Igbo Mass Readings for May 6 2025, Tuzde Izuụka nke Atọ n’oge Mbilite n’Ọnwụ Kristi

Nke a bụ Igbo Mass Readings for May 6 2025, Tuzde n’ime Izuụka nke Atọ n’oge Mbilite n’Ọnwụ Kristi.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 7:51-8:3

Ihe Ọgụgụ ewetara n’Ọrụ Ndịozi

Stivin gwara ndị mmadụ, ndị okenye na ndị odeakwụkwọ sị: “Ụnụ ndị isi ike, ndị kpọchiri obi ha na ntị ha ịnụ okwu Chineke, ndị na-ajụ ịnabata Mmụọ Nsọ dịka nna ụnụ ha si mee.

O nwere onye amụma ọbụla nna ụnụ ha emekpaghị ahụ? Ha gburu ndị ahụ buru ụzọ kwusaa okwu banyere ọbịbịa nke onye eziomume, onye ụnụ raara nye ma gbuo ya.

Ụnụ bụ ndị natara iwu Chineke dịka e nyere ya site n’aka ndị mmụọọma ma ụnụ edebeghị ya.” Mgbe ọgbakọ ikpe ahụ nụrụ ihe ndị a, iwe were ha nke ukwu n’ebe Stivin nọ ha wee taa ikikere eze, ma Stivin onye jupụtara n’ike nke Mmụọ Nsọ lere anya n’eluigwe hụ ebube nke Chineke.

Ọ sị ha, “Lee! Ana m ahụ ka e meghere eluigwe, na nwa nke mmadụ ka ọ kwụ n’aka nri nke Chineke. Ha weere oke olu tie mkpu, were aka kwuchie ntị ha, were ọsọ wakpo Stivin.

Ha si n’obodo ahụ kpụrụ ya, were okwute tụgbuo ya. Ndị akaebe ụgha, ndị gburu Stivin, wụsara uwe ha n’ụkwụ otu nwaokorobịa a na-akpọ Sọl. Ka ha na-atụgbu Stivin o kpere ekpere sị, “Onyenweanyị Jesu nara mkpụrụobi m!

O gburu ikpere n’ala, werekwa oke olu tie mkpu sị, “Onyenweanyị ekwekwala ka njọ nke a dị ha n’isi!” Mgbe o kwuchara nke a, ọ daa n’ala nwụọ. Sọl gbara mbọ nke ukwu ime ka nzukọ Kristi daa.

ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 31: 3-4, 6, 7, 8, 17, 21.

Azịza: N’aka gị Dinwenụ ka m tinyere mmụọ m.

1. Bụrụ nkume nke mgbaba m,

ide nke ga-azọpụta m!

N’ihi na ị bụ nkume m, na ide m;

n’ihi aha gị dube m, ma chekwaba m.

Azịza: N’aka gị Dinwenụ ka m tinyere mmụọ m.

2. N’aka gị ka m tinyere mmụọ m,

Ị gbapụtala m Osebụrụwa, Chineke nke eziokwu.

Atụkwasịrị m obi m na gị.

Aga m awụli elu, nwee añụrị n’ime ịhụnaanya gị.

Azịza: N’aka gị Dinwenụ ka m tinyere mmụọ m.

3. Ka ihu gị chakwasị nwodibo gị,

were ịhụnanya gị zọpụta m.

N’ihu gị ka Ị na-ezobe ha,

Ka atụmaatụ ndị ajọ omume ghara imetụ ha.

Azịza: N’aka gị Dinwenụ ka m tinyere mmụọ m.

MBEKU

ALLELUIA ALLELUIA:

Ọ bụrụ na ụnụ so Kristi bilie n’ọnwụ na-achọnụ ihe dị n’eluigwe ebe Kristi nọ n’aka nri nke Chukwu.

ALLELUIA.

OZIỌMA – 6:30-35.

Ihe Ọgụgụ ewetara n’Oziọma dị asọ nke Jọn dere.

Oke igwe mmadụ ahụ jụrụ Jesu sị, “Olee ọrụ ịrịbaama Ị ga-arụrụ anyị, ka anyị hụ, wee kwere na gị? Kedụ ọrụ ị ga-arụ? Nna anyị ha riri Mana n’ime ọzara dịka e dere ya sị, ‘O nyere ha nri nke si n’eluigwe ka ha rie.”

Jesu gwakwara ha sị, “Ana m agwa ụnụ eziokwu, ọ bụghị Mosis nyere ụnụ nri ahụ nke si n’eluigwe, kama ọ bụ Nna m na-enye ụnụ ezi nri ahụ nke si n’eluigwe. N’ihi na nri nke Chineke bụ nri nke ahụ si n’eluigwe bịa, na-enyekwa ụwa ndụ.”

Nke a mere ha ji sị ya, “Onyenweanyị, nye anyị ụdị nri a mgbe niile.” Jesu sịrị ha, “Abụ m achịcha nke ndụ; onye na- abịakwute m agụụ agaghị agụ ya, onye na-ekwerekwa na m akpịrị agaghị akpọ ya nkụ.

Igbo Mass Readings for May 7 2025, Wenezde Izuụka nke Atọ n’oge Mbilite n’Ọnwụ Kristi.

Igbo Mass Readings for May 6 2025, Tuzde Izuụka nke Atọ n’oge Mbilite n’Ọnwụ Kristi.