’ọnwụ bilie n’ụbọchị nke atọ.
A ga-ekwusakwa nchegharị na mgbaghara njọ ga n’aha ya site na Jerusalem ruo mba niile. Ụnụ onwe ụnụ bụ ndị akaebe ihe ndị a niile.
Igbo Mass readings for April 25 2025, Fraịde Izuukwu nke Mbilite n’Ọnwụ Kristi.
Igbo Mass Readings for April 24 2025, Tọọzde Izuukwu nke Mbilite n’Ọnwụ Kristi.