Igbo Mass Readings for September 15 2026, Tuzde Izuụka nke Iri Abụọ na Anọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.

Nke a bụ Igbo Mass Readings for September 15 2026, Tuzde Izuụka nke Iri Abụọ na Anọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 12:12-14, 27-31

Ihe Ọgụgụ e wetara n’akwụkwọozi nke Mbụ Pọl degaara ndị Kọrịnt

N’ihina dịka ahụ anyị si dị otu, ma nweekwa ọtụtụ akụkụ dị icheiche, ma akụkụ ahụ niile, ọ bụ ezie na ha dị ọtụtụ, ha bụ otu. Otu a ka ọ dị n’ime Kristi.

Site n’otu Mmụọ Nsọ ahụ ka e mere anyị niile baptizim n’otu ahụ Kristi, ma ndị Juu ma ndị Grik, ma ndị ohu ma ndị nwe onwe ha. E meela ka anyị niile ñụọ ọbara ya n’ime njikọ nke otu Mmụọ Nsọ ahụ.

Otu ọ dị, ọ bụghị naanị otu ihe dị n’ahụ anyị, kama ihe dị n’ahụ anyị dị ọtụtụ. Ugbu a, ụnụ bụ ahụ Kristi, bụrụkwa n’otu n’otu ihe dị n’ahụ ya.

Chineke achọpụtala n’ime Nzukọ ya, ndị ọrụ dị icheiche: Nke mbụ, ndị ozi, nke abụọ ndịamụma, nke atọ ndị nkuzi.

Ndịọzọ so ha bụ ndị na-arụ ọrụ ebube, na ndị e nyere onyinye amara dị icheiche ịgwọ ndị ọrịa, na ndị nwere onyinye inyere ndịọzọ aka n’ụzọ dị icheiche, na ndị nwere onyinye ọchịchị, na ndị nwere ike ịsụ asụsụ dị icheiche.

Ha niile, ha bụ ndịozi? Ha niile, ha bụ ndịamụma? Ha niile, ha bụ ndị nkuzi? Ha niile, ha bụ ndị ọrụ ebube? Ha niile, ha nwere onyinye nke ịgwọ ọrịa?

Ha niile, ha na-asụ n’olu dị icheiche? Ha niile, ha nwere onyinye nke ịkọwa asụsụ dị icheiche? Ya mere, werenụ obi na-anụ ọkụ chọọ onyinye amara ndị dị elu karịa ndị a.

ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 100:1-3, 4, 5.

Azịza: Anyị bụ ndị nke ya anyị bụrụkwa igwe atụrụ ya.

1. Ụwa niile tijerenụ Onyenweanyị mkpu ọñụ,

Werenụ ọñụ fee Onyenweanyị ofufe

Werenụ iti mkpu ọñụ bịa n’ihu ya.

Azịza: Anyị bụ ndị nke ya anyị bụrụkwa igwe atụrụ ya.

2. Maranụ na Onyenweanyị bụ Chineke,

ya kere anyị, Ọ bụkwa ya nwe anyị,

anyị bụ ndị nke ya, anyị bụkwa igwe atụrụ ya.

Azịza: Anyị bụ ndị nke ya anyị bụrụkwa igwe atụrụ ya.

3. Werenụ ekele baa n’ọnụụzọ ama ya niile,

werenụ otito baa n’ogige ya niile;

kelenụ ya, gọziekwanụ aha ya.

Azịza: Anyị bụ ndị nke ya anyị bụrụkwa igwe atụrụ ya.

4. N’ihina Onyenweanyị dị mma,

Ịhụnaanya ya na-adị ebeebe,

ntụkwasịobi ya na-adịgide

bido na-ndụdụgandụ ruo na ndụdụgandụ.

Azịza: Anyị bụ ndị nke ya anyị bụrụkwa igwe atụrụ ya.

MBEKU – Jọn 6:64, 69

Alleluia, Alleluia:          

Dinwenụ, okwu gị bụ mmụọ bụrụkwa ndụ, Ọ bụ gịnwa ji okwu nke ndụ ebeebe.

Alleluia

OZIỌMA – 7:11-17

Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Luk dere

Ka nwa oge gachara, Jesu gara n’otu obodo a na-akpọ Nain; ndị na-eso ụzọ ya na igwe mmadụ sokwa ya. Ma ka ọ na-abịaru n’ọnụụzọ ama nke obodo ahụ, e nwere otu nwoke nwụrụlarịị nke a na-ebupụ, otu nwa nke nne ya mụrụ, nne ya ahụ bụ nwaanyị ajadu, oke igwe mmadụ si n’obodo ahụ sonyekwara nwaanyị ahụ.

Mgbe Onyenweanyị hụrụ ya, O meere ya ebere wee sị ya, “Ebela akwa.” Ya bịaruo nso metụ igbe ozu ahụ aka, ndị bu ozu ahụ wee guzo; Jesu wee sị, “Nwaokorobịa!

Ana m asị gị bilie!” Nwaokorobịa ahụ nwụrụ anwụ nọlitere, ma bidokwa ikwu okwu; Jesu kpọọrọ ya nye nne ya.

Ụjọ jidere ha niile; nke mere ha ji too Chineke na-asị, “Nnukwu onye amụma ebilitela n’etiti anyị. Ọzọ, Chineke abịala ileta ndị nke ya!” Akụkọ a gbasara Jesu gazuru n’ala Judia na obodo niile gbara ya gburugburu.

Igbo Mass Readings for September 16 2026, Wenezde Izuụka nke Iri Abụọ na Anọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.

Igbo Mass Readings for September 15 2026, Tuzde Izuụka nke Iri Abụọ na Anọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.