Igbo Mass Readings for March 6 2025, Tọọzde na-eso Wenezde Ntụ

Nke a bụ Igbo Mass Readings maka March 6 2025, Tọọzde na-eso Wenezde Ntụ.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 30:15-20

Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Diuterọnọmi

Mosis were gwa ọha mmadụ ahụ sị “Taa, ana m eche n’ihu ụnụ ọnwụ na ndụ, ihe ọma na ihe ọjọọ ka ụnụ họrọ nke ka ụnụ mma.

Ọ bụrụ na ụnụ edobe iwu niile nke Yahweh bụ Chineke ụnụ, nke m na-enye ụnụ taa, ọ bụrụkwa na ụnụ ahụ ya n’anya, rubere ya isi, dobekwa iwu ya niile, ụnụ ga-aga n’ihu, bụrụkwa mba bara ụba mmadụ.

Yahweh bụ Chineke ụnụ ga-agọzi ụnụ, mee ka ụnụ biri n’ala ahụ nke ụnụ na-abịa inweta. Ma ọ bụrụ na ụnụ enupụisi n’iwu ya jụkwa ige ya ntị, ọ bụrụ na ụnụ agahie ụzọ febe ma sekpuwere chi ndị ọzọ, aga-ekpochapụrịrị ụnụ.

Ụnụ agaghịkwa ebi ogologo ndụ n’ala ahụ, n’ofe Jọdan, ebe ụnụ na-aga, ka ụnụ biri n’ime ya. Ugbu a, ana m eche n’ihu ụnụ ọnwụ na ndụ, ngọzi na abụmọnụ Chineke, ka ụnụ họrọ nke ka ụnụ mma.

Ana m akpọkwa eluigwe na ụwa ka ha gbaa akaebe banyere nke ọbụla ụnụ ga-ahọrọ. Ya mere, họrọnụ ndụ, ka ụnụ na ụmụ-ụmụ ụnụ wee dị ndụ. Hụnụ Yahweh bụ Chineke ụnụ n’anya. Ruberenụ ya isi.

Werekwanụ ịkwụdosiike fee ya, ka ụnụ na ndị ụmụ ụnụ dị ogologo ndụ n’ala ahụ nke O kwere nkwa inye nnanna ụnụ ha bụ Abraham, na Aịzik na Jekọb.”

ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 1:1-2, 3,4,6

Azịza: Añụrị ga-adịrị ndị tụkwasara obi ha na Dinwenụ.

1. Añụrị ga-adịrị nwoke ahụ nke anaghị eso ndụmọdụ onye ajọomume,

ma ọ bụ na akwụgharị n’ụzọ ndị ome njọ,

ma ọ bụ nọdụ n’otu ndị na-ekwutọ Chineke;

Kama na-enwe añụrị n’ebe iwu nke Onyenweanyị dị;

ma na-achịgharị iwu ya n’obi ya ehihie na abalị.

Azịza: Añụrị ga-adịrị ndị tụkwasara obi ha na Dinwenụ.

2. Ọ dịka osisi akụrụ na akụkụ iyi,

nke na-amịpụta mkpụrụ ya n’oge ya,

nke akwụkwọ ya anaghị akpọnwụ akpọnwụ,

ihe niile ọ na-eme na-agara ya nke ọma.

Azịza: Añụrị ga-adịrị ndị tụkwasara obi ha na Dinwenụ.

3. Ọ dịghị otu a n’ebe ndị ajọ mmadụ nọ;

Mba, n’ihi na ha dịka afụrụ ọka nke ikuku na-ebugharị.

N’ihi na Onyenweanyị na-echekwaba ụzọ ndị eziomume,

mana ụzọ ndị ajọ mmadụ na-eduba n’ịla n’iyi.

Azịza: Añụrị ga-adịrị ndị tụkwasara obi ha na Dinwenụ.

MBEKU – Amọs 5: 14.

R/ Otito na ebube dịrị Gị, O Dinwenụ, Jesu Kristi.

Chọba ezi ihe kama ajọ ihe, ka ụnụ wee dị ndụ, ka Yahweh nke igwe ndị agha wee nọnyere ụnụ.

R/ Otito na ebube dịrị Gị, O Dinwenụ, Jesu Kristi.

OZIỌMA – 9:22-25.

Ihe Ọgụgụ e wetara n’Oziọma dị asọ nke Luk dere.

Ma Jesu dọrọ ndị na-eso ụzọ ya aka na ntị, nyesie ha iwu ike, ka ha ghara ịkọrọ onye ọbụla ihe a, sị, “Nwa nke mmadụ ahụ ga-ata ọtụtụ ahụhụ. Ndị okenye ndị Juu, na ndịisi nchụaja, na ndị odeakwụkwọ ga-ajụ ya.

A ga-egbukwa ya, ma n’ụbọchị nke atọ, a ga-eme ka o si n’ọnwụ bilie.” O wee gwa ndị niile nọ ebe ahụ sị, “Ọ bụrụ na onye ọbụla a chọọ iso m, ya jụ onwe ya, buru obe ya ụbọchị niile sobe m.

N’ihi na onye ọbụla nke na-achọ ịzọpụta ndụ ya ga-atụfu ya. Ma onye ọbụla nke ga-atụfu ndụ ya n’ihi m, ga-azọpụta ya. Kedụ uru ọ ga-abara mmadụ ma o ritechaa ụwa niile n’uru ma tụfuo mkpụrụobi ya ma ọ bụ onwe ya efulahụ ya.

Igbo Mass Readings for March 7 2025, Fraịde na-eso Wenezde Ntụ.

Igbo Mass Readings for March 6 2025, Tọọzde na-eso Wenezde Ntụ.