Igbo Mass Readings for November 10 2026, Tuzde Izuụka nke Iri Atọ na Abụọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.
Nke a bụ Igbo Mass Readings for November 10 2026, Tuzde Izuụka nke Iri Atọ na Abụọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 2:1-8, 11-14
Ihe ọgụgụ e wetara n’akwụkwọ Pọl degaara Taịtus
N’akụkụ nke gị, na-akụzi akparamagwa kwesịrị eziokwu nke okwukwe. Gwa ndị okenye nwoke ka ha ghara ịdị na-emebiga ihe oke, ka ha sọpụrụ onwe ha, na-ebi ka ndị nwere akọnuuche, jide ezi okwukwe, nwee ịhụnaanya, kwụdosikwa ike.
N’otu aka ahụ, gwakwa ndị okenye nwaanyị ka ha na-ebi ndụ nsọpụrụ. Ka ha ghara ịdị na-agba asịrị mọbụ na-añụbiga mmanya oke, kama ka ha na-akụzi eziomume.
Ha ga-esi otu ahụ kuziere ụmụnwaanyị ndịọzọ ka ha ga-esi hụ di ha na ụmụ ha n’anya, bụrụ ndị nwere uche, ndị dị ọcha, ndị na-eje ozi n’ụlọ, ndị na-erubere di ha isi, ka ndị mmadụ ghara oleli okwu Chineke.
N’otu aka ahụ, gwa ụmụokorobịa ka ha jide onwe ha. N’ihe niile ị na-eme, mee onwe gị onye ndịọzọ ga na-eñomi n’ezi omume.
Na nkuzi gị niile, gosịkwa izuoke na ikwesị ntụkwasịobi. Ozi gị bụrụ nke kwụ ọtọ mmadụ na-apụghị ịgbagha, ka ihere wee mee onye na-agbagha gị okwu, ebe ọ bụ na o nweghị ihe ọjọọ ọ ga-ekwu gbasara anyị.
Chineke egosịpụtala amara ya iji wetara mmadụ niile nzọpụta. Amara ahụ na-akụziri anyị ka anyị jụ omume niile megidere ife Chineke, na ọchịchọ ọjọọ niile nke ụwa.
Ka anyị na-ejide onwe anyị aka, na-ebi ndụ eziomume na ndụ ịtụ Chineke egwu n’ụwa a. Otu a ka anyị ga-esi na-eche olileanya anyị dị ngọzi, bụ ọbịbịa nke otito nke Chineke anyị dị ukwu na onye Nzọpụta anyị bụ Jesu Krisiti.
O nyere onwe ya n’ihi anyị, iji zọpụta anyị na njọ niile, ka o wee wụchapụtara onwe ya ndị dị ọcha, ndị ọ na-anụ ọkụ n’obi ime eziomume.
ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 37:3-4, 18, 23, 27, 29.
Azịza: Nzọpụta nke ndị eziomume na-esi n’aka Onyenweanyị abịa.
1.Tụkwasịobi gị n’Onyenweanyị, na-emekwa ihe ọma
Ka Ị wee biri n’ala ebe obibi gị ma nwee udo
Nwebe añụrị n’ime Onyenweanyị
ka O wee nye gị ihe obi gị na-achọ.
Azịza: Nzọpụta nke ndị eziomume na-esi n’aka Onyenweanyị abịa.
2. Onyenweanyị na-echekwa ndụ ndị eziomume
ihe nketa ha ga-adịgide ebeebe;
Onyenweanyị na-eduzị onye eziomume ụzọ,
Meekwa ka ọ kwụsie ike na-enwe ọganiihu.
Azịza: Nzọpụta nke ndị eziomume na-esi n’aka Onyenweanyị abịa.
3. Zere njọ ma mebe mma
Ka i wee nweta ụlọ dị ebeebe.
Ma ndị eziomume ga-ebi n’ala a
Ha ga-ebi na ya ebeebe.
Azịza: Nzọpụta nke ndị eziomume na-esi n’aka Onyenweanyị abịa.
MBEKU – Jọn 17:17
Alleluịa, Alleluịa:
Were eziokwu gị doo anyị nsọ n’ihina okwu gị bụ eziokwu.
Alleluịa.
OZIỌMA – 17:7-10
Ihe ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Luk dere.
Jesu gwara ndị na-eso ụzọ ya sị, “O nwere onye n’ime ụnụ nke nwere nwodibo na-arụrụ ya ọrụ n’ubi, mọbụ na-azụrụ ya atụrụ, ga-agwa nwodibo ya mgbe o siri n’ugbo bata sị, ‘Bịa rie nri ozigbo?’
Ọ bụ na ọ gaghị agwa ya sị, ‘Kwadoro m nri anyasị, jikekwara onwe gị nke ọma ịgbara m odibo ruo mgbe m ga-ericha, ñụchaa.
E mechaa, ị ga-eri ma ñụkwaa nke gị.’ Ọ ga-ekele nwodibo ahụ n’ihina o mere ihe a gwara ya? Otu a ka ọ dị ebe ụnụ nọ.
Mgbe ọbụla ụnụ mechara ihe a gwara ụnụ, ụnụ ga-ekwu sị, ‘Anyị bụ ụmụodibo etosịghị etosị, ọ bụ ọrụ dịịrị anyị ka anyị rụrụ.”
Igbo Mass Readings for November 11 2026, Wenezde Izuụka nke Iri Atọ na Abụọ N’Oge Adanyeghị n’Emume
Igbo Mass Readings for November 10 2026, Tuzde Izuụka nke Iri Atọ na Abụọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.