Igbo Mass Readings for April 29 2025, Tuzde Izuụka nke Abụọ n’oge Mbilite n’Ọnwụ Kristi
Nke a bụ Igbo Mass Readings for April 29 2025, Tuzde Izuụka nke Abụọ n’oge Mbilite n’Ọnwụ Kristi.
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 4:32-37
Ihe Ọgụgụ ewetara n’Ọrụ Ndịozi.
N’oge ahụ, ọha ndị kwere na Kristi jikọrọ ọnụ n’otu mmụọ na n’otu obi, nwekọ ihe ọnụ. Ọ dịghị onye ọbụla n’ime ha na-asị na ihe ọbụla ya nwere bụ nke naanị ya.
Ha ji ike ha niile na-agba akaebe banyere mbilite n’ọnwụ nke Onyenweanyị Jesu. Amara nke Chineke pụtakwara ihe n’ahụ ha niile n’ụba n’ụzọ pụrụ iche.
Ọ dịghị onye ọbụla n’etiti ha a hapụrụ ka ọ nọdụ n’ụkọ. Ndị nwere ala ubi, ma ọ bụ ụlọ rere ha, weta ego niile ha retara, dobe ha n’ụkwụ ndị ụmụazụ.
Ha na-ekesakwa ego ahụ niile, nye onye ọbụla n’otu n’otu dịka mkpa ya si dị. Otu a ka Josef, bụ onye Levaị, onye amụrụ n’ala Saịprọs, onye ndịozi kpọrọ Banabas nke pụtara: “Nwa nke nkasịobi,” si ree ala ubi weta ego ya dobe n’ụkwụ ndị ụmụazụ.
ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 93: 1, 1-2, 5.
Azịza: Onyenweanyị bụ eze, O yi ebube dịka uwe.
1. Onyenweanyị bụ eze, O yi ebube dịka uwe;
kere ike n’ukwu ka ajị.
O mere ka ụwa kwụrụ chịm;
nke a na-enweghị ike ịkwagharị ya.
Azịza: Onyenweanyị bụ eze, O yi ebube dịka uwe.
2. O mere ka ụwa kwụrụ chịm;
nke a na-enweghị ike ịkwagharị ya.
Ocheeze gị dị bido na mgbe ochie,
Ị dịrịị tupu e kee ụwa.
Azịza: Onyenweanyị bụ eze, O yi ebube dịka uwe.
3. Iwu gị niile kwụsiri ike,
ebe obibi gị dị nsọ Onyenweanyị
ruo mgbe ebighịebi.
Azịza: Onyenweanyị bụ eze, O yi ebube dịka uwe.
MBEKU
ALLELUIA ALLELUIA:
Jesu Kristi, Ị bụ onye akaebe dị ntụkwasịobi, onye mbụ si na ndị nwụrụ anwụ pụta, Ị hụrụ anyị n’anya, were ọbara gị sachapụ njọ anyị.
ALLELUIA.
OZIỌMA – 3:7-15
Ihe Ọgụgụ ewetara n’Oziọma dị asọ nke Jọn dere.
Jesu gwara Nịkọdemus sị, Ya atụla gị n’anya, na m sị, ‘A ga-amụgharịrị gị ọzọ. Ifufe na-efe ebe ọ bụla ọ sọrọ ya. Ị na-anụ mkpọtụ ya, ma Ị maghị ebe o si abịa na ebe ọ na-aga.
Otu a ka ọ dị onye ọbụla amụrụ site na Mmụọ Nsọ.” Nịkọdemus jụrụ ya sị, “Olee otu nke a ga-esi mee?” Jesu jụrụ ya sị, “Ị bụ onye nkuzi Izrel ma Ị maghị ihe ndị a?
N’ezie agwa m gị, anyị na-ekwu ihe anyị maara, na-agbakwa akaebe ihe anyị hụrụ, ma ụnụ anaghị anara ịgba akaebe anyị. Ọ bụrụ na I kwereghị mgbe m gwara gị ihe nke ụwa, olee otu Ị ga-esi kwere ma m kọọrọ gị ihe nke eluigwe?
O nwebeghị onye ọbụla rịgorola n’eluigwe mbụ ma ọ bụghị naanị Nwa nke mmadụ onye si n’eluigwe rịdata. Dịka Mosis si welie agwọ elu n’ime ọzara, otu ahụ ka a ga-esi welie Nwa nke mmadụ elu. Ka onye ọbụla nke kwere na ya wee nwee ndụ ebeebe.
Igbo Mass Readings for April 30 2025, Emume nke Ezenwaanyị, Nne nke Afrịka OR Wenezde Izuụka nke Abụọ n’oge Mbilite n’Ọnwụ Kristi.
Igbo Mass Readings for April 29 2025, Tuzde Izuụka nke Abụọ n’oge Mbilite n’Ọnwụ Kristi.