Igbo Mass Readings for September 2 2025, Tuezde n’ime Izuụka nke Iri Abụọ na Abụọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.

Nke a bụ Igbo Mass Readings for September 2 2025, Tuezde n’ime Izuụka nke Iri Abụọ na Abụọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 5:1-6, 9-11

Ihe Ọgụgụ e wetara n’akwụkwụ mbụ Pọl Degaara Ndi Tesalonịka

Ụmụnna m, ọ dịghị mkpa ị degara ụnụ akwụkwọ banyere oge mọbụ mgbe ihe ndị a ga-emezu. Ụnụ onwe ụnụ ma nke ọma na ụbọchị nke Dinwenụ anyị ga-abịa na mberede dịka onyeohi si abịa n’abalị.

Mgbe ndị mmadụ na-ekwu sị udo na nchekwa dị, mgbe ahụ na mberede ka mmebi ga-abịakwasa ha dịka ihe mgbu na-abịara nwaanyị mgbe ime na-eme ya.

Ha agaghịkwa agbanahụ ya n’ọsọ. Ụmụnna m ụnụ anọghịkwa n’ọchịchịrị nke na ụbọchị ahụ ga-abịakwasa ụnụ dịka onyeohi. Ụnụ niile bụ ụmụ nke ihe na ụmụ nke ehihie.

Anyị abụghị ụmụ nke abalị mọbụ nke ọchịchịrị. Ya bụ, ka anyị gharanụ ịrahụ ụra dịka ndịọzọ si eme. Kama ka anyị mụrụ anya, ka anya dookwa anyị.

Ndị na-arahụ ụra na-arahụ ya n’abalị; ndị na-añụfe mmanya oke bụkwa n’abalị ka ha ji añụfe ya oke. Ma ebe ọ bụ na anyị bụ ụmụ nke ihe, ka anyị nọrọnụ n’anya udo.

Ka anyị yikwasanụ okwukwe na ịhụnaanya dịka uwe mgbochi obi nke agha, na nchekwube nke nzọpụta dịka okpu agha.

Chineke emeghị anyị maka mmebi, kama ka anyị nweta nzọpụta site na Dinwenụ anyị Jesu Kristi, Onye nwụrụ n’ihi anyị, ka ọ ga-abụ ma anyị dị ndụ ma anyị nwụrụ anwụ, anyị ga-ebinyere ya. Ya bụ, na-agbakwanụ onwe ụnụ ume; na-akwalitekwanụ ibe ụnụ dịka ụnụ si eme ugbu a.

ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 27:1, 4, 13-14

Azịza: Ekwere m na m ga-ahụ ịdị mma nke Chineke n’ala ndị dị ndụ.

1. Dinwenụ bụ ihe na nzọpụta m

onye ka m ga-atụ egwu?

Dinwenụ bụ ide nke ndụ m

onye ga-eyi m egwu!

Azịza: Ekwere m na m ga-ahụ ịdị mma nke Chineke n’ala ndị dị ndụ.

2. Otu ihe ka m na-arịọ Dinwenụ,

Otu ihe ka m na-achọ

Ka m biri n’ụlọ nke Dinwenụ,

Ka m nweta ịdị ụtọ nke Dinwenụ

Ka m na-ahụ ya n’ụlọ nsọ ya.

Azịza: Ekwere m na m ga-ahụ ịdị mma nke Chineke n’ala ndị dị ndụ.

3. Ekwere m na m ga-ahụ ịdị mma nke Chineke,

n’ala ndị dị ndụ.

Chekwube na Dinwenụ. Obi sie gị ike

tụkwasị ya obi, chekwube na ya.

Azịza: Ekwere m na m ga-ahụ ịdị mma nke Chineke n’ala ndị dị ndụ.

MBEKU – 2 Tim 1:10

Alleluia, Alleluia:

Dinwenụ anyị Jesu Kristi mebiri ọnwụ, wetara anyị ndụ, bịa mee ka anwụ anwụ pụta ihe site n’oziọma ahụ.

Alleluia.

OZIỌMA – 4:31-37

Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Luk dere

Jesu gara Kapanaum, otu obodo dị na Galili, na-akụziri ha ihe n’ụbọchị izuike. Nkuzi ya tụrụ ha n’anya n’ihina o ji ikikere akụzi.

N’ime ụlọnzukọ ahụ, e nwere otu nwoke mmụọ ọjọọ ji, nke jiri oluike tie mkpu sị, “Haa, gịnị ka anyị na gị nwekọrọ Jesu onye Nazaret? Ị bịara ịla anyị n’iyi?

Ama m onye ị bụ, onye Nsọ ahụ nke Chineke.” Jesu gbọjara ya sị, “Kpuchie ọnụ gị, si n’ime ya pụta!” Mgbe Mmụọ ọjọọ ahụ tụdara ya n’ala n’etiti ọgbakọ ahụ, o siri n’ime ya pụta na emerụghị ya ahụ.

Ihe a tụrụ ọgbakọ ahụ niile n’anya nke mere na ha jụrịtara onwe ha sị, “Okwu gịnị bụ nke a?

N’ihina O ji ikike na-enye ndị Mmụọ ọjọọ iwu, ha wee hapụ onye ha ji.” Akụkọ banyere ya gazuru obodo niile gbara Kapanaum gburugburu.

Igbo Mass Readings for September 3 2025, Wednezde n’ime Izuụka nke Iri Abụọ na Abụọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.

Igbo Mass Readings for September 2 2025, Tuezde n’ime Izuụka nke Iri Abụọ na Abụọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.