Igbo Mass Readings for March 11 2025, Tuzde n’ime Izuụka nke Mbụ n’Oge Ncheta Ahụhụ Kristi

Nke a bụ Igbo Mass Readings maka March 11 2025, Tuzde Izuụka nke Mbụ n’Oge Ncheta Ahụhụ Kristi.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 55:10-11

Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ onye Amụma Aịzaya

Dịka otu mmiri ozuzo na akụmmiriigwe na-esi n’eluigwe ezo anaghị alaghachi azụ ruo mgbe ọ gbasara mmiri n’ụwa, bịa mezie ala ka o mee ihe akụkụ ka o pupụta, nye onye ọrụ ugbo ihe oriri ọ ga- eri.

Otu a ka okwu na-esi m n’ọnụ apụta si adị, o nweghị ike ịgba aka lọghachikwute m, kama ọ ga-emejupụta ihe m bu n’obi, ma mezuokwa ihe m jiri maka ya zipụ ya.

ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 34:4-5,6-7,16- 17.18-19.

Azịza: N’ime ahụhụ ha niile Onyenweanyị na-azọpụta ndị umeala.

1. Soronụ m kwupụta ịdịukwu nke Onyenweanyị,

Soronụ m too aha ya,

Akpọkuru m Onyenweanyị Ọ zaa m,

Ọ zọpụtara m n’egwu niile na-atụ m.

Azịza: N’ime ahụhụ ha niile Onyenweanyị na-azọpụta ndị umeala.

2. Ihu ọbụla chere n’ebe Onyenweanyị nọ na-amụke-amụke,

ihere anaghị eme ya ma ọlị.

Onyenweanyị na-anụ mkpu akwa nwogbenye,

Ọ na-enyekwara ya aka na nsogbu ya niile.

Azịza: N’ime ahụhụ ha niile Onyenweanyị na-azọpụta ndị umeala.

3. Onyenweanyị na-elekọta ndị eziomume anya,

Ọ na-egekwa mkpu akwa ha ntị,

Mana Onyenweanyị na-agbarụ ihu n’ebe ndị ajọomume nọ,

Ọ na-eme ka a ghara ichetakwa ha n’ụwa.

Azịza: N’ime ahụhụ ha niile Onyenweanyị na-azọpụta ndị umeala.

4. Ndị eziomume kpọkuru Onyenweanyị, Ọ zaa ha,

wee zọpụta ha na nsogbu ha niile.

Onyenweanyị na-anọ ndị obi loghara elogha nso,

na-enyere ndị dara mba na mmụọ aka.

Azịza: N’ime ahụhụ ha niile Onyenweanyị na-azọpụta ndị umeala.

MBEKU – Ps. 130: 5, 7.

R/ Otito na ebube dịrị Gị, O Dinwenụ, Jesu Kristi.

Mkpụrụobi m na-eche Onyenweanyị, na nkwa ya ka m nwere nchekwube, N’ihina ịhụnaanya Onyenweanyị dị ọkpụ, n’ime ya ka nnukwu nzọpụta dị.

R/ Otito na ebube dịrị Gị, O Dinwenụ, Jesu Kristi.

OZIỌMA – 6:7-15

Ihe Ọgụgụ e wetara n’Oziọma dị asọ nke Matiu dere.

Jesu gwara ndị n’eso ụzọ ya sị: “Mgbe ụnụ na-ekpe ekpere, ụnụ ekwukwala ọtụtụ okwu na- abaghị uru, dịka ndị mba ọzọ si eme; n’ihi na ha na-eche na site n’ọtụtụ okwu, Chineke ga-anụ ekpere ha.

Ụnụ emekwala ka ha, n’ihina Nna ụnụ maara mkpa ụnụ tupu ụnụ arịọ ya. Ya bụ, na-ekpenụ ekpere otu a: “Nna anyị nọ n’eluigwe ka otito dịrị aha Gị Ka ọchịchị Gị bịa, ka e mee uche Gị n’ụwa, Dịka e si eme ya n’eluigwe.

Nye anyị taata nri nke ụbọchị anyị; Gbaghara anyị mmehie anyị dịka anyị si gbaghara ndị mehiere anyị. Ekwela ka anyị kwenye na nranye Ma zọpụta anyị n’ajọ ihe’.

N’ihi na ọ bụrụ na ụnụ agbaghara ndị mmadụ mmehie ha, Nna ụnụ nke bi n’eluigwe ga-agbagharakwa ụnụ; mana ọ bụrụ na ụnụ agbagharaghị ibe ụnụ mmehie ha mere ụnụ, Nna ụnụ agaghị agbaghara ụnụ mmehie ụnụ.

Igbo Mass readings for March 12 2025, Wenezde Izuụka nke Mbụ n’Oge Ncheta Ahụhụ Kristi.

Igbo Mass Readings for March 11 2025, Tuzde Izuụka nke Mbụ n’Oge Ncheta Ahụhụ Kristi.