Igbo Mass Readings for November 18 2025, Tuezde Izuụka nke Iri Atọ na Atọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.
Nke a bụ Igbo Mass Readings for November 18 2025, Tuezde Izuụka nke Iri Atọ na Atọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 6:18-31
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Makabii nke Abụọ
Elieza otu okenye nwere nnukwu ugwu bụrụkwa onye nkuzi iwu, ka a gbabara ọnụ ka o rie anụ ezi. Mana ọ chọrọ iji ugwu were nwụọ kama ịdị ndụ ihere.
Maka ihi nke a, ọ gbụpụsịrị anụ ezi ahụ n’ọnụ ya, ma were aka ya jebe ebe a na-ata mmadụ ahụhụ; dịka ndị nwere obi siri ike ịhapụ iri ihe ọbụla iwu na-akwadoghị, ọ bụladị na ha ga-anwụ.
Ndị na-elekọta ịchụaja ahụ rụrụ arụ anya kpọọrọ Elieza jebe n’otu akụkụ, maka na o teela aka o jiri bụrụ enyi ha, wee nọrọ na nzuzo tụnyere ya alo, ka o weta anụ nke aka ya, nke o kwesịrị na ọ ga-eri, wee bịa; ka ọ ga-abụ ọ na-eri ya, o mee ka a ga-asị na ọ na-eri anụ ahụ rụrụ arụ, e jiri chụọ aja, nke eze mara n’iwu na a ga-eri, ka o wee site n’ime otu a zọpụta onwe ya n’ọnwụ.
Ha gwara ya nke a iji gosi ya afọọma maka enyi ha bụ kamgbe gboo. Mana Elieza kpebiri n’onwe ya ihe kwesịrị na okenye dị ka ya ga-eme. Na ndụ ya niile, bido na nwata, o biri nke ọma n’idobe iwu dị nsọ nke Chineke.
Ọ bụ ya mere o jiri kwuo ọsọọsọ ihe bụ uche ya, na-agwa ha ka ha gbuo ya. O kwuru sị, “Ụdị aghụghọ a ekwesịghị ekwesị n’ebe okenye dịka m nọ, ka ọtụtụ ụmụokorobịa ghara iche na m ajụla okwukwe m ugbu a m rurula afọ iri itoolu.
Ọ bụrụ na m ejiri ụgha gosi na m na-eri anụ a, naanị ka m were nwee ike ibikwu ndụ ntakịrị oge, ọ ga-ewetara m ihere na enweghị ugwu, ma mekwaa ka imirikiti ụmụokorobịa jehie ụzọ.
Asị na m nwere ike ịgbanahụ ntaramahụhụ nke ndị mmadụ, ma m dị ndụ ma m nwụrụ anwụ, enweghị m ike ịgbanahụ ntaramahụhụ nke Chineke pụrụ ime ihe niile.
Ọ bụrụ na m ewere ugwu nwụọ ka dike ugbu a, ọ ga-egosi na ogologo ndụ m biri kwesịrị m. Ọ ga-abụkwa ịtọ ezigbo ụkpụrụ n’ebe ndị na-etolite etolite nọ, ka ha wee nwee ike iji añụrị na afọ ojuju nwụọ ọnwụ maka iwu anyị dị asọ kwesịrị nsọpụrụ.
Ka o kwuchaara ihe ndị a, o kulie gaba ebe a ga-ata ya ahụhụ. Ndị ahụ weere ya ka enyi na ntakịrị oge gara aga, weziiri ya ugbu a ka onyeiro maka na ha na-eche na ọ zaghachiri ha ka onye ara.
Ma mgbe ha tiruru ya ihe n’agbata ọnwụ na ndụ, ọ sụrụ ude, bee sị: “O doro Onyenweanyị anya n’amamihe ya dị nsọ na n’agbanyeghị na e nwere ike ịzọpụta m n’ọnwụ, ana m edi ihe niile a na-akụ m nke na-ebutere m oke mgbu, ma n’ime obi m enwere m añụrị ịta ya bụ ahụhụ n’ihina ana m atụrụ ya egwu.” Elieza were si otu a nwụọ.
Ọ nwụrụ ọnwụ ka dike, nke mere ọnwụ ya jiri bụrụ nnukwu ihe nñomi na mgbamume, ọ bụghị naanị ebe ndị na etolite etolite nọ, kama ọ bụkwa n’ebe ọtụtụ ndị obodo Izrel nọ.
ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 3: 2-3, 4-5, 6-8
Azịza: Onyenweanyị bụ nkwụdosiike m.
1. Onyenweanyị ọnụọgụgụ ndị na-emegide m na-abawanye;
Ọtụtụ mmadụ na-ebuso m agha
Ọtụtụ na-ekwu maka m sị,
ọ dịghị enyemaka o si n’aka Chineke enweta.
Azịza: Onyenweanyị bụ nkwụdosiike m.
2. Mana Onyenweanyị, gịnwa bụ onye nche m
Otito m, Ị na-enyere m aka ịkwụdosịike
Eji m olu ike kpọkuo Onyenweanyị
O wee si n’ugwu nke ya dị nsọ za m.
Azịza: Onyenweanyị bụ nkwụdosiike m.
3. Ugbu a enwere m ike idina ala rahụ ụra ma tetakwa
Maka na Onyenweanyị na-echekwaba m.
Ugbu a enweghị m egwu ọbụla
N’ebe iri nnụ kwuru nnụ ndịiro m gbara m gburugburu.
Azịza: Onyenweanyị bụ nkwụdosiike m.
MBEKU – 2 Thessa. 2:14.
Alleluịa, Alleluịa:
Site n’oziọma, Chineke kpọrọ anyị ka anyị wee nweta otito nke Dinwenụ anyị Jesu Kristi.
Alleluịa.
OZIỌMA – 19:1-10.
Ihe ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Luk dere.
Jesu banyere na Jeriko, na-achọ isi na ya gaa ebe ọzọ. Ma o nwere otu nwoke a na-akpọ Zacchaeus; nwoke a bụkwa onyeisi ọnaụtụ na nnukwu ọgaranya.
Ọ chọrọ ịhụ ma mata onye Jesu bụ. Mana o nweghị ike ime nke a n’ihi igwe mmadụ, maka na ọ dị mkpụmkpụ.
Nke a mere o jig baa ọsọ gaa n’ihu, rịgoro otu osisi a na-akpọ Sikamọ, ka o wee nwee ike ịhụ Jesu, maka na ọ ga-esi n’ụzọ ahụ gafee.
Mgbe Jesu bịaruru n’ebe ahụ, o leliri anya elu, hụ Zacchaeus sị ya, “Zacchaeus! Mee ngwa rịdata, n’ihi na aga m anọ n’ụlọ gị taa!”
O mekwara ngwangwa rịdata, were ọñụ nabata Jesu. Mgbe ndị mmadụ hụrụ nke a, ha niile tamuru ntamu sị: “Ọ banyela ịbụ onye ọbịa n’ụlọ onye omenjọ.
Zacchaeus guzooro, gwa Onyenweanyị sị: “Lee Onyenwe m, Aga m enye ndị ogbenye ọkara ihe niile n nwere.
Ọ bụrụkwa na o nweela onye m naara ihe ya n’ụzọ aghụghọ, aga m akwụghachị ya ugboro anọ.”
Jesu gwara ya sị, ‘Nzọpụta abịaruola n’ụlọ a taa, n’ihina ọ bụkwazi nwa nke Abraham. N’ihina Nwa nke Mmadụ ahụ bịara ịchọpụta ma zọpụtakwa ndị furu efu.”
Igbo Mass Readings for November 19 2025, Wednezde Izuụka nke Iri Atọ na Atọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.
Igbo Mass Readings for November 18 2025, Tuezde Izuụka nke Iri Atọ na Atọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.