Igbo Mass Readings for July 8 2025, Tuezde n’ime Izuụka nke Iri na Anọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.

Nke a bụ Igbo Mass Readings for July 8 2025, Tuezde n’ime Izuụka nke Iri na Anọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 32:23-33

Ihe Ọgụgụ e wetara n’akwụkwọ Jenesis

Ka ọ kpọfechara ha ofe mmiri ahụ, o zifekwara akụnụụba ya niile n’otu aka ahụ. Naanị Jekọb ewee nọdụ. Mgbe ahụ o nwere onye ya na ya gbara mgba wee ruo na chi ọbụbọ.

Ka onye ahụ hụrụ na ya enweghị ike ịtụ ya n’ala, o tiri ya ihe n’ọkpụkpụ ukwu ya, ukwu Jekọb wee chikwapụ ka ya na ya nọ na-agba mgba ahụ, Ọ gwara Jekọb sị, “Hapụ m aka ka m laa, n’ihina chi abọwala”.

Jekọb zara ya sị, “Agaghị m ahapụ gị ka ị laa belụsọ ma ị gọziri m.” Onye ahụ wee jụọ ya sị, “Olee aha gị?” Ọ zara ya, “Aha m bụ Jekọb”. Ọ gwara ya sị: “A gaghị akpọkwa gị Jekọb ọzọ kama Izrel, ebe i gosirila ike gị n’ebe Chineke nọ, ị ga-enwe mmeri n’ebe mmadụ nọ”.

Jekọb ewee rịọ ya sị, “Biko gwanụ m aha gị”. Ma ọ zara sị, “Gịnị ka i ji ajụ aha m? O wee gọzie Jekoọb n’ebe ahụ. Jekọb kpọrọ ebe ahụ Peniel n’ihina o kwuru sị, “Ahụla m Chineke ihu na ihu ma dịkwa ndụ”.

Anwụ awaala mgbe ọ na-ahapụ Peniel, bịa na-atụ ụkwụ n’ihi ukwu ya. Ya mere ndị Izrel anaghị eri akwara anụ jikọtara ukwu anụ na ọkpụ ya ruo taa, n’ihina ihe ahụ e tiri Jekọb metụtara akwara ukwu ya.

ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 17:1, 2-3, 6-7, 15

Azịza: Ma mụ onwe m, ụgwọ ọrụ eziomume m ga-abụ ịhụ ihu gị

1. Onyenweanyị, nụrụ arịrịo m na-arịọ maka ikpe ziri ezi;

gee ntị n’arịrịọ m,

chee ntị nụrụ ekpere m

n’ihina o nweghị asị ọbụla dị n’ọnụ m.

Azịza: Ma mụ onwe m, ụgwọ ọrụ eziomume m ga-abụ ịhụ ihu gị

2. Ọ bụ gị ga-egosịpụta eziokwu m;

gị onye na-ahụ ihe ziri ezi!

Ị na-enyocha mkpụrụobi m n’anyasị,

Ị na-anwale m mana o nweghị ihe ọjọọ ọbụla ị hụrụ,

atamughị m ntamu.

Azịza: Ma mụ onwe m, ụgwọ ọrụ eziomume m ga-abụ ịhụ ihu gị

3. Ana m akpọkụ gị, Chineke, ma ị na-azakwa m,

Chee ntị nụrụ ihe m na-ekwu.

Gosipụta nnukwu ọrụ ịhụnanya gị,

gị onye nzọpụta ndị gbapụrụ n’ala ha.

Azịza: Ma mụ onwe m, ụgwọ ọrụ eziomume m ga-abụ ịhụ ihu gị

MBEKU – 2 Thes 2:14

Alleluia, Alleluịa:

Site n’oziọma anyị, Ọ kpọrọ ụnụ ka ụnụ wee nweta otito nke Dinwenụ anyị Jesu Kristi.

Alleluịa.

OZIỌMA – 9:32-38

Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Matiu dere

Ụfọdụ mmadụ kpọtaara Jesu otu onye dara ogbi, nke ajọ mmụọ ji. Mgbe ọ chụpụrụ ajọ mmụọ ahụ, onye ogbi ahụ malitere kwube okwu. Nke a tụrụ igwe mmadụ ahụ n’anya, ha wee na-asị: “Anyị ahụbeghị ihe dị otu a n’ala Izrel mbụ”.

Ndị Farisii nọ ebe ahụ kwuru sị, “Ọ na-esi n’ike onyeisi ndị ajọ mmụọ achụpụ ajọ mmụọ”. Jesu na-agagharị n’obodo na n’ogbe ha niile, na-akụzi nkuzi n’ụlọ nzukọ ha, na-ekwusa oziọma nke alaeze Chineke, na-agwọkwa ọrịa na nrịanrịa ha niile.

Mgbe ọ hụrụ ọtụtụ igwe mmadụ ahụ, ebere ha mere ya, n’ihina ha nọ na nsogbu. Ha enweghịkwa onye enyemaka, ha dịka atụrụ na-enweghị onye nche.

Jesu wee gwa ndị na-eso ụzọ ya sị: “Owuwe ihe ubi bara ụba, mana ndị ọrụ dị olemaole, Ya bụ, rịọnụ Dinwenụ nke owuwe ihe ubi ka o ziga ndị ọrụ n’ugbo ya.

Igbo Mass Readings for July 9 2025, Wednezde n’ime Izuụka nke Iri na Anọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.

Igbo Mass Readings for July 8 2025, Tuezde n’ime Izuụka nke Iri na Anọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.