Igbo Mass Readings for March 4 2025, Tuezde n’ime Izuụka nke Asatọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.

Nke a bụ Igbo Mass Readings for March 4 2025, Tuezde n’ime Izuụka nke Asatọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 35:1-12

Ihe Ọgụgụ e wetara n’akwụkwọ Sịrak

Idobe iwu bụ inye ọtụtụ onyinye; ige ntị n’ihe iwu kwuru bụ ịchụaja nke udo. Onye jiri ekele kwụghachi ụgwọ afọọma e meere ya, nyere onyinye ntụọka. Ma onye nyere onyinye ebere, chụrụ aja nke inye ekele. Iwepụ aka n’ajọ ihe na-atọ Onyenweanyị ụtọ.

Ịhapụ ụzọ ezighị ezi bụ ime ọpịpịa maka njọ. Agbakwala aka abịa n’ihu nke Onyenweanyị. Maka na iwu chọrọ ka a na-eme ihe ndị a. Onyinye onye eziomume na-achọ ekwunchụaja mma.

Isi ọma ya na-arịgoro n’ihu nke Onyekachaelu. A na-anabata aja onye eziomume, ncheta ya ga-adị ọkpụ. Too Onyenweanyị site n’iji obi gị niile nye onyinye. Emekwala aka chịchịrị n’inye onyinye nke mkpụrụ mbụ gị. Jiri ihu ọchị na-enye onyinye ọbụla.

Were añụrị hunye otu ụzọ n’ime ụzọ iri nke ihe i nwere. Nye onyinye kachaelu dịka O si enye gị. Nye onyinye mara mma, buọ ibu dịka aka gị ha. Maka na Onyenweanyị bụ ezigbo onye ọkwụ ụgwọ.

Ọ ga-akwụ gị ụgwọ mmaji asaa. Enyekwala ya bụ Onyenweanyị ngarị maka na Ọ gaghị anara ya. Atụkwasịla nchekwube gị n’aja ezighị ezi, maka na Onyenweanyị bụ onye ọkaikpe, Ọ naghị asọ mmadụ anya.

ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 50:5-6, 7-8, 14, 23

Azịza: A ga m egosi nzọpụta nke Chineke n’ebe ndị eziomume nọ.

1. Kpọkọtaranụ m ndị nke m kwere ekwe,

ndị mụ na ha gbara ndụ site n’aja ha chụrụ!

Ka eluigwe niile kwupụta eziomume ya;

mgbe Chineke n’onwe ya bụ onye ọkaikpe.

Azịza: A ga m egosi nzọpụta nke Chineke n’ebe ndị eziomume nọ.

2. Geenụ ntị ndị nke m, ana m ekwu okwu,

Izrel, ana m agba akaebe megide ụnụ,

ana m ekpe ụnụ ikpe n’ihu ụnụ,

Mụ Osebụrụwa, Chineke ụnụ

Ọ bụghị n’ihi aja ụnụ ka m ji wee na-abara ụnụ mba,

aja nsureọkụ ụnụ nọ n’ihu m oge niile.

Azịza: A ga m egosi nzọpụta nke Chineke n’ebe ndị eziomume nọ.

3. Mba, ka inye ekele gị bụrụ aja nke ị na-achụnyere Chineke,

mejupụta iyi ị ñụụrụ onye kacha elu.

Onye ọbụla na-achụnyere m aja ekele na asọpụrụ m,

ma aga m egosi nzọpụta nke Chineke

n’ebe ndị eziomume nọ.

Azịza: A ga m egosi nzọpụta nke Chineke n’ebe ndị eziomume nọ.

MBEKU – 1 Jon 2:5

Alleluia, Alleluia:

Onye ọbụla nke na-edobe okwu Kristi, n’ezie, ịhụnaanya maka Chineke zuru oke n’ime ya.

Alleluia.

OZIỌMA – 10:28-31

Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Mak dere

Pita ebido gwaba Jesu sị, “Lee anyị ahapụla ihe niile soro gị”. Jesu sịrị ha, “N’ezie agwa m ụnụ, ọ dịghị onye ọbụla nke hapụrụ ụlọ, mọbụ ụmụnne ndị nwoke mọbụ ụmụnne ndị nwaanyị mọbụ nne mọbụ nna, mọbụ ụmụ, mọbụ ala, n’ihi m na n’ihi oziọma, na-agaghị enweta ihe ndị a ugbu a, na n’oge a.

Ọ ga-enweta narị kwuru narị; ụlọ, na ụmụnne nwoke na ụmụnne nwaanyị, na nne, na ụmụ, na ubi, ha na ọtụtụ nsogbu, ọ ga-anatakwa ndụ ebighịebi n’ụwa nke na-abịa n’ihu. Ma ọtụtụ ndị bu ụzọ ga-abụ ndị ikpeazụ, ndị ikpeazụ abụrụ ndị bu ụzọ”.

Igbo Mass Readings for March 5 2025, Wenezde Ntụ

Igbo Mass Readings for March 4 2025, Tuezde n’ime Izuụka nke Asatọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.