Igbo Mass Readings for August 18 2026, Tuzde Izuụka nke Iri Abụọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.
Nke a bụ Igbo Mass Readings for August 18 2026, Tuzde Izuụka nke Iri Abụọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 28:1-10
Ihe Ọgụgụ e wetara n’akwụkwọ Onye Amụma Ezekiel
Okwu nke Yahweh bịakwutere m sị, “Nwa nke mmadụ, gwa onye na achị obodo Taị, ‘Yahweh Chineke na-ekwu nke a: Maka ihi na ngala juru gị obi, i kwuru sị: Abụ m chi, anọ m ọdụ n’ocheeze nke chi ahụ dị n’etiti osimiri, na-agbanyeghị na ị bụ mmadụ ị bụghị chi, i chere na gị na Chineke ha; ị matala ihe ugbu a karịa Daniel o nweghị ihe zoro ezo n’ebe ị nọ.
Site n’amamihe gị na akọ gị ka i ji nwee nnukwu akụnụụba; i nwere ọtụtụ ọlaọcha na ọlaedo n’ime ụlọ akụ gị.
Site na nnukwu amamihe i nwere n’ịzụ ahịa, i meela ka akụnụụba gị bawanye, mmụọ gị na-akpazi nganga n’ihi ụba gị.’
Ya mere na Yahweh Chineke kwuru sị: ‘Maka ihi na i chere na ị maara ihe dịka Chineke, aga m ezitere gị ndị ọbịa, bụ obodo nke dịkarịsịrị n’egwu; ha ga-abagide gị, mebie mma nke amamihe gị, metọọ otito gị.
Ha ga-atụba gị n’ime olulu, ị ga-anwụ ọnwụ ike n’ime osimiri. Ị ka ga-ekwu sị, ‘Abụ m chi n’ihu ndị ga-egbu gị, n’agbanyeghị na ị bụ mmadụ nkịtị, ị bụghị chi, n’aka ndị ga-emerụ gị ahụ?
Ị ga-anwụ ọnwụ nke onye ebighị ugwu n’aka ndị ọbịa, maka na ekwuola m ya’ – ọ bụ Yahweh Chineke na-ekwu.”
ABỤỌMA NA AZỊZA – Deut 32:26-27, 27-28, 30, 35-36
Azịza: Ọ bụ m na-enye ndụ, na-eweta ọnwụ.
1. A sịrị m, ka m kpochapụ ha kpam kpam,
Mee ka ncheta ha kwụsị n’etiti mmadụ;
Ka ndịiro ha ghara ịghọtahie ihe merenụ,
Ka ha ghara ịnya isi.
Azịza: Ọ bụ m na-enye ndụ, na-eweta ọnwụ.
2. Ka ha ghara ịnya isi sị, ‘ike anyị ka anyị ji merie,
Na ọ bụghị Yahweh tigburu ndị ya,
ebe mụ onwe m mere ya.”
Izrel bụ mba na-enweghị akọnuuche,
Ha enweghị nghọta ma otu.
Azịza: Ọ bụ m na-enye ndụ, na-eweta ọnwụ.
3. Olee ka otu onye ga-esi merie puku ndị agha,
Otu mmadụ abụọ ga-esi chụọ puku mmadụ iri ọsọ,
Ma ọ bụghị na Nkume ha rere ha,
Na Chineke ha nyefere ha n’aka ndịiro?
Azịza: Ọ bụ m na-enye ndụ, na-eweta ọnwụ.
4. Oge na-abịa ngwangwa mgbe ha ga-ada
Ụbọchị nhuju anya ha dịkwa nso.
Ọ ga-emekwara ndị ohu ya ebere,
Mgbe Ọ hụrụ na ha enweghịkwa onye inyeaka.
Azịza: Ọ bụ m na-enye ndụ, na-eweta ọnwụ.
MBEKU – 1 Jọn 2:5
Alleluia, Alleluia:
Onye ọbụla nke na-edobe okwu Kristi, n’ezie, ịhụnanya maka Chineke zuru oke n’ime ya.
Alleluia.
OZIỌMA – 19:23-30
Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Matiu dere
Jesu wee gwa ndị na-eso ụzọ ya sị, “Ana m agwa ụnụ eziokwu, ọ ga-esiri ọgaranya ike ịba n’alaeze eluigwe.
Ọzọkwa agwa m ụnụ, ọ dịkarịrị ịnyịnya ibu Kamel mfe ịgafe n’anya alanga karịa ọgaranya ịba n’alaeze Chineke.” Mgbe ndị na-eso ụzọ ya nụrụ nke a, ọ tụrụ ha n’anya.
Ha wee na-ajụ sị, “Onyezi ka a ga-azọpụta?” Jesu lere ha anya sị ha, “Nebe mmadụ nọ, nke a ekweghị omume, mana o nweghị ihe nyịrị Chineke omume.”
Mgbe ahụ Pita jụrụ ya sị, “lee, anyị ahapụla ihe niile sobe gị, gịnịkwanụ ka anyị ga-eketa?” Jesu asị ha, “N’ịgwa ụnụ eziokwu, mgbe Nwa nke mmadụ ga-anọkwasị n’ocheeze nke ebube ya n’ụwa ọhụrụ, ụnụ ndị na-eso m ga-anọkwasakwa n’ocheeze iri na abụọ na-ekpe agbụrụ iri na abụọ nke Izrel ikpe.
Onye ọbụla nke hapụrụ ụlọ, ụmụnne nwoke, ụmụnne nwaanyị, nna na nne, ụmụ mọbụ ala, n’ihi aha m, ga-enweghachi ihe ndị a narị kwuru narị.
Ọ ga-eketakwa ndụ ebighịebi. Ọtụtụ ndị bu ụzọ ga-abụ ndị ikpeazụ, ndị ikpeazụ abụrụ ndị bu ụzọ.
Igbo Mass Readings for August 19 2026, Wenezde Izuụka nke Iri Abụọ N’Oge Adanyeghị n’Emume
Igbo Mass Readings for August 18 2026, Tuzde Izuụka nke Iri Abụọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.