Igbo Mass Readings for September 12 2028, Tuzde Izuụka nke Iri Abụọ na Atọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.

Nke a bụ Igbo Mass Readings for September 12 2028, Tuzde Izuụka nke Iri Abụọ na Atọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 6:1-11

Ihe Ọgụgụ e wetara n’akwụkwọozi nke Mbụ Pọl degaara ndị Kọrịnt

Ọ bụrụ na otu onye n’ime ụnụ na onye otu Kristi ọzọ nwere okwu, gịnị ka ọ ga-eme? O kwesịrị i buru okwu ha jee n’ụlọikpe ndị ọgọ mmụọ, ka ọbụ ibute ya n’ihu ndị nsọ?

Ụnụ amaghị na ndị nsọ ga-ekpe ụwa ikpe? Ya bụ, Ọ bụrụ na ụnụ ga-ekpe ụwa ikpe, gịnị mere ụnụ apụghị idozi ụmụ irighiri okwu na ụka n’ọgbakọ ụnụ?

Ọ bụ na ụnụ amaghị na anyị ga-ekpe ndị mmụọ ozi ikpe? Ọ bụzi okwu na ụka dịkarịsiri nta nke ndụ a ka ụnụ apụghị idozi?

Gịnị mere ụnụ ga-eji nwee okwu nta ndị dị otu a, buru ha tọgbọ n’oche ikpe ndị enweghị ọnọdụ na nzukọ Kristi? Ana m ekwu nke a ka ihere mee ụnụ!

Ọ pụtara na ọ dịghị otu onye maara ihe, nwere ike idozi okwu n’etiti ụmụnna n’ime Kristi? Kama nwanne na-agba nwanne ya akwụkwọ n’ụlọikpe, Ọ bụladị n’ihu ndị ekweghị ekwe, ka ha kpee ha ikpe!

Ịnụ na ụnụ na-agbarịta ibe ụnụ akwụkwọ ewuteka. Gịnị mere ụnụ adịghị edi ihe mmadụ mejọrọ ụnụ? Gịnị mere ụnụ adịghị edi nrụgbu?

Kama, otu ihe si dị, ụnụ na-emejọ na-arụgbu ọ bụladị ụmụnna ụnụ n’ime Kristi. Ụnụ amaghị na ndị ajọ omume agaghị eketa Alaeze Chineke?

Ụnụ ekwela ka e duhie ụnụ. Ndị na-eme omume ọjọọ, ndị na-efe arụsị, ndị na-akwa iko, ndị na-enwe mmekọ nwoke na nwaanyị n’ụzọ rụrụ arụ; mọbụ ndị ohi, mọbụ ndị anya ukwu, mọbụ ndị nkwutọ, mọbụ ndị na-apụnara mmadụ ihe, ha agaghị eketa Alaeze Chineke.

Ụfọdụ n’ime ụnụ dị otu ahụ na mbụ, ma a sachapụtala ụnụ na njọ. E doola ụnụ nsọ nye Chineke. A gụọla ụnụ na ndị eziomume site n’aha Dinwenụ Jesu Kristi, na site n’ike nke Mmụọ nke Chineke anyị.

ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 149:1-2, 3-4, 5-6,9

Azịza: Onyenweanyị nwere ịhụnaanya n’ebe ndị nke ya nọ.

1. Kweerenụ Onyenweanyị ukwe ọhụrụ

Ka ọgbakọ ndị kwere na ya kweere ya ukwe otito.

Ka Izrel ñụrịa ọñụ n’ihi onye kere ya,

Ka ụmụ Zayọn ñụrịa n’ihi onyeeze ha.

Azịza: Onyenweanyị nwere ịhụnaanya n’ebe ndị nke ya nọ.

2. Ka ha were ịgba egwu too aha ya,

Ka ha were ịgba na ụbọ akwara gbaara ya egwu.

N’ihina Onyenweanyị nwere ịhụnaanya n’ebe ndị nke ya nọ,

O kpubela ndị umeala okpu nke mmeri.

Azịza: Onyenweanyị nwere ịhụnaanya n’ebe ndị nke ya nọ.

3. Ka ndị nke ya ñụrịa na mmeri ha.

Ka ha daa n’ala n’ihu Chineke na-eto ya oge niile.

Ka nnukwu ukwe otito Chineke jupụta n’ọnụ ha,

nke a bụ otito nke ndị nke ya kwere ekwe. Alleluia!

Azịza: Onyenweanyị nwere ịhụnaanya n’ebe ndị nke ya nọ.

MBEKU – Phil 2:15-16

Alleluia, Alleluia:

Chawapụta dịka ihe n’ụwa; Ụnụ na-ebutere ya okwu nke ndụ.

Alleluia

OZIỌMA – 6: 12-19

Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Luk dere

N’ụbọchị ndị a, Jesu rịgoro n’elu ugwu ikpe ekpere. N’abalị niile, Ọ nọgidere n’ikpere Chineke. Mgbe chi bọrọ, ọ kpọrọ ndị na-eso ụzọ ya, sikwa n’ime ha họpụta mmadụ iri na abụọ ndị Ọ kpọrọ ụmụazụ: Saịmọn, onye ọ kpọrọ Pita na Andru nwanne ya, na Jemis na Jọn, na Filip na Batolomiu, na Matiu na Tọmọs, na Jemis nwa Alfeus na Saịmọn onye a na-akpọ Zilọt, na Judas nwa Jemis na Judas Iskarịọt onye raara ya nye.

Jesu na ndị ụmụazụ rịdatara ga-guzoro n’ebe dị larịị ya na igwe ndị na-eso ụzọ ya, na oke igwe mmadụ ndị ọzọ ndị si n’obodo niile dị na Judia na Jerusalem, nakwa n’ụsọ oke osimiri dị n’ala Taya na Saịdọn, ndị bịara ka ha nụrụ ihe Ọ na-ekwu ma nwetakwa ọgwụgwọ ọrịa; ndị mmụọ ọjọọ na-enye nsogbu nwetakwara ọgwụgwọ. Igwe mmadụ ahụ niile chọrọ ụzọ ka ha metu ya aka, n’ihina ike si n’ahụ ya na-apụta na-agwọ ha niile.

Igbo Mass Readings for September 13 2028, Wenezde Izuụka nke Iri Abụọ na Atọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.

Igbo Mass Readings for September 12 2028, Tuzde Izuụka nke Iri Abụọ na Atọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.