Igbo Mass Readings for May 26 2026, Tuzde Izuụka nke Asatọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.
Nke a bụ Igbo Mass Readings for May 26 2026, Tuzde Izuụka nke Asatọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 1:10-16
Ihe Ọgụgụ ewetara n’Akwụkwọozi Pita nke Mbụ
Ihe banyere nzọpụta a ka ndị amụma chọsiri ike, jụkwaa ajụjụ banyere ya. Ha bukwara amụma banyere amara ahụ nke Chineke ga-enye ụnụ. Ha gbara mbọ ịchọpụta ihe mmụọ Kristi ahụ bi n’ime ha na-ekwu, n’ihina ọ bụrụla ụzọ gbaara ha ama banyere ahụhụ niile Kristi ga-ahụ na ebube niile ga-eso ya.
Chineke mere ka ha mata na ọrụ ha rụrụ n’ụwa abụghị maka ọdịmma nke onwe ha, kama, maka nke ụnụ. Ha rụụrụ ụnụ ọrụ nke a mgbe ha gwara ụnụ okwu banyere ihe ndị ahụ, nke ndị na-agbasa oziọma na-agwakwa ụnụ ugbu a.
Ha gwara ụnụ ya site n’ike nke Mmụọ Nsọ, nke e siri n’eluigwe zita. Ihe ndị ahụ bụkwa ihe ndị mmụọọma n’onwe ha chọkwara ịmata. N’ihi nke a, werenụ uche ụnụ niile jikere ịrụ ọrụ, anya dookwa ụnụ.
Nweenụ nchekwube zuru oke n’amara nke a ga-ewetara ụnụ mgbe a ga-ekpughe Jesu Kristi. Dị ka ụnụ na-erubeisi, ụnụ esokwala na eme ihe ọjọọ ụfọdụ nke na-agụ ụnụ agụụ na mbụ mgbe ụnụ na-amaghị ihe.
Kama dịnụ nsọ n’ihe niile ụnụ na-eme dị ka Chineke onye nke kpọrọ ụnụ. N’ihina e dere ya n’akwụkwọ Nsọ, sị: Ụnụ ga-adị nsọ, n’ihina mụ onwe m dị nsọ.
ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 98: 1, 2-3, 3-4
Azịza: Onyenweanyị egosịla ike nzọpụta ya
1. Kweere Onyenweanyị ukwe ọhụrụ
n’ihina ọ rụrụ ọrụ ebube,
aka nrị ya na aka ya dị nsọ
eweterela ya mmeri.
Azịza: Onyenweanyị egosịla ike nzọpụta ya
2. Onyenweanyị egosịla ike nzọpụta ya,
o meela ka mba niile mata eziomume ya.
O chetala ịhụnaanya ya na ịkwụdosiike ya
n’ebe ezinụụlọ Izrel nọ.
Azịza: Onyenweanyị egosịla ike nzọpụta ya
3. Akụkụ ụwa niile ahụla
nzọpụta nke Chineke anyị
Ụwa niile tijerenụ Onyenweanyị mkpu ọnụ,
Werenụ ukwe na mkpu ọñụ too ya.
Azịza: Onyenweanyị egosịla ike nzọpụta ya
MBEKU – 1 Jon 2:5
Alleluia, Alleluia:
Onye ọbụla nke na-edobe okwu Kristi, n’ezie, ịhụnaanya maka Chineke zuru oke n’ime ya.
Alleluia.
OZIỌMA – 10:28-31
Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Mak dere
Pita ebido gwaba Jesu sị, “Lee anyị ahapụla ihe niile soro gị”. Jesu sịrị ha, “N’ezie agwa m ụnụ, ọ dịghị onye ọbụla nke hapụrụ ụlọ, mọbụ ụmụnne ndị nwoke mọbụ ụmụnne ndị nwaanyị mọbụ nne mọbụ nna, mọbụ ụmụ, mọbụ ala, n’ihi m na n’ihi oziọma, na-agaghị enweta ihe ndị a ugbu a, na n’oge a.
Ọ ga-enweta narị kwuru narị; ụlọ, na ụmụnne nwoke na ụmụnne nwaanyị, na nne, na ụmụ, na ubi, ha na ọtụtụ nsogbu, ọ ga-anatakwa ndụ ebighịebi n’ụwa nke na-abịa n’ihu. Ma ọtụtụ ndị bu ụzọ ga-abụ ndị ikpeazụ, ndị ikpeazụ abụrụ ndị bu ụzọ”.
Igbo Mass Readings for May 27 2026, Wenezde Izuụka nke Asatọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.
Igbo Mass Readings for May 26 2026, Tuzde Izuụka nke Asatọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.