Igbo Mass Readings for September 9 2025, Tuezde n’ime Izuụka nke Iri Abụọ na Atọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.

Nke a bụ Igbo Mass Readings for September 9 2025, Tuezde n’ime Izuụka nke Iri Abụọ na Atọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 2:6-15

Ihe Ọgụgụ e wetara n’akwụkwọozi Pọl degaara Ndị Kolosi

Ebe ụnụ nabatara Jesu Kristi bụ Dinwenụ, na-adịnụ ndụ n’ime ya. Gbaanụ mgbọrọgwụ n’ime ya, rụkwasịnụ ndụ ụnụ n’elu ya.

Meenụ ka okwukwe ụnụ kwụdosie ike dịka a kụziri ụnụ, ka ndụ ụnụ jupụtakwa n’ekele. Hụnụ na o nweghị onye ọbụla ga-eji ịhụ amamihe nke mmadụ n’anya, na aghụghọ efu siere ụnụ ọnya.

Ụnụ ekwela ka onye ọbụla were omenaala nke mmadụ na nke ụmụmmụọ ndị na-achị elu na ala nyere, na-abụghị ozizi nke Kristi, duhie ụnụ ụzọ.

N’ihina n’ime ya ka izuoke niile nke Chineke bi n’ụdị mmadụ. Ụnụ enwetakwala ndụ zuru oke n’ime ya, onye bụ isi ọchịchị na ike niile.

N’ime ya kwa ka e biri ụnụ ugwu, Ọ bụghị obibi ugwu nke e jiri aka mee, kama site n’iwepụ ọchịchọ nke anụahụ n’ime obibi ugwu nke mmụọ n’ime Kristi.

E likọrọ ụnụ na ya site na baptizim nke e sikwa na ya kulikọta ụnụ na ya site n’okwukwe, n’ọrụ nke Chineke onye si na ndị nwụrụ anwụ kulite ya.

Ma ụnụ onwe ụnụ, ndị nwụrụ anwụ site na njọ na site n’ebighị ugwu nke anụahụ, ka Chineke mere ka ụnụ na Kristi dịkọta ndụ, ka ọ gbagharachaala njọ anyị niile.

Ọ kagburu ihe njikọ nke ya na ọchịchọ nke iwu nọchiiri anyị ụzọ. O wepụkwara ya ma kpọgide ya n’obe. Ọ napụrụ ike ọchịchị niile ngwa ọgụ, were ha mere ihe ngosi n’ihu ọha, merikwaa ha n’ime ya.

ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 145: 1-2, 8-9, 10-11

Azịza: Onyenweanyị na-egosi ihe niile o kere obiọma na ebere.

1. Aga m enye gị otito, Chineke bụ eze m

Aga m eto aha Gị ruo mgbe ebighịebi

Ụbọchị niile, aga m eto gị,

aga m eto aha gị ruo mgbe ebighịebi.

Azịza: Onyenweanyị na-egosi ihe niile o kere obiọma na ebere.

2. Onyenweanyị bụ onye amara na onye obi ebere,

Ọ naghị ewe iwe ọsọọsọ, O jupụtara n’ịhụnaanya

Onyenweanyị na-egosi mmadụ niile obiọma ya

Ebere nke Onyenweanyị na-erute ihe niile O kere.

Azịza: Onyenweanyị na-egosi ihe niile o kere obiọma na ebere.

3. Onyenweanyị ihe niile i kere ga-ekele gị,

ndị kwere na gị ga-agọzi gị.

Ha ga-ekwupụta ebube nke alaeze gị

Ma kwupụtakwa ịdị ike Gị.

Azịza: Onyenweanyị na-egosi ihe niile o kere obiọma na ebere.

MBEKU – Phil 2:15-16

Alleluia, Alleluia:

Chawapụta dịka ihe n’ụwa; Ụnụ na-ebutere ya okwu nke ndụ.

Alleluia

OZIỌMA – 6: 12-19

Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Luk dere

N’ụbọchị ndị a, Jesu rịgoro n’elu ugwu ikpe ekpere. N’abalị niile, Ọ nọgidere n’ikpere Chineke. Mgbe chi bọrọ, ọ kpọrọ ndị na-eso ụzọ ya, sikwa n’ime ha họpụta mmadụ iri na abụọ ndị Ọ kpọrọ ụmụazụ: Saịmọn, onye ọ kpọrọ Pita na Andru nwanne ya, na Jemis na Jọn, na Filip na Batolomiu, na Matiu na Tọmọs, na Jemis nwa Alfeus na Saịmọn onye a na-akpọ Zilọt, na Judas nwa Jemis na Judas Iskarịọt onye raara ya nye.

Jesu na ndị ụmụazụ rịdatara ga-guzoro n’ebe dị larịị ya na igwe ndị na-eso ụzọ ya, na oke igwe mmadụ ndị ọzọ ndị si n’obodo niile dị na Judia na Jerusalem, nakwa n’ụsọ oke osimiri dị n’ala Taya na Saịdọn, ndị bịara ka ha nụrụ ihe Ọ na-ekwu ma nwetakwa ọgwụgwọ ọrịa; ndị mmụọ ọjọọ na-enye nsogbu nwetakwara ọgwụgwọ. Igwe mmadụ ahụ niile chọrọ ụzọ ka ha metu ya aka, n’ihina ike si n’ahụ ya na-apụta na-agwọ ha niile.

Igbo Mass Readings for September 10 2025, Wednezde n’ime Izuụka nke Iri Abụọ na Atọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.

Igbo Mass Readings for September 9 2025, Tuezde n’ime Izuụka nke Iri Abụọ na Atọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.