Igbo Mass Readings for February 26 2030, Tuzde Izuụka nke Asaa N’Oge Adanyeghị n’Emume.

Nke a bụ Igbo Mass Readings for February 26 2030, Tuzde Izuụka nke Asaa N’Oge Adanyeghị n’Emume.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 4:1-10

Ihe Ọgụgụ ewetara n’Akwụkwọozi Jemis

Olee ihe na-akpata ibu agha? Gịnị na-ewetakwa ịlụ ọgụ ọtụtụ mgbe n’etiti ụnụ? Ihe na-eweta ha bụ ọchịchọ, anya ukwu na oke agụụ, ịhe ụtọ nke na-agụ ụnụ, na-ebu agha n’ime ahụ ụnụ.

Ọ bụrụ na ụnụ chọọ, ma ụnụ achọtaghị ya ụnụ egbuo mmadụ. Ụnụ na-enwe anya ukwu n’ihe onyeọzọ nwere, ma ọ bụrụ na ụnụ enwetaghị ya, ụnụ amalite ịlụ ọgụ na ibu agha.

Ụnụ enweghị, maka na ụnụ arịọghị ya n’ekpere. Ụnụ na-arịọ, ma ụnụ adịghị anata n’ihina ụnụ na-arịọ n’obi ọjọọ. Ụnụ na-arịọ maka ihe ụnụ ga-emefu n’ihe ụtọ nke ụwa.

Ụnụ ndị na-ekwesịghị ntụkwasịobi! Ụnụ amaghị na ịbụ enyi nke ụwa bụ ịbụ onyeiro nke Chineke? Onye ọbụla nke chọrọ ịbụ enyi nke ụwa na-eme onwe ya onyeiro nke Chukwu.

Ụnụ na-eche na ọ bụ n’efu ka Akwụkwọ Nsọ na ekwu sị, Agụụ banyere anyị na-agụsi Mmụọ ahụ ike n’ụzọ ekworo bụ mmụọ ahụ nke Chineke mere ka o biri n’ime anyị.

Amara nke Chineke na-enye buru ibu karịa. Ya mere Akwụkwọ Nsọ kwuru sị, Chineke na emegide ndị mpako. Ọ na-enyekwa ndị dị umeala amara.

Doonụ onwe ụnụ n’okpuru Chineke. Jụnụ Ekwensu, ọ ga-agbapụkwa n’ebe ụnụ nọ. Bịaruonụ Chineke nso, Ọ ga-abịarukwa ụnụ nso. Meenụ ka aka ụnụ dị ọcha ụnụ ndị ome njọ!

Mekwaanụ ka obi ụnụ dị ọcha ụnụ ndị ihu abụọ! Ruonụ ụjụ! Kwakwaanụ akwa! Meenụ ka ọchị ụnụ ghọọ iru ụjụ ka ọñụ ụnụ bụrụkwa mgbarụ ihu! Wedanụ onwe ụnụ n’ihu Onyenweanyị. Ọ ga-ewelikwa ụnụ elu.

ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 55: 6-7,8-9,9-10

Azịza: Butere Onyenweanyị nsogbu gị niile, ọ ga-akwado gị

1. M wee sị, Asị na m nwere nku dịka nduru,

agaara m efepụ gaa ebe m ga-enwe ezumike.

Agaara m efelaga n’ọzara dị nnọọ anya biri na ya.

Azịza: Butere Onyenweanyị nsogbu gị niile, ọ ga-akwado gị

2. Agaara m achọta ebe m ga-anọ ozigbo

Zere oke ikuku na ebili mmiri

Chineke, ka Ị laa atụmaatụ na ire ọjọọ ha n’iyi.

Azịza: Butere Onyenweanyị nsogbu gị niile, ọ ga-akwado gị

3. Ana m ahụ ịlụ ọgụ na ọgbaaghara jupụtara obodo;

Ehihie na abalị ha na-agagharị n’akụkụ mgbidi

nke obodo na-eme ihe arụ dị icheiche n’ime ya.

Azịza: Butere Onyenweanyị nsogbu gị niile, ọ ga-akwado gị

4. Butere Onyenweanyị nsogbu gị

ọ ga akwado gị

Ọ gaghị ekwe ka onye eziomume ọbụla daa.

Azịza: Butere Onyenweanyị nsogbu gị niile, ọ ga-akwado gị

MBEKU – James 1:18

Alleluia, Alleluia:

Site n’uche nke aka ya, o jiri okwu nke eziokwu ahụ mee ka anyị pụta iche. Meekwa ka anyị bụrụ ụdị mkpụrụ mbụ nke ihe o kere eke.

Alleluia.           

OZIỌMA – 9:30-37

Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Mak dere

Jesu na ndị na-eso ụzọ ya esi n’elu ugwu ahụ rịdata. Ha si n’ebe ahụ pụọ, site n’obodo Galili gafee. Ma Jesu achọghị ka onye ọbụla mara ebe ọ nọ.

N’ihina ọ na-akụziri ndị na-eso ụzọ ya sị, “A ga-arara Nwa nke mmadụ nye n’aka ndị mmadụ. Ha ga-egbu ya. Ma mgbe ha gbuchara ya ọ ga-ebili mgbe ụbọchị atọ gachara.

Ndị na-eso ụzọ ya aghọtaghị isi okwu a. Ma egwu ekweghị ha ajụ ya ajụjụ. Ha bịaruru Kapanaum. Mgbe Jesu banyere n’ime ụlọ, ọ jụrụ ndị na-eso ụzọ ya, sị, “Gịnị ka ụnụ na-ekwurịta n’ụzọ?”

Ma ha gbara nkịtị, n’ihina ha na ekwurịta n’ụzọ banyere onye kacha ibe ya n’etiti ha. Jesu nọdụrụ ala kpọọ mmadụ iri na abụọ ahụ.

Ọ sịrị ha, “Ọ bụrụ na onye ọbụla na-achọ ka ọ bụrụ onye mbụ, ọ ga-edebe onwe ya ka onye ikpeazụ n’etiti ụnụ, ọ ga-abụkwa nwodibo ụnụ niile”.

O kuru otu nwatakịrị, guzobe ya n’etiti ha. O kukwaara ya ọzọ n’aka abụọ, gwa ndị na-eso ụzọ ya, sị, “Onye ọbụla nke nabatara otu n’ime ụmụntakịrị dị otu a n’aha m, mụ onwe m ka ọ nabatara, onye ọbụla nke nabatara m, ọ bụghị m ka ọ nabatara, kama ọ nabatara onye zitere m”.

Igbo Mass Readings for February 27 2030, Wenezde Izuụka nke Asaa N’Oge Adanyeghị n’Emume.

Igbo Mass Readings for February 26 2030, Tuzde Izuụka nke Asaa N’Oge Adanyeghị n’Emume.