Igbo Mass Readings for September 30 2025, Tuezde Izuụka nke Iri Abụọ na Isii N’Oge Adanyeghị n’Emume.
Nke a bụ Igbo Mass Readings for September 30 2025, Tuezde Izuụka nke Iri Abụọ na Isii N’Oge Adanyeghị n’Emume.
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 8:20-23
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Onye Amụma Zecharịa
Yahweh nke igwe ndịagha kwuru sị: N’ọdịniihu, ndị mmadụ, ndị obodo ọzọ dị icheiche ga-abịa. Ndị obodo ọzọ ga-eje n’obodo ọzọ sị: “Anyị ga-agarịrị ịchọta Chineke nke igwe ndịagha, yọọ ya enyemaka; ana m aga n’onwe m?
Ee, ọtụtụ mmadụ na nnukwu mba dị icheiche ga-achọga Yahweh nke igwe ndịagha na Jerusalem, yọọ ya enyemaka.
Yahweh nke igwe ndịagha kwuru sị, “N’ụbọchị ndị ahụ ụmụnwoke iri si na mba ndị na-asụ asụsụ dị icheiche ga-ejide onye Juu n’aka uwe ya sị, Anyị chọrọ iso gị n’ihina anyị amatala na Chineke nọnyeere gị.”
ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 87:1-3, 4-5, 6-7
Azịza: Chineke nọyeere anyị
1. N’elu ugwu ya dị nsọ ka Chineke wukwasịrị obodo ya.
Onyenweanyị hụrụ ọnụụzọama Zayọn n’anya
Karịa obodo niile dị na Jekọb
A na-ekwu okwu otito banyere gị,
obodo nke Chineke.
Azịza: Chineke nọyeere anyị
2. Aga m agụnye ljipt na Babịlọn
na mba ndị kwere na m;
Taya, Filistia na Ethopịa
Ha niile ga-akpọ Zayọn nne n
‘ihina a mụrụ ha niile na ya.
Ọ bụ onye kacha elu mere ya ihe ọ bụ.
Azịza: Chineke nọyeere anyị
3. Ka Onyenweanyị na-edekọ aha
mba niile n’akwụkwọ
ị ga-agụnye ha ka ndị a mụrụ na Zayọn.
Ha na-agba egwu na-ekwe ukwe na-asị:
Na Zayọn ka ngọzi anyị niile siri bịa.
Azịza: Chineke nọyeere anyị
MBEKU – Ps 119:35, 29
Alleluia, Alleluia:
Dube m n’ụzọ iwu gị; ekwela ka m soro ụzọ na-akwụghị ọtọ.
Alleluia
OZIỌMA – 9:51-56
Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Luk dere
Mgbe ụbọchị na-eru mgbe Jesu ga-esi n’ụwa laa, O chee ihu ịga Jerusalem. O zipụrụ ndịozi ka ha buru ya ụzọ gaba. Ndị nke garanụ banye otu obodo nta nke Sameria ka ha doziere Jesu ihe tupu ọ bịaruo.
Ma ndị obodo ahụ jụrụ ịnabata ya n’ihina o chere ihu ịga Jerusalem. Mgbe ndị na-eso ụzọ ya, Jemis na Jọn, hụrụ ihe merenụ, ha sịrị, “Dinwenụ Ị chọrọ ka anyị sị ọkụ site n’eluigwe daa, repịachaa ha?” Jesu chigharịrị baara ha mba. Ha wee gaba obodo nta ọzọ.
Igbo Mass Readings for October 1 2025, Emume Marịa Dị Ngọzi Ezenwaanyị Naịjirịa
Igbo Mass Readings for September 30 2025, Tuezde Izuụka nke Iri Abụọ na Isii N’Oge Adanyeghị n’Emume.