Igbo Mass Readings for August 25 2026, Tuzde Izuụka nke Iri Abụọ na Otu N’Oge Adanyeghị n’Emume.

Nke a bụ Igbo Mass Readings for August 25 2026, Tuzde Izuụka nke Iri Abụọ na Otu N’Oge Adanyeghị n’Emume.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 2:1-3a, 14-17

Ihe Ọgụgụ e wetara n’akwụkwọozi nke Abụọ Pọl degaara Ndị Tesalonịka

Gbasara ọbịbịa nke Dinwenụ anyị Jesu Kristi na nzukọ anyị na ga-ezukọ, anyị na-arịọ ụnụ ụmụnna, ka ọ ghara ịlọ ụnụ obi mmiri mọbụ menye ụnụ ụjọ na mmụọ site n’okwu mọbụ n’akwụkwọozi nke dịka o si n’aka anyị bịa iji gosi na ụbọchị nke Dinwenụ anyị abịala.

Ụnụ ekwela ka onye ọbụla duhie ụnụ ụzọ maka ụbọchị ahụ agaghị abịa belụsọ ma nnupụisi ahụ o buru ụzọ bịa. A ga-ekpughekwa onye mmebi iwu ahụ bụ nwa nke mbibi.

Site n’oziọma anyị, Ọ kpọrọ ụnụ ka ụnụ wee nweta otito nke Dinwenụ anyị Jesu Kristi. Ya bụ ụmụnna m, kwụdosienụ ike ma jide nkuzi ọdịbendi anyị kuziiri ụnụ site n’okwu ọnụ mọbụ site n’akwụkwọozi anyị.

Ugbu a, ka Dinwenụ anyị Jesu Kristi n’onwe ya na Chineke Nna onye hụrụ anyị n’anya nyekwa anyị nkasịobi na olileanya.

ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 96:10, 11-12, 13

Azịza: Onyenweanyị na-abịa ikpe ụwa ikpe.

1. Kwusachaanụ n’ụwa niile na Onyenweanyị bụ eze,

Ọ kwụwasiri ụwa ike, e nweghị ike ibugharị ya.

Ọ ga-eji ikpe nkwụmọtọ kpee mba niile ikpe.

Azịza: Onyenweanyị na-abịa ikpe ụwa ikpe.

2. Eluigwe ñụrịba ụwa goribe,

Oke osimiri na ihe niile dị n’ime ya tienụ mkpu.

Ala-ubi niile na ihe niile dị n’ime ya ñụrịbanụ,

Ka osisi niile dị n’oke ọhịa kwebe ukwe añụrị.

Azịza: Onyenweanyị na-abịa ikpe ụwa ikpe.

3. N’ihu nke Onyenweanyị n’ihi ọ na-abịa

ọ na-abịa ikpe ụwa ikpe

ọ ga-eji ikpe nkwụmọtọ na eziokwu

were kpee ụwa na ndị mmadụ ikpe.

Azịza: Onyenweanyị na-abịa ikpe ụwa ikpe.

MBEKU – Heb 4:12

Alleluia, Alleluia:

Okwu Chineke dị ndụ, dị ike, Ọ bụkwa ihe nwere ike inyocha echiche na izu niile nke obi.

Alleluia

OZIỌMA – 23:23-26

Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Matiu dere

Jesu kwuru sị: “Azị gbakwa ụnụ ndị odeakwụkwọ na ndị Farisii ndị ihuabụọ. N’ihina ụnụ na-enye otu ụzọ n’ụzọ iri nke akwụkwọ nri na-esi isi ụtọ na mkpaakwụkwọ a na-akpọ dil na nke a na-akpọ kumim; ebe ụnụ leghaara iwu ndị ka mkpa anya dịka ikpe nkwụmọtọ, ebere na okwukwe.

Ihe ndị a ka ụnụ kara ibu ụzọ mee ma gharakwa ileghara iwu ndịọzọ anya. Ụnụ ndị ndu kpuru isi ndị na-azapụ ahụhụ nta na-efe efe n’ihe ọnụnụ ụnụ ma na-elo ịnyịnyaibu Kamel.

Azị gbakwa ụnụ ndị odeakwụkwọ na ndị Farisii ndị ihuabụọ! Ụnụ na-eme ka azụ iko na efere dị ọcha ebe ime ha jupụtara n’ihe e zutere n’ohi na ihe a zọtara n’aka ike.

Ngị onye Farisii kpuru isi! Buru ụzọ mee ka ime iko dị ọcha, mgbe ahụ azụ ya ga-adịkwa ọcha.”

Igbo Mass Readings for August 26 2026, Wenezde Izuụka nke Iri Abụọ na Otu N’Oge Adanyeghị n’Emume

Igbo Mass Readings for August 25 2026, Tuzde Izuụka nke Iri Abụọ na Otu N’Oge Adanyeghị n’Emume.