Igbo Mass Readings for October 3 2028, Tuezde Izuụka nke Iri Abụọ na Isii N’Oge Adanyeghị n’Emume.
Nke a bụ Igbo Mass Readings for October 3 2028, Tuezde Izuụka nke Iri Abụọ na Isii N’Oge Adanyeghị n’Emume.
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 3:1-3,11-17,20-23
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ nke Job
Ka nke a mesịrị, Job mepere ọnụ ya wee bụọ ụbọchiị a mụrụ ya ọnụ. Job ekwuo sị: “Ka ụbọchị ahụ a mụrụ m laa n’iyi, ya na abalị ahụ nke kwupụtara sị, ‘Adị ime nwata nwoke.
Gịnị mere na m anwụghị oge a na-amụ m, na ekubighị m ume oge m si n’afọ nne m apụta? Gịnị mere ikpere ji nabata m? Olee ihe m ji nwee ara nke m ga-añụ?
N’ihina mgbe ahụ agaara m edina ala nọdụ nwayọọ; agaara m ịrahụ ụra nwee ezumike, Mụ na ndịeze na ndị ndụmọdụ nke ụwa, ndị na-arụgharịrị onwe ha ihe bibiri ebibi; mọbụ mụ na ọkpara ndịeze, ndị nwere ọlaedo, ndị ji ọlaọcha bujuo ụlọ ha.
Olee kwa ihe mere na e zoghị m ezo dịka nwa a mụkworo amụkwo, dịka ụmụntakịrị ahụghị ihe ma ọlị? N’ebe ahụ ndị ajọ mmadụ ga-akwụsị inye nsogbu, ndị ike gwụrụ ga-enwekwa ezumike.
Gịnị mere e ji nye onye nọ n’uru ihe ma nyekwa onye obi na elu ilu ndụ, ndị na-eche ọnwụ ma ọ naghị abịa ma na-egwu ala maka ya karịa akụ zoro ezo; ndị na-enwe nnukwu añụrị, ma nweekwa obi ụtọ mgbe ha chọtara ala ili?
Gịnị mere e ji enye onye ụzọ ya na-edoghị anya ihe bụ onye Chineke gbachibidoro ụzọ?”
ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 88:2-3,4-5,6,7-8
Azịza: Onyenweanyị mee ka ekpere m ruo gị ntị.
1. Onyenweanyị Chineke m ana m akpọku gị maka enyemaka ehihie niile.
Ana m ebeku gị n’abalị niile.
Ka ekpere m ruo gị ntị,
nụrụkwa mkpu akwa m!
Azịza: Onyenweanyị mee ka ekpere m ruo gị ntị.
2. N’ihina anọ m na nsogbu
anọzi m n’ọnụ ọnwụ
Agụnyela m na ndị na-anwụ anwụ,
abụ m onye enweghị ike ọbụla ma ncha.
Azịza: Onyenweanyị mee ka ekpere m ruo gị ntị.
3. Dịka onye a hapụrụ n’etiti ndị nwụrụ anwụ,
dịka onye e gburu egbu nke tọgbọrọ n’ili ya,
dịka ndị i chezọọrọla
ndị ị naghị echekwazi.
Azịza: Onyenweanyị mee ka ekpere m ruo gị ntị.
4. Ị tụbanyela m n’ime nnukwu olulu
ebe gbara ọchịchịrị ebe miri emi
Iwe gị dị ukwuu n’ebe m nọ
ọ na-achọ ikpuchi m dịka ebili mmiri nke nnukwu osimiri.
Azịza: Onyenweanyị mee ka ekpere m ruo gị ntị.
MBEKU – Ps 119:35, 29
Alleluia, Alleluia:
Dube m n’ụzọ iwu gị; ekwela ka m soro ụzọ na-akwụghị ọtọ.
Alleluia
OZIỌMA – 9:51-56
Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Luk dere
Mgbe ụbọchị na-eru mgbe Jesu ga-esi n’ụwa laa, O chee ihu ịga Jerusalem. O zipụrụ ndịozi ka ha buru ya ụzọ gaba. Ndị nke garanụ banye otu obodo nta nke Sameria ka ha doziere Jesu ihe tupu ọ bịaruo.
Ma ndị obodo ahụ jụrụ ịnabata ya n’ihina o chere ihu ịga Jerusalem. Mgbe ndị na-eso ụzọ ya, Jemis na Jọn, hụrụ ihe merenụ, ha sịrị, “Dinwenụ Ị chọrọ ka anyị sị ọkụ site n’eluigwe daa, repịachaa ha?” Jesu chigharịrị baara ha mba. Ha wee gaba obodo nta ọzọ.
Igbo Mass Readings for October 4 2028, Wenezde Izuụka nke Iri Abụọ na Isii N’Oge Adanyeghị n’Emume.
Igbo Mass Readings for October 3 2028, Tuezde Izuụka nke Iri Abụọ na Isii N’Oge Adanyeghị n’Emume.