Igbo Mass Readings for October 21 2025, Tuezde Izuụka nke Iri Abụọ na Itoolu N’Oge Adanyeghị n’Emume.

Nke a bụ Igbo Mass Readings for October 21 2025, Tuezde Izuụka nke Iri Abụọ na Itoolu N’Oge Adanyeghị n’Emume.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 5:12, 15, 17-19, 20-21

Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọozi Pọl degaara Ndị Rom

Mmehie batara n’ụwa site n’aka otu onye, ọ bụkwa site na mmehie a ka ọnwụ ji bata n’ụwa. Ọnwụ wee si otu a gazuo mmadụ niile, n’ihina mmadụ niile mehiere.

Mana amara Chineke adịghị ka mmehie Adam. Ọ bụrụ na ọtụtụ ndị mmadụ nwụrụ site na mmehie otu onye, imerime mmadụ ga-enweta amara na afọọma Chineke n’uju site na Jesu Kristi.

Ọ bụrụ na ọnwụ gosipụtara ike ya site na mmehie otu onye ahụ, ndị natara amara na afọọma nke Chineke ga-achị eze karịa, na ndụ, site na Jesu Kristi.

Dịka mmehie otu nwoke si wetara mmadụ niile ikpe ọmụma, eziomume otu nwoke wetakwaara mmadụ niile mgbaghara nke njọ na ndụ. Dịka a gụrụ ọtụtụ mmadụ na ndị mmehie site na nnupụ isi nke otu onye, otu aka ahụ, a ga-agụ ọtụtụ mmadụ na ndị eziomume site na nrubeisi nke otu onye.

Iwu bịara, bịa mee ka njọ bawanye; ma ebe njọ buru ibu ka amara Chineke na-aba ụba karịa. Dịka mmehie ji ọnwụ na-achị eze, otu aka ahụkwa ka amara Chineke ji eziomume na-achị eze, iji wetara anyị ndụ ebeebe site na Dinwenụ anyị Jesu Kristi.

ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps 40: 7-8, 8-9, 10, 17

Azịza: Anọ m ebe a, ana m abịa ime uche gị.

1. Ị naghị achọ ịchụ aja mọbụ ihe nrunye

kama ntị ghe oghe.

Ị naghị achọ aja nsureọkụ ma ọbụ aja maka njọ

Kama ekwuru m sị, Anọ m ebe a, Ana m abịa.

Azịza: Anọ m ebe a, ana m abịa ime uche gị.

2. N’ime akwụkwọ iwu e dere

na m tosịrị ime uche gị

Chineke m ahụrụ iwu gị n’anya,

Eji m obi m niile hụ ya n’anya.

Azịza: Anọ m ebe a, ana m abịa ime uche gị.

3. Ekwupụtala m eziomume nke Onyenweanyị

na nnukwu ọgbakọ.

Lee, emechighi m ọnụ m

Ị maara nke a O Onyenweanyị.

Azịza: Anọ m ebe a, ana m abịa ime uche gị.

4. Ka ha jupụta na-añụrị

bụ ndị niile na-achọ gị.

ka ha na-ekwu oge niile sị,

Onyenweanyị dị ukwuu!

Azịza: Anọ m ebe a, ana m abịa ime uche gị.

MBEKU – Jọn 6:64, 69.

Alleluịa, Alleluịa:

Onyenweanyị, okwu gị bụ mmụọ bụrụkwa ndụ. Ọ bụ gị ji okwu nke ndụ ebeebe.

Alleluịa.

OZIỌMA – 12:35-38

Ihe ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Luk dere

Jesu gwara ndị na-eso ụzọ ya sị, “Keenụ aji n’ume, ka ọkụ ụnụ na-enwukwa, dịkwanụ ka ndị na-eche nna ha ukwu mgbe ọ ga-esi n’oriri agbamakwụkwọ lọta, ka ha wee meghere ya ụzọ ngwangwa mgbe ọbụla ọ ga-alaghachi kụọ aka.

Ngọzi ga-adịrị ụmụodibo ahụ ndị nna ha ukwu ga-ahụ ka ha mụ anya mgbe ọ bịara; n’ezie agwa m ụnụ, ọ ga-eke akwa n’ukwu, mee ka ha nọdụ n’oche nri, bịa gbaara ha odibo.

Ọ bụrụ na ọ ga-abịa na nche nke abụọ mọbụ na nke atọ n’isi ụtụtụ hụ ha ka ha nọ na nche, ngọzi ga-adịrị ụmụodibo ahụ.”

Igbo Mass Readings for October 22 2025, Wednezde Izuụka nke Iri Abụọ na Itoolu N’Oge Adanyeghị n’Emume.

Igbo Mass Readings for October 21 2025, Tuezde Izuụka nke Iri Abụọ na Itoolu N’Oge Adanyeghị n’Emume.